Kemi Adetiba

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Kemi Adetiba bụ music video director na Naijiria, dairektọ na-ahụ maka fim, nakwa onyonyo nke aka ọrụ ya na-apụta ihe na Channel O, MTV Base, Soundcity TV, BET na Netflix. [1] [2]

Kemi Adetiba


Mbido ndụ ya.[dezie | dezie ebe o si]

Amuru ya na Lagos ka ọnwa Jenụwarị dị na mkpụrụ ụbọchị asatọ n'afọ 1980, [3] Nne ya bụ Mayen Adetiba bụ onye injinịa na onye na-emepụta ihe nkiri di iche iche. Kemi Adetiba bidoro njem ya n'ime mgbasa ozi dị ka nwatakịrị ebe ọ mere ihe mgbaza ozi azụmahịa nke ndị OMO bụ ncha eji asa akwa na ihe ndị ọzọ. Nke a bụ igbaso nzọ ụkwụ nna ya bụ Dele Adetiba. [4]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Kemi bidoro ọrụ eji mara ya dịka onye na-akọwapụta ihe n'igwea redio nke Rhythm 93.7 FM , ebe ọ bụ olu na-ekwupụta okwu n'ihe akụkọ wuru ewu a kpọrọ ''Soul'd Out'' na ''Sunday at Seaside'' . Adetiba bidoro itinye aha ya na nchikọta egwu na ntanetị n'ihe di iche iche dika ''Spotify'' na ''Soundcloud'' site n'aha ọ kpọrọ onwe ya bụ 'hule'.

Kemi Adetiba malitere ịgbanwe ọrụ ya site na ịbụ olu na-ekwu okwu na redio wee bụrụ ihu ana ahụ anya n'onyonyo televishọn site na- ikwado ma gosipụta ọtụtụ ihe nkiri na Mnet, nke gụnyere Studio 53, Ọnwụnwa Naịjirịa nke ya na Ikponmwosa Osakioduwa gosipụtara. Kemi bụkwa onye na-eweta ihe nkiri na Soundcity TV ma kwado Maltina Dance All ugboro atọ n'usoro. [5]

Ka ọtụtụ afọ ịnọ nke ọma n’ihu igwe foto gachara, Adetiba debara aha ya na New York Film Academy iji mụọ nke ọma etu esi anọ n'ihu igwe foto , taa ọrụ aka ya dika dairektọ juru mpaghara Afirica nakwa ngafe Africa. Mkpirikpi ihe nkiri nke Kemi Adetiba mepụtara akpọrọ Bloodied Ocean gosiri n'afọ 2009 na Pan African Film Festival na National Black Arts Festival. [6][7]

N'ọnwa Septemba n'ụbọchi asatọ n'afọ 2016, ihe nkiri mbụ Kemi Adetiba gosipụtara '' The Wedding Party '(a Nigerian Rom-com film) gosipụtara n'abalị na Toronto International Film Festival (TIFF),na mmeghe fim nke a kpọrọ City-to-City Spotlight.

N'afọ 2017 ọ nọ na-egosi ihe nkiri ahụ a kpọrọ "King Women" ebe ọ gbara nne ya Mayen Adetiba ajụjụ ọnụ . Ndị ọzọ so na "King Women" gụnyere Chigul, Taiwo Ajai-Lycett, TY Bello na Tara Durotoye [8]

Nturu Ugo na nhọpụta[dezie | dezie ebe o si]

Ụfọdụ ọrụ aka ya nwetara ihe onyinye di iche iche, dika vidio egwu 'Ekundayo' nke ụmụ nwaanyị kacha mma bụ nke TY Bello gụrụ na Soundcity TV Music Video Awards', Vidio nke ụmụ nwaanyị kacha mma na egwu 'Today na Today' bụ nke Omawumi gụrụ n'afọ 2010 Nigeria Entertainment Awards. Ọrụ kachasị ọhụrụ nke Adetiba bụ rụrụ bụ n'egwu 'onye' nke Waje tiri ebe ọgosiri Tiwa Savage, Olamide's "Anifowose", "Sitting on the Throne" nakwa egwu Bez's R&B a kpọrọ "Say".

A họpụtara Kemi maka Onye Nchịkwa Egwu kacha mma na The Headies n' afọ 2014. Ọ nwetakwara ihe onyinye nke ndi City People Entertainment direktọ egwu kacha mma n'afọ 2015 nakwa ihe nrite HNWOTYmaka nwaanyị kacha nepụta ihe nkiri na fim nakwa onyonyo n' afọ 2017. [9]

Ihe nkiri[dezie | dezie ebe o si]

  • Ihe nkiri a kpọrọ 'The wedding party ' n'afọ 2016 na 'King of Boys'n'afọ 2018.

Vidio egwu ndi ahọpụtara so n'aka ọrụ ya.[dezie | dezie ebe o si]

Lekwa ọzọ[dezie | dezie ebe o si]

  • Ndepụta aha nke ndị cinematographers nke Nigeria

Nsinweta[dezie | dezie ebe o si]