Kevin Nwankwor
| Ụdịekere | nwoke |
|---|---|
| Mba o sị | Naijiria |
| Aha enyere | Kevin |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 15 Ọgọọst 1976 |
| Ebe ọmụmụ | Issele-Uku |
| Ọrụ ọ na-arụ | onye nhazi ndu ihe nkiri, onye nhazi ederede |
| Ebe agụmakwụkwọ | Federal University of Technology Owerri, New York Film Academy |
| Ebe obibi | Atlanta |
Kevin Nkem Nwankwor (amụrụ n'abalị iri na ise nke ọnwa Ọgọst afọ 1976) bụ onye ome ihe nkiri, onye nduzi ihe nkiri na onye na-emepụta ihe nkiri a mụrụ na Naịjirịa . Kevin nwetara mpụta ihe mgbe o dere ma mepụta ihe nkiri Enemy Within na A Mother's Love nke so n'ihe nkirir ndị a họpụtara na Gwinnett Center Film Festival na Marbella International Film Festival . [1]
Ndụ na ọrụ mbụ
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ Kevin Nwankwor na Issele Ukwu, otu obodo dị n'ala Igbo dị na mpaghara ọchịchị ime obodo Aniocha North nke Delta State ebe ọ gara n'ihu gụchaa akwụkwọ praịmarị na sekọndrị ya. N'afọ 2000, o nwetara akara ugo mmụta Bachelor of Science na Project Management na Mahadum Federal nke Teknụzụ, Owerri . Mgbe ọ nọ na mahadum ahụ, o gosipụtara agwa n' ihe nkiri Nollywood dịka Enemies and Heartless, nke ndị mere ihe nkiri dịka Kanayo O. Kanayo, Saint Obi na Eucharia Anunobi sonyere. O hiwere otu ihe nkiri ejije nke Ndị Kraịst bụ "The Heavenly Theater" ma dee obere ihe nkiri dịka In The Den of Agbalakwem I & II na Ashes of Regreg . [2]
Kevin kwagara Atlanta n'afọ 2008 ebe o nwetara akara ugo mmụta MBA na Marketing wee nweta akara ugo mmụta Master of Fine Arts na ime ihe nkiri site na New York Film Academy . Mgbe o dechara ma mepụta Enemy Within na A Mother's Love, ọ gara n'ihu mee ihe ngosi mbụ ya na fim Tempting Fate nke ritere ihe nrite. [3]
Ọ bụ onyeisi ụlọ ọrụ KevStel Group LLC, ụlọ ọrụ ntụrụndụ nke okpukperechi nke o hiwere gbakewasara ụkwụ na ebumnuche "inye ọdịnaya dị mma dabeere na okwukwe, olileanya na ịhụnanya site na ihe onyonyo na mbipụta". [2]
Ihe nkiri ndị o sonyere
[dezie | dezie ebe o si]- In The Den of Agbalakwem I (1996) (onye edemede)
- In The Den of Agbalakwem II (1996) (onye edemede)
- Enemies(1997) (onye na-eme ihe nkiri)
- Heartless(1997) (onye na-eme ihe nkiri)
- Ashes of Regret (1998) (onye edemede)
- Enemy Within (2012) (onye edemede, onye na-emepụta ihe)
- A Mother's Love(2012) (onye edemede, onye na-emepụta ihe)
- Tempting Fate (2015) - (onye edemede, onye mmepụta ihe, onye nduzi) [4] [5] [6]
- Muna (2019) (onye nduzi na onye mmepụta)
Ndụ nkeonwe
[dezie | dezie ebe o si]Kevin Nwankwor lụrụ nwa aha bụ Unoma Nwankwor, onye edemede Kraịst a ma ama maka ihe odide ya dị iche iche dịka Unexpected Blessing, When You Let Go na The Christmas Ultimatum . Ha na ụmụ ha abụọ bi na Atlanta. [3]
Edensibịa
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ "INTERNATIONAL FILM COMPANY SEEKS DISTRIBUTION FOR NEW INDIE FILM". Washington NewsWorld. 4 April 2014. Archived from the original on 22 July 2015. Retrieved 16 July 2015.
- 1 2 "Meet Kevstel". Kevstel Group. Retrieved 16 July 2015.
{{cite web}}: CS1 maint: deprecated archival service (link) - 1 2 "Award Winning "Tempting Fate" Film Director Kevin Nkem Nwankwor (KNN) makes his Director's". NewsWire. 27 January 2015. Retrieved 16 July 2015.
- ↑ staff (July 3, 2015). "Tempting Fate Hits the Cinema". This Day. Archived from the original on July 16, 2015. Retrieved July 29, 2015.
- ↑ Arrogundade, Funsho (July 15, 2015). "Ramsey Nouah dazzles in Hollywood/Nollywood flick, 'Tempting Fate'". P.M. News. Retrieved July 29, 2015.
- ↑ Ehi James, Osaremen (February 9, 2015). "RAMSEY NOUAH, KEVIN NWANKWOR 'TEMPTING FATE' IN NEW FLICK". Nigeria Films. Archived from the original on July 6, 2015. Retrieved July 29, 2015.