Kofoworola Ademola

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Kofoworola Ademola
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria, Obodoézè Nà Ofú Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya21 Mee 1913 Dezie
Ebe ọmụmụLagos Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya15 Mee 2002 Dezie
Dị/nwunyeAdetokunbo Ademola Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụchildren's writer, head teacher, Odee akwụkwọ Dezie
ebe agụmakwụkwọSt Hugh's College, Vassar College Dezie
agbụrụNdi Yoruba Dezie
Ihe nriteOnye otu Order nke Alaeze Ukwu Britain Dezie

Oloori Kofoworola "Kofo" Aina Ademola, Lady Ademola MBE, MFR, OFR ( a mụrụ Moore; 21 May 1913 - 15 May 2002) bụ onye Naịjiria na-ahụ maka agụmagụ ọ bụkwa onye isi nke mbụ nke National Council of Women Societies na Naịjiria ma onye isi otu umu nwanyi site n'afọ 1958 rue 1964. [1] Ọ bụ nwa nwanyị isi ojii Afrika nke mbụ nwetara nzere digirii na Mahadum nke Oxford, [2] [3] gụrụ akwụkwọ na St Hugh's College, ma bụrụkwa onye ode akwụkwọ akwụkwọ ụmụaka. [4]

Ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Kofo n'ezinụlọ onye ọka ikpe Legọs bụ Omoba Eric Olawolu Moore, onye otu ezinụlọ eze Egba [5] na nwunye ya bụ Aida Arabella (a mụrụ Vaughan), onye ya onwe ya si n'ezinụlọ ndị sitere na Scipio Vaughan (onye o sitere na ya nwekwara agbụrụ Cherokee ). [6] [7] Ọ bụ nwa nwanne nne Oyinkan, Lady Abayomi na nwa nwanne nwanyị Oloori Charlotte Obasa . O biri ọkara ndụ ya na Legọs ma ọkara nke ọzọ na UK. Ademola gụrụ akwụkwọ na CMS Girls School,dị na Legọs; Kọleeji Vassar, Nu Yọk; [8] Kọleeji Portway, dị na Reading . Site n'afọ 1931 rue 1935, ọ gụrụ akwukwo na St Hugh's College,dị n'Oxford, ebe o nwetara nzere digirii na mmuta na asusu bekee. Mgbe ọ nọ na St Hugh, o dere akwụkwọ akụkọ nke onwe dị peeji 21 banyere nkwudosike nke Margery Perham iji gbaghaa echiche ndị Briten banyere ndị Afrịka, o dere banyere oge ọ bụ nwata dịka ngwakọta nke usoro omenala ndị ọcha na nghazi nke ndị Afrịka. [10]

Ọ kọghị akụkọ banyere ịkpa oke agbụrụ n'oge ya na Briten, mana o gosipụtara iwe na "ị bụ onye a na-ahụta dị ka 'curio' ma ọ bụ ụfọdụ ihe atụ dị egwu nke ngwaahịa ụwa, kama dịka mmadụ nkịtị" yana "okwu adịghị mma banyere 'oke amamihe' anyị nwere nye ike ịsụ bekee na inwe ike iyi akwa bekee ". [9] Ademola laghachiri Naịjirịa n'afọ 1935 were nara ọkwa dịka onye nkuzi na Queens College. Mgbe ọ nọ na Legọs, o sonyere na ụfọdụ otu ụmụ nwanyị dị ka YWCA .

N’afọ 1939, ọ lụrụ Adetokunbo Ademola, onye ọrụ bekee. Ha mụrụ ụmụ ise. Dika nwunye nke onye isi ala Yoruba, o kwesiri ya ị dị ka Oloori - ma dika nwa nwanyi otu, ọ bụ Omoba - mana n'ihi na di ya bukwa ndi agha, o dika Lady Ademola ka a kacha mara ya.

Ọrụ di ya kpọgara ezinụlọ ya na Wọri ma o mechaa bụrụ Ibadan, Ademola were hiwe njikọ n'etiti otu ụmụ nwanyị na-ahụ maka ọgbakọ n'obodo abụọ a.

E nyere ikike mbipụta ihe ndekọ nke Kofoworola Aina Ademola, Gbemi Rosiji’s Portrait of a Pioneer, n’afọ 1996.

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe Ademola so di ya biri na Wọri, o so na ndi edemede akwukwo ndi nwanyi ma burukwa onye nkuzi na Koleeji Wọri. Mgbe ọ kwagara Ibadan, ọ malitere ka ya na Elizabeth Adekogbe bụrụ enyi na Council of Nigerian Women na Tanimowo Ogunlesi nke Women Improvement Society. Ọ bụ onye otu a ma bụrụ akwa mmiri jikọtara otu abụọ ahụ ma otu yana mmadụ ole na ole ọzọ ka ha nwee otu ọgbakọ. N'afọ 1958, mgbe e hiwere National Council of Women Societies, a họpụtara ya dịka onye isi oche mbụ. Dịka onye isi oche, ọ ghọrọ onye isi oche nke International Council of Women.

Ademola bụkwa onye na-elekọta mmadụ, onye nkuzi na onye mmụta, o hiwere ụlọ akwụkwọ abụọ: Girls Secondary Modern School na Legọs na New Era Girls 'Secondary School,dịkwa na Legọs. Ọ bụ onye ntụzi aka nke ndị nlekọta nke United Bank for Africa na odeakwụkwọ nke Western Region Scholarship Board. O dekwara akwukwo umuaka, otutu n’ime ha bu ndi akuko odida Anyanwu nke Afrịka, gunyere Greedy Wife and the Magic Spoon, Ojeje Trader and Magic Pebbles, Tutu and Magic Gourds, na Tortoise and Clever Ant, ha niile so na usoro “Mudhut Book". [10]

Onyinye nhubaama[dezie | dezie ebe o si]

E mere ya onye otu na Order of the British Empire n'afo 1959, natara onyinye site n'aka Queen Elizabeth the Queen Mother . [4] Gọọmentị Abubakar Tafawa Balewa nyere ya nsọpụrụ nke ị bụ onye otu Order of the Federal Republic .

Lady Ademola nwekwara utu aha onyeisi ndị Mojibade nke Ake na Lika nke Ijemo. [11]

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Jubril Olabode Aka (2012). Nigerian Women of Distinction, Honour and Exemplary Presidential Qualities: Equal Opportunities for All Genders (White, Black Or Coloured People). Trafford Publishing. ISBN 978-1-46-6915-5-41. 
  2. Lady Ademola. Bookcraft. Retrieved on August 3, 2016.
  3. Lisa A. Lindsay (2013). Biography and the Black Atlantic (The Early Modern Americas). University of Pennsylvania Press. ISBN 978-0-8122-454-62. 
  4. 4.0 4.1 Pamela Roberts (2014). Black Oxford: The Untold Stories of Oxford University's Black Scholars. Andrews UK Limited. ISBN 978-1-909-9301-48. 
  5. Meet Kofoworola Ademola, First African Woman To Graduate From Oxford University (en-US). Hope for Nigeria (2019-10-31). Retrieved on 2020-05-30.
  6. Horace Mann Bond (1972). Black American scholars: a study of their beginnings. University of Minnesota (Balamp Pub). ISBN 9780913642016. 
  7. Lindsay (2013). Biography and the Black Atlantic. ISBN 9780812208702. 
  8. Ann Short Chirhart (2014). Georgia Women: Their Lives and Times, (Volume 2 Book collections on Project MUSE. University of Georgia Press. ISBN 978-0-820-3378-45. 
  9. Umoren (2 October 2015). Kofoworola Moore at the University of Oxford (en). www.torch.ox.ac.uk. University of Oxford. Retrieved on 24 December 2017.
  10. Children's Books, African Studies Center, University of Pennsylvania.
  11. Omotayo (2019-10-31). Celebrating Kofoworola, 1st African woman to get a degree from Oxford University (en). Legit.ng - Nigeria news.. Retrieved on 2020-05-30.

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]

  • Ojewusi, Sola (1996). Speaking for Nigerian women: (a history of the National Council of Women's Societies, Nigeria) (in en). All State Pub. and Print. Co.. 
  • George, Abosede (2014). Making modern girls: a history of girlhood, labor, and social development in colonial Lagos (in en). Ohio University Press. 

Ebe e si dee dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]