Gaa na ọdịnaya

Ladi Ladebo

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Raymond Oladipupo Ladebo, nke a makwaara dịka Ladi Ladebo (amụrụ 7 Mee 1942 – 16 Eprel 2021 [1] bụ onye na-eme ihe nkiri na Naịjirịa. Ọ bụ otu n'ime ndị mbụ malitere ihe nkiri bụ Golden Age nke Naịjirịa n'oge gara aga, ọkachasị n'oge nchekwube nke oge celluloid nke afọ 1970. [2] Ọ rụrụ ọrụ dịka onye nnyocha mgbasa ozi na onye na-ahụ maka mgbakọ na mwepụ tupu ọ banye n'ọrụ ime ihe nkiri. A na-akpọkwa ya aha otutu ya bụ Uncle Ladi. [3]

Mgbe Ladi gụchara akwụkwọ sekọndrị ya na Naịjirịa, ọ gara mba Amerịka ịga gụchaa akwụkwọ sekọndrị ya. O nwetara akara ugo mmụta gbasara ahịa na azụmaahịa ya na mahadum dị na mba Amerịka. O buru ụzọ gaa Mahadum Bowling Green State dị na Ohio wee nweta akara ugo mmụta B.S ya na Nchịkwa Azụmaahịa n'afọ 1968. N'ọnwa Ọgọst afọ 1969, o nwetara akara ugo mmụta MBA ya na Marketing na Mahadum New York Graduate School of Business . [4] [5]

O tinyere aka na mmepụta ihe nkiri site n'ọrụ mgbasa ozi. Ọ rụrụ ọrụ dịka onye nnyocha mgbasa ozi na onye isi akaụntụ nke ụlọ ọrụ mgbasa ozi mba ụwa nke Ogilvy na Mather ruo afọ atọ n'agbata afọ 1969 nakwa afọ 1972. Ahụmịhe ya ịrụ ọrụ na ụlọ ọrụ mgbasa ozi mba ụwa mere ka o nwee ohere ịrụ ọrụ dịka onye enyemaka mmepụta ihe na fim ndị America na dịka onye na-emepụta ihe na mmemme telivishọn America. [6]

Ọ malitere ịrụkọ ọrụ ya na onye ome ihe nkiri Afrịka-Amerịka ochie bụ Ossie Davis na fim. Ọ dere ihe nkiri ahụ ma bụrụkwa onye na-emepụta ihe nkiri Countdown na Kusini nke afọ 1976, nke Ossie Davis duziri. A na-ewere Countdown na Kusini dị ka ihe nkiri mbụ nke ndị isi ojii Amerịka mere. [3] Ọ bụkwa ihe nkiri mbụ Ossie Davis na Ladi Ladebo mere na fim. O duziri ihe nkiri ole na ole gụnyere ndị a Bisi, Daughter of the River (1977) na Silent Sufferer, nke bụ mmekorita ya na ndị UNESCO na ndị UNPFA. Ọ malitere ime ihe nkiri nkwado mgbe afọ 1977 gasịrị, ma ya na otù ndị na-enye ego dịka UNESCO na UNPFA na-arụkọ ọrụ. [3]

Ladebo mekwara ihe nkiri ma ihe nkiri ya a ma ama dịka onye na-emepụta ihe nkiri bụ Vendor, nke ewepụtara n'afọ 1992 nwetara ihe nrite anọ gụnyere Onye Nduzi Kachasị Mma na Ihe Nkiri Kachasị Mma n'oge mbipụta mmalite nke Ememme Ihe Nkiri Naịjirịa n'afọ 1992. E wepụtara ihe nkiri nduzi ikpeazụ ya bụ Heritage n'afọ 2003, e mekwara ya na UK na 2004 na Khalili Theatre of the School of Oriental and African Studies. [3]

O mekwara ihe nkiri telivishọn, ihe nkiri telivishọn ya bụ Thrift Collector so n'ime ihe nkiri atọ nke Rotterdam Museum of Ethnology họpụtara dị ka TV soaps Kachasị Mma na Ọnụọgụgụ Mmadụ na Mmepe. [7]

Ọnwụ

[dezie | dezie ebe o si]

Ladebo nwụrụ n'abalị iri na isii nke ọnwa Eprel nke afọ 2021 mgbe ọ gbara afọ iri asaa na asatọ na London . [3] [4]

Edensibịa

[dezie | dezie ebe o si]
  1. ↑ "Hommage à un pionnier du cinéma nigérian". BBC News Afrique (in French). Retrieved 20 July 2022.
  2. ↑ Haynes, Jonathan (1995). "Nigerian Cinema: Structural Adjustments". Research in African Literatures. 26 (3): 97–119. ISSN 0034-5210.
  3. 1 2 3 4 5 "Paying tribute to a pioneer of Nigerian cinema". BBC News. 23 May 2021. Retrieved 27 May 2021.
  4. 1 2 "Odumosu mourns veteran filmmaker, Ladi Ladebo". Nigerian Tribune. 24 April 2021. Retrieved 27 May 2021.
  5. ↑ "TV5MONDE : Les cinémas d'Afrique - page 8". TV5MONDE (in French). Retrieved 27 May 2021.
  6. ↑ "Raymond Ladebo". www.amazon.com. Retrieved 27 May 2021.
  7. ↑ "Thrift Collector". Archived from the original on 11 October 2020. Retrieved 27 May 2021.

Njikọ mpụga

[dezie | dezie ebe o si]
  • Ladi Ladebo at IMDb