Lana Del Rey
| Ụdịekere | nwanyị |
|---|---|
| Mba o sị | Njikota Obodo Amerika |
| Aha ọmụmụ | Elizabeth Woolridge Grant |
| Aha enyere | Elizabeth, Woolridge |
| Aha ezinụlọ ya | Grant |
| Aha pseudonym | Lana Del Rey, May Jailer, Lizzy Grant, Lana Del Ray, Lana Rey Del Mar |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 21 Jụn 1985 |
| Ebe ọmụmụ | New York City |
| Ńnà | Robert England Grant, Jr. |
| Ńné | Patricia Ann Hill |
| Nwanne | Caroline Grant, Charlie Hill-Grant |
| Dị/nwunye | Jeremy Dufrene |
| Asụsụ obodo | English |
| Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Spanish, English |
| Asụsụ ọ na-ede | English |
| Ụdị ọrụ ya | na-ede |
| Ebe agụmakwụkwọ | Kent School, Fordham University |
| Ebe obibi | Venice, Los Angeles |
| Oge ọrụ ya (mmalite) | 2005 |
| Ụdị olu | mezzo-soprano |
| Ngwa egwu | olu egwụ |
| Diskografi | Lana Del Rey discography |
| Akara ndekọ | Interscope Records, Polydor Records |
| Webụsaịtị | https://lanadelrey.com/ |
| Onye nnọchite anya nwebiisinka | American Society of Composers, Authors and Publishers |
Elizabeth Woolridge Grant (amụrụ June 21, 1985), onye amaara ofụma dịka Lana Del Rey, bu onye America na-ede ukwe ma na-agụkwa agụ. A maara egwu ya maka nnyocha melancholic nke ịma mma na ihunanya, na-ekwukarị banyere omenala pop na Americana ndị dị n'àgbàtà 1950 ruo 1970. Ọ bụ onye nwetarala nkwanye ùgwù dị iche iche, gụnyere MTV Video Music Award, MTV Europe Music Awards atọ, Brit Awards abụọ, Billboard Women in Music Awards abụọ nakwa Satellite Award, gụnyekwara nhọpụta ya maka Grammy Awards dị iri na otu yana Golden Globe Award.[1] Variety kwanyeere ya ùgwù n'oge Hitmakers Awards ha maka ịbụ "otu n'ime ndị na-agụ egwú na narị afọ nke iri abụọ na otu". N'afọ 2023, Rolling Stone debara aha Del Rey na ndepụta aha mmadụ "Narị Abụọ Kasị Ukwuu Ndị Na-agụ Egwu Oge Nile", ebe akwụkwọ mbipụta nwanne ha Rolling Stone UK kpọrọ ya dị ka "Onye America na-ede abụ na-agụkwa agụ kasị ukwuu nke narị afọ nke iri abụọ na otu.[2][3]
Mmalite Ndụ na Agụmakwụkwọ Ya
[dezie | dezie ebe o si]
A mụrụ Elizabeth Woolridge Grant na June 21, 1985[4] na Manhattan, New York City (upstate New York) ebe ọ nọkwa too, [5] nye Robert England Grant Jr., onye na-edegharị akwụkwọ n'ụlọ ọrụ Grey Group, yana Patricia Ann “Pat” Grant (a mụrụ n'ezinụlọ Hill), onye isi njikwa akaụntụ n'otu ụlọ ọrụ ahụ [6][7][8] O nwere nwanne nwanyị obere Caroline "Chuck" Grant, [9] na nwanne nwoke obere, Charlie Grant, ndị ọ tọchara [10][11]. A zụlitere ya dịka onye okpukpe Katọlik [12]ma bụrụ onye Scotland na onye Bekee [13] Mgbe ọ dị otu afọ, ezinụlọ ahụ kwagara Lake Placid, New York. [14] N'ebe ahụ, ọ gara ụlọ akwụkwọ St. Agnes na afọ elementrị ya [11] wee malite ịbụ abụ n'òtù ukwe ụka ya, ebe ọ bụ onye na-agụ ihe ọgụgụ [11][15]
Ọ gara ụlọ akwụkwọ sekọndrị ebe nne ya kuziri ihe otu afọ, [16] mana mgbe ọ gbara afọ iri na anọ [17] ma ọ bụ iri na ise, [18] nne na nna ya zigara ya n'ụlọ akwụkwọ Kent School, [19] ụlọ akwụkwọ Episcopal dị na Connecticut, ka ọ nwee uche pụọ n'ịňụ mmanya n'ihi na ịňụ mmanya na-aba n'anya, yana ọgwụ ọjọọ, bụụrụ nsogbu malitere n'oge ọ dị afọ iri na ụma ma bụrụ nke dịsiri ike nke mere n'ezinụlọ ya dum, gụnyere Grant n'onwe ya, nwere nchegbu. Grant mechara kwụsị ịgụ akwụkwọ ka ọ gaa mgbatị ahụ; ebe ọ nọ na-echebara onwe ya echiche kemgbe 2003[17] O mechara gaa SUNY Geneseo na Geneseo, New York na mbụ, mana ọ kwụsịrị iji otu afọ ezumike.[20] N'afọ 2004, mgbe ọ dị afọ iri na itoolu, Grant debanyere aha na Mahadum Fordham dị na Bronx, New York City, ebe ọ gụrụ nkà ihe ọmụma, na-emesi ike na metaphysics.
Ọrụ Ya
[dezie | dezie ebe o si]Mmalite Nta Ya
[dezie | dezie ebe o si]Ya na nwanne mama ya nke nwanyị na nke nwoke biiri na Long Island otu afọ, O wee rụọ ọrụ dị ka onye na-eresi ndị mmadụ mmanya n'ụlọ oriri na ọňụňụ [21]N'oge a, nwanne nna Grant kụziiri ya ka e si akpọ guitar, o wee "ghọta na ọ nwere ike dee otu ndè egwu site na mkpara egwu isii ahụ".[22] N'oge na-adịghị anya ka nke ahụ gasịrị, ọ malitere ide abụ yana ịme ihe nkiri n'ụlọ oriri na ọṅụṅụ abalị dị na gburugburu obodo ahụ n'aza aha dị iche iche dịka "Sparkle Jump Rope Queen" na "Lizzy Grant" nakwa "Phenomena" [22]. "M na-abụ abụ mgbe niile, mana anaghị m enwe atụmatụ ịchụso ya nke ọma dịka akara aka m," ka o kwuru.
2005–2010: Mmalite ọrụ na ndekọ mbụ ya Gasị
[dezie | dezie ebe o si]
N'oge opupu ihe ubi afọ 2005, mgbe ọ ka nọ na kọleji, Del Rey debara aha egwuregwu agbatị ogologo dị asaa n'ụlọ ọrụ nwebiisinka nke United States; aha ngwa ahụ bụ Rock Me Stable yana aha ọzọ, Young Like Me, nke o debakwara aha ya.[23] Edebakwara egwuregwu ịgbatị nke abụọ, From the End, n'aha ọkwa Del Rey n'oge ahụ bụ May Jailer.[24] N'agbata 2005 na 2006, o dekọtara ọba egwu, Sirens, n'aha May Jailer kwa,[24] nke gbara na ịntanetị mgbe a na-ebipụtabeghị ya n'etiti afọ 2012.[25] O mere ihe ngosi ọhaneze nke mbụ ya n'afọ 2006 maka asọmpi ịde abụ nke Williamsburg Live, ebe o zutere Van Wilson, onye nnọchi anya A&R maka 5 Points Records, [26][27] akara aha nweere onwe ya nke David Nichtern nwere.[27] Na 2007, mgbe ọ bụ agadi na Fordham, o nyefere teepu ngosi nke egwu egwu, No Kung Fu, n'aka 5 Points, [24] nke nyere ya nkwekọrịta ndekọ maka $10,000. N'ịhọrọ aha ọkwa maka egwu mpụta mbụ ya, che họọrọ aha Lana Del Ray, nke sitere na onye na-eme ihe nkiri Lana Turner yana ụgbọ ala Ford Del Rey sedan, emepụtara ma reekwa na Brazil n'afọ ndị 1980 ha.[28]
Nrụtụaka
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Mier, Tomás (November 11, 2023). "Lana Del Rey 'Woke Up Very Excited' About Her 5 Grammy Nods". Rolling Stone. Retrieved November 25, 2023.
- ↑ Ewens, Hannah (March 8, 2023). "Lana Del Rey: she does it for the girls". Rolling Stone. Retrieved May 20, 2023.
- ↑ "The 200 Greatest Singers of All Time". Rolling Stone. January 1, 2023. Retrieved February 17, 2023.
- ↑
- Hiatt, Brian (July 18, 2014). "Lana Del Rey – The Saddest, Baddest Diva in Rock". Rolling Stone. No. 1212. p. 44.
Del Rey is four days away from her 29th birthday (for reasons she can't explain, she's usually reported to be a year younger), but looks, at the moment, like a college junior home for the summer.
; - Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).;
- Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
- Hiatt, Brian (July 18, 2014). "Lana Del Rey – The Saddest, Baddest Diva in Rock". Rolling Stone. No. 1212. p. 44.
- ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).

- ↑ Bock, Melvin Lynn; E. Dale Hooper; Carole J. Skelly (1998). Joseph and Mary Dale and their descendants. Windmill Publications. p. 113.
- ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
- ↑ Rüth, Steffen (June 5, 2014). "Lana Del Rey". Grazia (in German) (24/2012). Hamburg, Germany: G+J/Klambt-Style-Verlag GmbH & Co. KG: 36. ISSN 2192-3965.
- 1 2 3 Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
- ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
- ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
- ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
- ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
- ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
- 1 2 Heaf, Jonathan (October 1, 2012). "Woman Of The Year: Lana Del Rey". British GQ. Retrieved October 17, 2022.
- ↑ Templeeti:Multiref2
- ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
- ↑ Cummings, Alex Sayf (February 2, 2015). "The Gonzo Vision of Lana Del Rey". Tropics of Meta.
- ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
- 1 2 Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
- ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
- 1 2 3 Hellyer, Isabelle (April 18, 2017). "The Greatest Lana Del Rey Songs That Never Made an (Official) Album". I-D. Vice. Retrieved August 13, 2017.