Gaa na ọdịnaya

Leo H. Bartemeier

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Leo Henry Bartemeier (September 12, 1895 - October 9, 1982) bụ onye dọkịta mba America, onye nyocha ndị ọrịa uche, na onye nkuzi. Ọ bụ Onye isi oche nke mba American maka ndị òtù dokinta na ahụ maka isi mgbaka.

Akụkọ ndụ

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Bartemeier na Septemba 12, na afo1895, na Muscatine, Iowa, n'ime ezinụlọ ndi òtù ụka Roman Katọlik. Ọ gara ụlọ akwụkwọ parochial dị n'ógbè ahụ wee debanye aha na St. Mary's College (Kansas), ụlọ ọrụ Jesuit, wee gụchaa afọ abụọ nke kọleji. Ọ mụtara mkpirisi na ide ihe mgbe ọ na-arụ ọrụ mba ụlọ ọrụ ndị associated Press. Ọ gara ma mechaa kọleji na Mahadum Katọlik nke mba America na Steeti Washington, DC, na-enweta nzere Bachelor of Arts na Master of Arts, na-esote nnabata nke thesis ya na nyocha anụmanụ. Ọ banyere na Georgetown Medical College wee nweta GodMD ya na afo 1920. Ebe obibi mbụ ya màkà ọmúmú ihe gbasara ahụ ike pbụ n'Ụlọ Ọgwụ Henry Ford dị na Detroit wee, na afo 1924, ọ malitere ebe obibi nke abụọ ya na Baltimore, Maryland, n'okpuru Adolf Meyer (onye isi mgbaka). N'oge a, o bipụtara akwụkwọ mbụ ya, "Decerebrate Rigidity of the Sloth", na afo1926.

Ọ laghachiri Detroit na afo 1926 iji malite ọrụ ya na-ahụ maka isi mgbaka. N'afọ 1930, ọ malitere ọzụzụ maka nyocha maka ụbụrụ na obodo Chicago, na afo 1938, ọ ghọrọ onye nyocha ọzụzụ. Ọ bụ onye mbụ na-enyocha uche na Detroit ma nyere aka guzobe Detroit Psychoanalytic Society na afo 1940. Ọ bụ onye isi oche nke Society site na afo 1940 ruo afo1946. N'afọ 1945, n'oge Agha Ụwa nke Abụọ, ọ bụ Onye isi oche nke Kọmitii iji mụọ ike ọgwụgwụ agha na mba Europe, ma jee ozi dị ka onye ndụmọdụ nke U.S. Army Surgeon General. Mgbe 1944, ọ bụ osote prọfesọ na Wayne State University Medical School (1946-1950), onye nduzi nke Veterans Psychiatric Clinic na Harper Hospital (1946-1950) na prọfesụ mbụ na-eleta ọrịa uche na Mahadum Michigan (1950-1954). N'afọ 1954, Bartemeier kwagara Baltimore ka ọ bụrụ onye isi Ụlọ Ọgwụ Seton, ụlọ ọgwụ ndị isi mgbaka onwe onye, ebe ọ rụrụ ọrụ ruo n'afọ 1980.