Gaa na ọdịnaya

Leonora Dori

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Leonora Dori Galigai

Leonora Dori Galigai (19 Mee 1568 - 8 Julaị 1617) bụ onye isi obodo France nke sitere n' ntọala onye ọkọcha mma nke onye isi ala France Marie de 'Medici, nne Eze Louis nke Iri na Atọ. Galigaï ọbụConcino Concini bụ nwunye ya. onye mechara bụrụ marquis na marshal d'Ancre, n'oge ọchịchị Marie dị ka eze nwanyị na onye na-achị France.

Ndụ mbụ na France

[dezie | dezie ebe o si]

Galigaï, nwa nwanyị onye kapịnta bụ Dori, toro na Florence na Palazzo Pitti dị ka nwa agbọghọ Marie de 'Medici kpotara na ekere ozi, onye gbara mbọ zọpụta onwe ya na nkuchi ya n'aka ndị Galigai, ezinụlọ Florentine ejighi ego.

N'afọ 1600, nwa agbọghọ a soro onye na elekota anya gaa France onye lụrụ Eze Henry nke Anọ nke France, onye akpọrọ Galigaï Dame d'atour (nwanyi na-echere) nye Eze Nwanyị Marie, ozugbo ọ lụrụ onye isi Florentine Concini.

Galigaï nwere ọya n'ụwa obi na nkụchi na-eme ka arụ kpọnwụọ, nke bụ ogbụgba ama ọya a na akpọ epilepsy, nke eze nwanyị na ndị na-ejere ya ozi kwenyere na ọ sitere na mmụọ ọjọọ , mana nke na-eguzogide ị chụpụ mmụọ ọjọọ. Ọ bụ onye Portuguese a mụrụ, onye Italian-Jewish court physician nke Marie na Louis XIII gwọrọ ya: Filothe Eliau Montalto ( ọ nwụrụ na 1616).

N'oge ndị mmadụ kwenyere na amoosu na ịgba ama, eze nwanyị ahụ were Galigaï n'ọrụ iji chụpụ ndị mmụọ ọjọọ na anwansi ọcha iji gbochie anwansi ojii na mbụmọnụ Ọ nwere nnukwu ego site na ọrụ ndị a, yana aka azụ maka inye ndị mmadụ ohere ịhụ eze nwanyị. Galigaï nwetara nnukwu akụ na ụba, nke o tinyere na ụlọ akụ na ịrụ ụlọ dị iche iche na France na Italy.

N'afọ 1610 ka e gburu Eze Henry nke Anọ, di Marie de 'Medici, nwunye ya wee bụrụ Eze Nwanyị Nne nke Louis nke Iri na Atọ na Regent nke France. Mgbe ndị iro ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya gburu Concini na 1617, e kpụrụ nwunye ya Galigaï, tụọ ya kpochie ya na Blois e boro ya ebubo na ọ na-eme anwansi ojii, amọosu na "Ịkpọ ndị Juu". A mara Galigaï ikpe maka ịdọ aka ná ntị. E bere ya isi ma me sịa kpọọ ozu ya ọkụ n'osisi na Place de Grève na Paris. N'otu oge ahụ, na 1616 na 1617, e bipụtara abụ na trakị dị iche iche na Paris, Rouen, na London (ntụgharị Bekee), gbasara di na nwunye ahụ, ọrụ ha na ọdịnihu ha. [1][2]

Ndụ Galigaï bụ isiokwu nke ọdachi Alfred de Vigny nke 1831 La Maréchale d'Ancre na opera Italian nke 1839 La Marescialla d'Ancré, nke nwere akwụkwọ Giovanni Prati, dabere na ọrụ de Vigny, na egwu Alessandro Nini.

  1. "au:Concini, Concino. - Search Results". www.worldcat.org. Retrieved 2023-11-14.
  2. "Galigaï - Search Results". www.worldcat.org. Retrieved 2023-11-14.