Jump to content

Let Me Be a Woman

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ


Ka M Bụrụ Nwanyị: ihe Ndetu nye nwa m nwanyị na akowa ihe Nwanyị Pụtara bụ akwụkwọ afọ 1976 nke Elisabeth Elliot dere nke Tyndale House bipụtara na Wheaton, Illinoisdi na obodo United Steeti. [1] Akwụkwọ ahụ dị peeji narị iri asatọ na ise, ọ na-ekwukwa banyere ihe e dere banyere ụmụ nwanyị na Baịbụl . [2] Akwụkwọ ahụ na-enyekwa ndụmọdụ gbasara alụmdi na nwunye. [3] Elliot nyere Valerie akwụkwọ ahụ, [4] otu nwa ya, [5] dị ka onyinye n'ụbọchị agbamakwụkwọ ya. [4] Elliot jiri nkebi ahịrịokwu ahụ bụ "Ka m bụrụ nwanyị" na nzaghachi nke ndị otu Ndị Kraịst, nke o kwuru na ọ bụghị "ihe mgbaru ọsọ a ga-achọsi ike [n'ihi na] ọ bụ nhụsianya na-emebi mmadụ." [6] Ojiji nkebiokwu a n'ụzọ otu a n'afọ 1977 na Nzukọ ụmụ nwanyị mba di na Houston, obodo Texas kpalitere oke ito . [7] Akwụkwọ ahụ nwere ọtụtụ akụkọ, nke mbụ n’ime ha na-akọ banyere otú Chineke si mee ka mmadụ abụọ si n’akụkụ ụwa dum nwee mmekọrịta ịhụnanya n’ihi na ha na-erubere Chineke isi. Akụkọ ọzọ bụ banyere igbu ọchụ nke John na Betty Stam, Ndị Kraịst nwụrụ n'ihi okwukwe . E tinyekwara ekpere Betty Stam n’akwụkwọ ahụ. Ekpere ahụ na-arịọ ka e mee uche Chineke n'uju na ndụ ya, n'agbanyeghị ihe ọ na-efu onwe ya. N'afọ 2003, Andrew Farmer nke Crosswalk.com hotara akụkụ akwụkwọ ahụ iji kwado arụmụka ya na ịnọ n'alụghị di bụ onyinye mmụọ Chineke na-enye ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye maka oge ha na-alụbeghị di. [8]

Ihe odide

[dezie | dezie ebe o si]
  1. Elisabeth Elliot (1976). Let Me Be a Woman: Notes to my Daughter on the Meaning of Womanhood. Wheaton, Illinois: Tyndale House. ISBN 978-0842321617. 
  2. Steven C. Kettler (1993). Biblical Counsel: Resources for Renewal. Lettermen Associates. ISBN 978-0963682116. 
  3. (August 25, 2008) "For marriage, the honeymoon's over: A scholar delves into an institution's troubled history". The Vancouver Sun. Retrieved on May 24, 2013. 
  4. 4.0 4.1 Cindi McMenamin (2011). When a Woman Inspires Her Husband: Understanding and Affirming the Man in Your Life. Harvest House. ISBN 978-0736942126. 
  5. John Piper (2006). Recovering Biblical Manhood and Womanhood: A Response to Evangelical Feminism, 2, Good News Publishers. ISBN 978-1581348064. 
  6. Ann Arnold (November 20, 1977). "Counter-Rally Assails Women's Conference". Sarasota Herald-Tribune. 
  7. Dorothy Austin (November 21, 1977). "Mead Talk Wows Conference". Milwaukee Sentinel. 
  8. Andrew Farmer (September 15, 2003). "A New Testament Theology of Singleness". Crosswalk.com. Retrieved on May 24, 2013.