Gaa na ọdịnaya

Linor Abargil

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Linor Abargil,Israeli model and beauty pageant titleholder

Linor Abargil (Hibru: לינור אברג'יל, a ma-asụpe.mgbe ụfọdụ dịka Linor Aberjil; amụrụ na Febụwarị 17, 1980) bụ onye ọka iwu Israel, onye na-eme ihe nkiri, onye a na-ekiri ekiri na eze nwanyị mara mma nke meriri Miss World 1998, [1] obere oge ka e dinachara ya n'ike. Kemgbe ahụ, ọ ghọwo onye nkwado a maara n'ụwa dum n'ịlụ ọgụ megide mmekọahụ n'ike.[2] Onye bu ya ụzọ bụ Miss World 1997, Diana Hayden kpuwere ya okpueze.

Akụkọ ndụ Ya

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Abargil na Netanya, Israel, nwa mbụ nke Aliza na Jackie Abargil.[3] Ezinụlọ ya bụ ndị Moroccan-Jewish.

N'afọ 1996, mgbe ọ dị afọ iri na isii, ụlọ ọrụ na-ahụ maka ihe ngosi Look bịanyeere ya aka, wee gaa n'ihu merie echichi "Nchọpụta nke Afọ Ahu" na asọmpi ihe ngosi nke afọ 1997. N'afọ 1998, mgbe ọ dị afọ iri na asatọ, e chiri ya okpueze Miss Israel, wee gaa n'ihu na asọmpi Miss World na Seychelles.

Naanị izu asaa tupu asọmpi ahụ eruo, Uri Shlomo Nur, onye na-ahụ maka njem si Milan, dinara Abargil dị afọ iri na asatọ n'ike ma maa ya mma.[4] E zigara Abargil Nur site n'aka ụlọ ọrụ ya na-emepụta ihe n'Itali maka enyemaka ịgbanwe ụgbọ elu ga-ebu ya laghachi Israel. Nur gwara Abargil na ọ ga-adị mfe ịbanye n'ụgbọelu site na Rom, ma kwuo na ọ ga-ebuga ya ebe ahụ n'ụgbọala ya. N'ụzọ, ọ gbabaziri n'okporo ụzọ ruru unyi dịpụrụ adịpụ, ebe o ji mma yie Abargil egwu, kee ya n'oche azụ, ma dinaa ya n'ike, mgbe nke ahụ gasịrị ọ malitere ịpịa ya mma ma jiri eriri chọọ ikwụgbu ya. Dịka o doziri ya anya na na o bu n'obi igbu ya, Abargil jisiri ike gbapụ site n'ịmesi Nur obi ike na nke a "abụghị ya n'ezie" nakwa na ọ gaghị agwa onye ọ bụla. Otú ọ dị, ozugbo ọ rutere n'ọdụ ụgbọ okporo ígwè Rome, ọ kpọrọ nne ya ka ọ gwa ya ihe merenụ, wee zute nwanyị so ya gaa nyocha ahụike ma kọọrọ ndị uwe ojii ndina n'ike ahụ. Otú ọ dị, ndị ọchịchị Ịtali tọhapụrụ Nur ozugbo, wee jụ ikpe ya ikpe.

Abargil gara n'ihu merie echichi Miss World, laghachi n'ụlọ Israel izute ịma ya nke ọma na nlebara anya ọha na eze, nke ọ kọrọ na o mere ka o siere ya ike ịnagide nsogbu ọ na-aga n'ihu, ma mee ka o siere ya ike ịrụ ọrụ ya dị ka Miss World.[5]

N'ịbụ onye nwere nkụda mmụọ n'ihi na ndị ọchịchị Ịtali jụrụ ịga n'ihu n'okwu ahụ, Abargil kọọrọ ndị ọchịchị Israel banyere ndina n'ike ahụ, bụ ndị nyere ikike ijide Nur wee malite usoro mbufe okwu ahụ. N'ihi nkwụsịtụ mgbasa ozi na ikpe ahụ na Israel, Nur amaghị banyere ebubo ndị a na-ebo ya. Mgbe ọ laghachiri Israel ọnwa ole na ole ka e mesịrị ileta ezinụlọ ya, e jidere ya n'ọdụ ụgbọ elu. E kpere ya ikpe maka ndina n'ike, na ịtọrọ mmadụ, ma maa ya ikpe site n'enyemaka nke Ihe akaebe DNA a chọtara n'ụgbọala ya.[6] A mara Nur ikpe ịga mkpọrọ afọ iri na isii.[7][8] Mgbe ọ bịara maka nnwere onwe, Abargil guzobere mkpọsa megide ntọhapụ ya, ọ mechara nọzuo oge mkpọrọ ya niile. Ka ọ na-erule n'oge a, ọ ghọworị onye a ma ama na-eme ngagharị iwe, na-akpọ ụmụ nwanyị ndị ọzọ ka ha soro ihe nlereanya ya ma kọọrọ ndị uwe ojii mwakpo ha niile. [9][10]

Mgbe ọ nwetasịrị mmeri Miss World, Abargil gara n'ihu na-arụ ọrụ dị ka onye a na-ekiri ekiri na Israel nakwa na mba ụwa, wee debanye aha ịmụ ihe nkiri na Beit Zvi School for the Performing Arts. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ pụtara n'ọtụtụ egwuregwu na usoro telivishọn. Otú ọ dị, n'etiti mkpebi ya ịghọ onye Juu Ọtọdọks na 2009, nke kwụsịrị ime ihe ngosi ya, nakwa mkpebi ya ịlụso ime ihe ike mmekọahụ ọgụ, Abargil kpebiri ụzọ ọhụrụ, wee kpebie ịmụ iwu na Netanya Academic College . [11] Ọ gara n'ihu ịrụrụ onye ọka iwu Tel Aviv District ọrụ.

Miss World Obi Siri Ike

[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2008, Abargil malitere ime ihe nkiri nke dabeere na ndina n'ike edinara ya nakwa ya ịbụ onye ngaghari iwe, a kpọrọ Brave Miss World . N'ịbụ nke Cecilia Peck duziri, ihe nkiri ahụ sochiri Abargil ka ọ na-agagharị n'ụwa niile na-akụzi ihe ma na-ezute ụmụ nwanyị ma na-agba ha ume ikwu maka ahụmịhe ha na ime ihe ike mmekọahụ.[12] Ihe nkiri ahụ na-egosikwa mgbalị ya iji dozie ihe ike ọ gabigara, mmekọrịta ya na ndị ezinụlọ ya, nnakwere ya nke okpukpe ndị Juu Ọtọdọks (nke mere na ọ naghịzi arụ ọrụ dị ka onye a na-ekiri ekiri), mkpọsa ya iji mee ka Nur nọrọ n'ụlọ mkpọrọ, mkpebi ya ịmụ iwu na ịrụ ọrụ na Ọfịs Onye Ọkaiwu District ahụ, nakwa ntọhapụ nke abụ o dere banyere mgbaghara n'etiti nne na nwa ya nwanyị mgbe e dinasịrị nwa ya nwanyị n'ike. [13] N'etiti ụmụ nwanyị na-ekere òkè na ihe nkiri ahụ bụ ụmụ akwụkwọ, ndị nne, ndị agadi nwanyị, na ọtụtụ ndị ama ama dị ka Joan Collins na Fran Drescher, ndị kọrọ akụkọ nke ha banyere mwakpo mmekọahụ n'ike.[12] Na ngwụcha ihe nkiri ahụ, Abargil laghachiri nzọụkwụ ya na Ịtali, site na tupu na mgbe ndina n'ike ahụ gasịrị, na-ezute ndị nyeere ya aka, dị ka dọkịta ome nnyocha, ma na-eche ndị na-eme ihe ngosi ihu bụ ndị ọ maara na ọ bụ ha mà ụma ziga ya na ụmụ agbọghọ ndị ọzọ n'ihe ize ndụ site n'aka ndị a ma ama na-eme mmekọahụ n'ike. Ihe nkiri ahụ na-agbasokwa ndụ onwe onye Abargil, alụmdi na nwunye ya, ọmụmụ ụmụ abụọ mbụ ya, na njem ime mmụọ ya.[14]

Brave Miss World gosiri nke mbụ ya na telivishọn Israel na 2013, bịa na nyocha dị mma na nnabata ọha na eze, a na-egosikwa ya n'ọtụtụ mmemme ihe nkiri na United States na Europe n'afọ 2013 na 2014. A họpụtara ihe nkiri ahụ maka Primetime Emmy maka Outstanding Documentary Film . [14]

Aha ejiji LYA

[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2017, Abargil ya na enyi ya, onye ọchụnta ego Yafit Attias, malitere akara ejiji iji gboo mkpa ejiji kwesiri ekwesị nke ụmụ nwanyị okpukpe.[15] Ha kpọrọ akara ahụ LYA, ngwakọta nke mkpụrụedemede mbido aha ụmụ nwanyị abụọ ahụ.[16]

Okwu ya na nnọkọ pụrụ iche nke UN

[dezie | dezie ebe o si]

Na Disemba 2023, Linor kwuru okwu na ihe omume pụrụ iche na United Nations, na-elekwasị anya na ime mmekọahụ n'ike nke Hamas n'oge mwakpo ntụnanya na Israel. [17][18] Linor katọrọ òtù ụmụ nwanyị mba ụwa n'ụzọ siri ike maka ịgbachi nkịtị ha na mwakpo mmekọahụ n'ike nke n'ụbọchị nke asaa n'ọnwa Ọktoba, na-ekwusi ike na ọ dị mkpa ịkwalite olu ndị o metụtara.[19]

Ndụ onwe onye

[dezie | dezie ebe o si]

Abargil lụrụ onye Lithuania na-egwu egwuregwu boolu nkata bụ Šarūnas Jasikevičius n'ememe e mere na nsonso Barcelona, na July 2006. [20] Ha gbara alụkwaghịm na 2008.[7][21] N'afọ 2010, Abargil lụrụ onye njikwa Oron Calfon, ma nabata okpukpe ndị Juu Ọtọdọks. N'afọ 2012, ọ mụrụ ejima (nwa nwoke na nwa nwanyị), n'afọ 2013, ọ mụrụ nwa nwanyị. Ọ mụrụ nwa nwanyị ọzọ na Septemba 2019. [22][23][24] Abargil nwetara akara ugo mmụta n'iwu site na Netanya Academic College, e wee nabata ya na Israel Bar.[25]

Edensibia

[dezie | dezie ebe o si]
  1. Linor cruises to Miss World title. BBC News (November 27, 1998). Retrieved on July 12, 2010.
  2. Take Back the Night features former Miss World Linor Abargil. Archived from the original on September 23, 2010. Retrieved on July 12, 2010.
  3. Linor's Story. Brave Miss World. Retrieved on 7 May 2014.
  4. Kasriel (May 21, 2009). How Miss World made rapist pay. Jewish Chronicle Online. Retrieved on July 12, 2010.
  5. מיס עולם לינור אברג'יל: "האנס לא יישאר כאן. יעשו לו את המוות" (he). xnet. Retrieved on 2020-02-24.
  6. ועתי"ם. "ביהמ"ש הרשיע את נור שלמה במעשי אונס וסדום בלינור אברג'יל", Globes, 1999-10-07. Retrieved on 2020-02-24. (in he)
  7. 1 2 Follain. "Ex-Miss World to make graphic film of her rape", The Times Online, December 21, 2008. Retrieved on July 12, 2010.
  8. Pageant News Bureau (PNB) – Pageant News. Archived from the original on 2007-03-29.
  9. The Linor Documentary Project. Archived from the original on December 25, 2008. Retrieved on December 22, 2008.
  10. How Miss World made rapist pay | the Jewish Chronicle. Archived from the original on 2010-09-04. Retrieved on 2010-07-12.
  11. ארזואן (2013-05-22). קבלו את עורכת הדין - לינור אברג'יל (he). ynet. Retrieved on 2020-02-24.
  12. 1 2 Kamin. The beauty who faced the beast (en-US). Timesofisrael.com. Retrieved on 2020-02-24.
  13. "מיס עולם האמיצה": תודה לך, דמות מופת (he). ynet (2014-01-21). Retrieved on 2020-02-24.
  14. 1 2 "Brave Miss World": Raped Before Winning '98 Title, Linor Abargil Campaigns Against Sexual Violence. Democracy Now (2013-02-19).""Brave Miss World": Raped Before Winning '98 Title, Linor Abargil Campaigns Against Sexual Violence". Democracy Now. 2013-02-19.
  15. "עם גבולות, ללא ויתורים": לינור אברג'יל משיקה מותג אופנה בעיצובה (he-IL). Fashion.walla.co.il (2017-03-23). Retrieved on 2020-02-24.
  16. איתי יעקב (9 April 2017). בבית ובארון של לינור אברג'יל: "היום אני יודעת שאין סטייל בעולם הדתי" (he). Xnet.ynet.co.il. Retrieved on 2020-02-24.
  17. "Rape as a Weapon of War: Jewish Women Call on UN to Confront Hamas' Sexual Violence", Haaretz. Retrieved on 2023-12-12. (in en)
  18. Botbol. "Israel-led UN special session condemns world silence on Hamas using rape as weapon of war", Times of Israel, 5 December 2023.
  19. Hamas sexual violence against Israeli women revealed at UN: ‘Girls without any clothes on, without tops, without underwear’ (en-US). All Israel News (5 December 2023). Retrieved on 12 December 2023.
  20. Israel's Celebrity Wedding. Forward.com. Retrieved on 12 November 2021.
  21. Former Miss World to shoot 'inspirational' documentary about her rape. Archived from the original on 2009-08-04. Retrieved on 2009-06-29.
  22. תמונות ראשו: לינור אברג'יל והבייבי. Israelhayom.co.il.
  23. לינור אברג'יל. Ishim.co.il.
  24. After ten years, I felt I was ready. Israelhayom.co.il. Retrieved on 12 November 2021.
  25. ארזואן (22 May 2013). קבלו את עורכת הדין - לינור אברג'יל. Ynet.co.il.

Njikọ mpụga

[dezie | dezie ebe o si]

Templeeti:S-start Templeeti:S-ach Templeeti:S-bef Templeeti:S-ttl Templeeti:S-aft Templeeti:S-bef Templeeti:S-ttl Templeeti:S-aft |}