Little Rot
Little Rot bụ akwụkwọ Akwaeke Emezi dere n'afọ 2024. Akwụkwọ a na-esochi ndụ ndị enyi ise ndị dabara n’ime mgbagwoju anya nke mmekọahụ, ụgha, na nrụrụ aka.
Nchịkọta
[dezie | dezie ebe o si]Little Rot bụ akụkọ a na-esochi ndị enyi ise chere na ha ga-enwe abalị dị ụtọ, mana ha mechara banye n’ime nsogbu na ihe egwu. Akụkọ a na-elekwasị anya n’otu di na nwunye ana akpọ Aima na Kalu si kewara (ịgba arukwaghim) n'agbanyeghi ọtụtụ afọ ha bigoro.[1]
Kalu, ka obi ka na-afụ ya mgbu n’ihi nkewa ya na Aima, gara oriri mmekọahụ nke enyi ya Ahmed haziri. Mkpebi a tinyere ya na ndị enyi ya n’ime usoro ihe omume jupụtara n’ime ihe ike na nsogbu siri ike. Ndị nwanyị abụọ Naijiria na-arụ ọrụ mmekọahụ, Ola na Suoraya, ndị si Kuala Lumpur bịa, sokwa tinye aka n’ime nsogbu a ka ha na-achọ ụzọ isi gbanahụ ụwa mpụ dị ize ndụ nke obodo ahụ.
Ndị agwa
[dezie | dezie ebe o si]- Aima – onye bụbu onye mmekọ Kalu, nkewa ha kpatara ihe niile.
- Kalu – nwa okorobịa na-agbalị ịnagide mgbu obi na mgbanwe ndụ ya.
- Ahmed – enyi Kalu nke haziri oriri mmekọahụ ahụ.
- Ola – nwanyị na-arụ ọrụ mmekọahụ nke tinyere aka n’ihe omume ahụ.
- Suoraya – enyi Ola, kwa onye na-arụ ọrụ mmekọahụ, onye sokwa banye n’ime nsogbu ahụ.
Nnabata
[dezie | dezie ebe o si]Chelsea Leu nke The New York Times kọwara njedebe akwụkwọ ahụ dị ka nke nwere “ihe mgbagwoju anya na nke na-awụ akpata oyi nke na-adọtakwa onye na-agụ ya n’ime ya”.[2]
Carol V. Bell nke Los Angeles Times kọwara Little Rot dị ka “ịda n’ime ọchịchịrị nke na-atọ ụtọ ma sie ike ịnagide”.[3]
Chicago Review of Books toro akwụkwọ ahụ dị ka njem na-akpali akpali n’ime omimi nke mmadụ na ebe obibi ha, ebe Kirkus Reviews kọwara ya dị ka “akụkọ ịhụnanya nke oge a maka ndị na-enwe obi nkoropụ na ndị na-ajụ echiche ọdịnala”.[4][5]
Edensibia
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Little Rot (22 March 2024).
- ↑ "It Was Supposed to Be a Fun Night Out. It Led to a Criminal Underworld", 2024-06-16. (in en)
- ↑ Akwaeke Emezi's novel 'Little Rot' is a thrilling but difficult descent into darkness (en-US) (2024-06-17).
- ↑ Washington, Gianni (2024-07-02). Buried Secrets and Fragile Masks in "Little Rot" (en-US).
- ↑ Little Rot (en).