Lola Omolola

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Lola Omolola
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereLola Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1 Ọgọọst 1976 Dezie
Ebe ọmụmụLagos Dezie
onye dị ịrịba amaMark Zuckerberg Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ntaakụkọ Dezie
ebe agụmakwụkwọColumbia College Chicago Dezie
ogo mmụtaBachelor of Arts Dezie
isi agụmakwụkwọoru nta akuko Dezie
ihe omume dị ịrịba amaNzukọ Dezie

Lola Omolola a muru ya n'ụbọchi nke mbụ nke ọnwa Ọgọst n'afọ 1976. Ọ bụbu onye nta akụkọ nke Nigeria mechara guzobe otu a kpọrọ 'Female IN'(FIN) na Fesibuku. Lola bụ nwaanyị Nigeria nke mbụ wepụtara ebe ụmụ nwaanyị nwere ike ikwupụta ihe bụ nsogbu ha tụmadi nke gbasara mmetọ nke ahụ akpọrọ 'sexual abuse'. E gosipụtara ọrụ ya na nzukọ nke Facebook F8 emere n'afọ 2018.


Agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Omolola gụrụ akwụkwọ praimarị na sekọndiri ya na Nigeria tupu ọ gaa mba America ebe ọ nọrọ nweta digiri na Broadcast journalism site na Columbia College dị na Chicago. [1]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Omolola rụburu ọrụ nta akụkọ na Nigeria ma nwekwaa ụfọdụ ihe nkiri ọ hụrụ maka ya bụ nke ya n'ọnyonyo. Ka ọ gụchara Mahadum ma nweta digiri, ọ rụrụ ọrụ na 'Community Counseling Centers di na Chikago, ebe ọ nọ enyere ndi na-aria ọria isi mgbaka maọbụ ndị uche ha ezughaghị oke. [1] Ọzọkwa Omolara rụrụ ndị ụlọ ọrụ 'apartments.com' mana kpebie na ya agaghị arụ ọzọ mgbe o bidoro mụwa ụmụaka. Nke a mere oji bido ụlọ ọrụ nke ya ọ kpọrọ spicebaby.com ebe ọ na-egosipụta akọrọngwa di iche iche eji esi nri ndi Nigeria na Nigeria. O guzobere otu a kpọrọ FIN (Female in Nigeria) na Fesibuku ebe ụmụ nwaanyị ga-ekwuputa mmekpa ahụ ha na-enwe na-emeghị ihere ọbụla. O mechara gbanwe aha ya ka ọbụrụ 'Female IN ij wee nabata ụmụ nwaanyị ndi ọzọ na abụghị ndi Nigeria. Otu a ka ọdị ugbu a nwere ndị otu kariri otu nde ụmụ nwaanyị n'ọnụ ọgụ. ọ naanị ndi otu a nwere ike ima ihe na-eme ebe ahụ. [2][3] [4][5][6] Ebumnuche Omolola bụ inyere ụmụ nwaanyị obibi ndụ na-ara ahụ mana ha ahụghị onye ga-enyere ha aka maọbụ onye ha ga-agwa n'ihi na Omenaala machibidoro nke a. N'obodo Nigeria nakwa ọtụtụ obodo ụmụ nwaanyị enweghị ọnụ okwu. Ya mere otu FIN bụ ebe ha nwere ike ikwu okwu ma nweta enyemaka.

Ihe mmezu[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe o guzobechara otu FIN, Omolola na Odogwu nwoke nwe Fesibuku bụ Mark Zuckerberg nwere nzukọ. Ha tụkọtara alo ka ụmụ nwaanyị si enweta nkwado site n'otu FIN. N'ajụjụ ọnụ ndị CNN, gbara Maazị Mark kelere Omolara ma jaa ya ike ka osi akwado ụmụ nwaanyị na enweghị ọnụ okwu ha nwee ọnụ okwu na Fsibuku. [7]Ugbu a Lola na-akwado ịrụpụta ebe di iche iche ụmụ nwaanyi nwere ike iga kwuputa nsogbu ha na enweghi onye ga enye ha nsogbu. [5]

Ebe nsinweta[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 "Lola Omolola Creates Network for a Million Women Through Facebook – Los Angeles Sentinel", Los Angeles Sentinel, June 1, 2017.
  2. "Over one million females IN!".
  3. "Mark Zuckerberg launches first ever Facebook Community Summit in Chicago", June 22, 2017.
  4. "Nigeria's secret Facebook women", June 15, 2017.
  5. 5.0 5.1 "I stopped sleeping when we started, says Nigerian founder of million-fold Facebook group – TheCable", TheCable, June 15, 2017.
  6. "The Zuckerberg Interview", CNN.