Louis Péringuey
| Ụdịekere | nwoke |
|---|---|
| Mba o sị | South Africa |
| Aha enyere | Louis, Albert |
| Onye edemede (zoology) | Péringuey |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 9 Ọktoba 1855 |
| Ebe ọmụmụ | Bordeaux |
| Ụbọchị ọnwụ ya | 20 Febụwarị 1924 |
| Ebe ọ nwụrụ | Cape Town |
| Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | English |
| Ọrụ ọ na-arụ | entomologist |
Louis Albert Péringuey MSc (French pronunciation: [lwi albɛʁ peʁɛ̃ɡɛ]; 9 Ọktoba 1855, Bordeaux - 20 Febụwarị 1924, Cape Town) bụ onye South Africa gụrụ entomology onye bụ ọkachamara na Coleoptera na prehistory.
Akụkọ ndụ
[dezie | dezie ebe o si]Péringuey bụ onye nchịkọta maka ọ́bankà ndị dị na Senegal, Gambia and Madagascar ruo afọ atọ, tupu ọ kwafee n'afọ 1879 gaa na Cape Town dị na Cape Colony, ebe ọ kuziri asụsụ French na South African College yana Diocesan College. Ọ rụrụ ọrụ dịka onye ọrụ afọ ofufo na Coleoptera dị na Ọ́bankà South Africa n'afọ 1882, ma mesịa ka afọ abụọ gasịrị, ghọọ onye òtù ndị ọrụ ndigide nke ọ́bankà ahụ. Ka oge na-adịghi anya gachara, ọ naakwara ọrụ ọzọ dịka onye nlekọta nke ogige vaịn. [citation needed]
Mgbe ọ gbara afọ iri atọ na asaa, ọ lụrụ Bertha Marcellis. Ka afọ atọ gasịrị, n'afọ 1895, e tinyere ya ka ọ bụrụ onye isi nlekọta nke nchịkọta anụ ndị na-enweghị okpụkpụ azụ, ma n'afọ 1896 ọ ghọzie osote onye isi nchịkwa nke ọ́bankà ahụ. Mgbe ọkwá onye isi nchịkwa tọgbọrọ n'efu n'afọ 1906 ka Sclater gbachara arụkwaghịm,òtù bọọdụ ndị nchịkwa egbughị oge ọbụla ịhọpụta Péringuey dịka onye isi nchịkwa. N'otu afọ ahụ, ọ malitere ịnye nkuzi na Forest Entomology na S.A. College, e wee nye ya nzere ọkankuzi na ngalaba Natural Sciences site na Mahadum Cape of Good Hope. N'agbanyeghị na ha enweghị ego, ọ́báǹkà ahụ nọgidere na nchịkọta, ime nnyocha na mbipụta akwụkwọ. Ịdị oke ọnụ nke ime njem pụtara na ndị na-eme njem mgbe ụfọdụ na-eji ụgbọ oloko, ịnyịnya maọbụ ehi. O mere ihe ntinye ndị dị mkpa na ngalaba physical anthropology, ma mepụta usoro plaster casts nke San iji detuo ọdịdị ile anya ha. [citation needed]
Ọbaṅkà jufere ókè mere ka mgbasa dị mkpa, mana mmalite nke Agha Ụwa nke Mbu kwụsịrị ọrụ niile a na-arụ. Péringuey rụgidere ndị isi ka ha zụta ụlọ ochie eji ígwè rụọ n'afọ 1922, nke mechara na-arụ ọrụ dịka ebe nchekwa ihe. [citation needed]
Péringuey gbara dimkpa ma dị ogologo, dị ike ma nwee obi ike. O nwere ikike dị ukwuu maka ịrụ ọrụ, na ikike icheta ihe dị egwu, mana ọ na-ewe iwe ọkụ ma bụrụ onye isi ike, na enweghị ntụkwasị obi n'ebe ndị ọkà mmụta nọ. Asị ọ kpọrọ ndị Germany mere ka ọ gụọ ụdị Bochus n'ezinụlọ Gryllacrididae, yana ụdị ya ka ọ bụrụ contemnendus (ya bụ 'German a na-eleda anya'). Mgbe otu onye ọchịchị Austria dezigharịrị ezinụlọ ahụ ọtụtụ afọ ka e mesịrị, a chọpụtara na taxon ahụ bụ otu ihe yana B. puncticeps, nke a sụgharịrị dị ka 'onye German nwere isi pịrị apị'.[1]
Na 20 Febụwarị 1924, ka ọ gbara afọ iri isii na itoolu, Péringuey nwụrụ n'akụkụ ọ́bankà ahụ dịka ọ na-aga ije ala ụlọ. [citation needed]
O dere Descriptive catalogue of the coleoptera of South Africa (1897) nakwa ọtụtụ akwụkwọ sayensị mkpirikpi ndị ọzọ na-akọwa taxa ọhụrụ. E kewara nchịkọta ya niile n'etiti Ọ́bankà Iziko South Africa , Ọ́báǹkà Transvaal, Museo Civico di Storia Naturale di Genova yana nchịkọta ndị nke German Entomological Institute.[citation needed]
Taxon A gụrụ aha ya
[dezie | dezie ebe o si]Ụdị ndị a gụrụ aha ya gụnyere
- Agụ owuru Peringuey (Cryptactites peringueyi) ,
- Adder Peringuey (Bitis peringueyi) ,
na
- the cocktail ant (Crematogaster peringueyi). [citation needed]
Taxon ọ kọwara
[dezie | dezie ebe o si]- Scelophysa trimeni (1885)
Ebe Nchekwa Ihe Ochie Stellenbosch
[dezie | dezie ebe o si]
N'afọ 1899, Péringuey chọpụtara Ngwá ọrụ nkume Paleolithic nke ụdị Acheulean na saịtị a na-akpọ Bosman's Crossing na nso Adam Tas Bridge n'ọnụ ụzọ ọdịda anyanwụ nke obodo Stellenbosch na South Africa. E guzobere ihe ncheta n'ebe ahụ n'afọ 1962 site n'aka Historical Monuments Commission nke nwere ederede a na-esonụ: [2] [3][4]
Edensibịa
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ iziko South African museum: Louis Albert Péringuey. media1.mweb.co.za. Archived from the original on 2013-10-20. Retrieved on 2017-11-14.
- ↑ Dempsey (19 October 1962). "The Archaeological Reserve". Information in Connection with the Municipality of Stellenbosch 1 (35): 7. Retrieved on 14 May 2014.
- ↑ Seddon (October 1966). "The Early Stone Age at Bosman's Crossing, Stellenbosch". The South African Archaeological Bulletin 21 (83): 133–137. DOI:10.2307/3888433.
- ↑ Deacon (1975). "Demography, Subsistence, and Culture During the Acheulian in Southern Africa", in Butzer: After the Australopithecines: Stratigraphy, Ecology, and Culture Change in the Middle Pleistocene, 543–570. ISBN 9783110878837.
- Anonym 1924 [Péringuey, L. A.] Entomologist's Monthly Magazine (3) 60 89
- Anonym 1925 [Péringuey, L. A.] So. African Journ. N. H. 5 1-8
- Howard, L. O. 1930 History of applied Entomology (Somewhat Anecdotal) Smiths. Miscell. Coll. 84 X+1-564.
- Poggi, R. & Conci, C. 1996 [Péringuey, L. A.] Mem. Soc. Ent. Ital. 75
Njikọ mpụga
[dezie | dezie ebe o si]- Louis Albert Péringuey: Onye nduzi nke South African Museum 1906 -1924 Wayback Machine (echekwara na July 18, 2011) Iziko
- Nkọwa - Nkọwapụta nke coleoptera nke South Africa / site na L. Péringuey. - Ọ́bá Akwụkwọ Ihe Nketa Biodiversity
- Louis Albert Péringuey 1855-1924 Mahadum Nebraska-Lincoln