M. Helena McMillan
M. Helena McMillan (1869 - Jenụwarị 28, 1970) bụ onye nkuzi nọọsụ nke obodo Canada na America.[1] O guzobere ụlọ akwụkwọ ogwugwo oria nke Presbyterian maka ndị nọọsụ na Chicago ma nọgide na-abụ onye nduzi ya ruo afọ 35.[2] N'afọ 1907, ọ rụrụ ọrụ dị mkpa n'ịgafe Iwu Nọọsụ mbụ nke Illinois.[3]
Akụkọ ndụ
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ M. Helena McMillan n'afọ 1869 na Montreal, Canada. Ọ gụsịrị akwụkwọ dị elu na Mahadum McGill . O mechara debanye aha na Ọzụzụ ụlọ akwụkwọ maka ndị nọọsụ na Illinois ebe ọ gụsịrị akwụkwọ n'afọ 1894. [3]
N'afọ 1898, ọ haziri ụlọ akwụkwọ ogwugwo oria nke Lakeside na Cleveland, Ohio, nke mesịrị ghọọ akụkụ nke Mahadum Western Reserve.[4]N'afọ 1903, ọ laghachiri na Chicago wee guzobe ụlọ akwụkwọ maka ndị nọọsụ nke Presbyterian nke nwere njikọ na Rush Medical College (RMC). [4][3]
N'afọ 1899, ọ ghọrọ onye otu kansụl maka ndi nọọsụ mba ụwa. [3] Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye isi oche mkpakọrịta ndi gụsịrị akwụkwọ na steeti nke Illinois . O nwere ọrụ nchịkwa dị mkpa na njikọ mba agụmakwụkwọ nke gụnyere ọfịs odeakwụkwọ ya, onye na-ahụ maka akụ, osote onye isi oche, na onye otu Board.[4] E jikọtakwara ya na mkpakọrịta ndị nọọsụ nke America. [5]
Ọ nwụrụ n' ọnwa Jenụwarị 28, afọ 1970, na obodo Boulder, Colorado,di na United Steeti.
- ↑ Bullough (1988). American Nursing: A Biographical Dictionary, Volume 1. New York City: Garland. ISBN 978-0-824-08540-7. Retrieved on April 8, 2023.
- ↑ McGann (December 9, 2004). New Directions in Nursing History: International Perspectives. Oxfordshire: Routledge. ISBN 978-1-134-40848-1. Retrieved on April 8, 2023.
- ↑ 3.0 3.1 3.2 3.3 Vana (March 29, 2021). Kelly Vana's Nursing Leadership and Management. Hoboken, New Jersey: John Wiley & Sons. ISBN 978-1-119-59663-9. Retrieved on April 8, 2023.
- ↑ 4.0 4.1 4.2 Killian (July 13, 2010). Zimbabwe Bound: A Woman's Journey through Africa. Bloomington, Indiana: University of Indianapolis Press. ISBN 978-1-880-93876-8. Retrieved on April 8, 2023.
- ↑ Lewenson (February 4, 2014). Taking Charge: Nursing, Suffrage, and Feminism in America, 1873-1920. Oxfordshire: Routledge. ISBN 978-1-135-80990-4. Retrieved on April 8, 2023.