Gaa na ọdịnaya

Mala Mohammed Daura

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Mala Mohammed Daura (amụrụ ya n'ọnwa Juun ụbọchị ịrị na atọ, n'afọ 1962) bụ onye gụrụ akwụkwọ na onye nchịkwa Naịjirịa. Ọ bụ osote onyeisi mahadum Yobe State, Damaturu kemgbe ụbọchị ịrị na otu n'ọnwa Jenụwarị, n'afọ 2020, mgbe gọvanọ steeti Yobe, Alhaji Mai Mala Buni họpụtara ya. Ọ bụ osote onyeisi mahadum nke anọ.[1][2]

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ ya na Daura ma si na Fune Local Government nke Yobe State, Daura malitere njem agụmakwụkwọ ya na Daora Primary School, Borno State, site n'afọ 1968 ruo n'afọ 1975. Ọ gara n'ihu na agụmakwụkwọ ya na Government Secondary School Damaturu, Yobe State, n'etiti afọ 1975 na afọ 1980. Daura gara agụmakwụkwọ ka elu na Mahadum nke Maiduguri, na-enweta akara ugo mmụta ya site n'afọ 1981 ruo n'afọ 1985. Ọ gụrụ nzere masta na Mahadum Southwestern nke Ibadan, site n'afọ 1987 ruo n'afọ 1988 wee mee nchọpụta post-doctoral ya na Laboratory for Experimental Geomorphology, Mahadum Katholieke Leuven Belgium, site n'ọnwa Machị n'afọ 1995 ruo Juun n'afọ 1995./

Ọrụ agụmakwụkwọ

[dezie | dezie ebe o si]

Daura malitere ọrụ nkuzi ya dị ka onye ntorobịa na Ngalaba nke Geography na Mahadum Ondo State, Ado-Ekiti, Ondo State, site n'afọ 1985 ruo n'afọ 1986. Ọ sonyeere Mahadum nke Maiduguri dị ka onye enyemaka gụsịrị akwụkwọ n'ọnwa Ọktoba ụbọchị abụọ , n'afọ 1986, mechaa ruo n'ọkwa prọfesọ n'ọnwa Ọktoba ụbọchị otu , n'afọ 2004. [3] Daura jere ozi dị ka onye ọsụ ụzọ nke Yobe State Polytechnic, Geidam, site n'ọnwa Nọvemba n'afọ 2002 ruo n'ọnwa Eprel n'afọ 2004. Ọ rụkwara ọrụ na Mahadum nke Maiduguri, gụnyere osote onye isi oche (Central Administration) site n'ọnwa Eprel ụbọchị ịrị na ise, n'afọ 2004, ruo n'ọnwa Ọgọst ụbọchị atọ , n'afọ 2008, na Ag. osote chancellor site n'ọnwa Mee ụbọchị ịrị na abụọ, n'afọ 2008, ruo n'ọnwa Junn ụbọchị abụọ, n'afọ 2009. Daura jere ozi dị ka osote onye isi nke Mahadum Maiduguri site n'ọnwa June ụbọchị atọ, n'afọ 2009, ruo n'ọnwa Junn ụbọchị abụọ, n'afọ 2014. Ọ rụrụ ọrụ dị ka prọfesọ nleta na Mahadum Nasarawa State, Keffi, na Mahadume Abuja. N'ikpeazụ, Daura ghọrọ onye nduzi na Centre for Disaster Risk Management and Development Studies (CDRM&DS). Amen Estate[3][4]

Daura bụ onye otu Association of Nigerian Geographers, Nigerian Geomorphological Working Group (NGWG), ma nwee mkpakọrịta na Institute of Industrialists and Corporate Administrators (FIICA) na Institute of Public Diplomacy and Management (FCIPDM). [3]

Edemsibịa

[dezie | dezie ebe o si]
  1. Saleh. "Prof Daura assumes duty as Yobe varsity VC", Daily Trust, dailytrust.com, 14 February 2020. Retrieved on 1 January 2024.
  2. Abubakar. "Gov Buni Appoints New VC For Yobe Varsity", independent.ng, 2 January 2020. Retrieved on 1 January 2024.
  3. 1 2 3 Dalhatu. "Prof Daura Takes Over From Prof Mukhtar As VC, Yobe State University, Damaturu", Education Monitor News, educationmonitornews.com, 24 April 2020. Retrieved on 1 January 2024.Dalhatu, Muhammad (24 April 2020). "Prof Daura Takes Over From Prof Mukhtar As VC, Yobe State University, Damaturu". Education Monitor News. educationmonitornews.com. Retrieved 1 January 2024.
  4. Saleh. "Prof Daura assumes duty as Yobe varsity VC", Daily Trust, dailytrust.com, 14 February 2020. Retrieved on 1 January 2024.