Manasseh Nshuti
Manasseh Nshuti | |
|---|---|
| Minister of State for Foreign Affairs, Regional Cooperation and EAC affairs | |
| In office May 2020 – September 2023 | |
| Prime Minister | Édouard Ngirente |
| Preceded by | Olivier Nduhungirehe |
| Succeeded by | James Kabarebe |
| Minister of Finance | |
| In office 2005–2006 | |
| Prime Minister | Bernard Makuza |
| Preceded by | Donald Kaberuka |
| Succeeded by | James Musoni |
| Personal details | |
| Citizenship | Rwanda |
| Nationality | Rwandan |
| Alma mater | Makerere University University of Aberdeen |
| Occupation |
|
Manasseh Nshuti bụ onye mba Rwanda na-ahụ maka ego, onye ọchụnta ego, ọkà mmụta na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọ rụrụ ọrụ dịka Minista nke steeti maka ihe gbasara obodo ndị dị n'ebe Ọwụwa Anyanwụ nke mba Afrịka na kansụl Rwandan site n’ọnwa Mee nke oge afọ 2020 ruo ọnwa Septemba nke oge afọ 2023.[1] Ọ nọrọ dịka Onye isi oche nke Mahadum Kigali (2013-2020). [1]
Mbido ndụ na agụmakwụkwọ
[dezie | dezie ebe o si]Nshuti nwere nzere bachelọ nke azụmahịa na Mahadum Makerere, di na mba Uganda. Mahadum Aberdeen, nkw di na mba Scotland nyere ya nzere nke abụọ, Master of Business Administration, na Accounting. O nwekwara nzere Doctor of Philosophy na Finance, nke ọ nwetara na Mahadum nke di na Aberdeen.[2]
Site n’oge afọ 2013 ruo oge afọ 2020, Nshuti jere ozi dịka Onye isi oche nke Mahadum Kigali, mahadum onwe onye o nyere aka chọta.[3]
Ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]Nshuti kụziri ihe na Mahadum Strathmore dị na mba Nairobi, Kenya ruo afọ iri na anọ. Afọ asaa ọzọ ka ọ nọrọ na-akụzi ma na-achịkwa na Mahadum Katọlik nke Ọwụwa Anyanwụ mba Afrịka, kwa na Nairobi nke mba Kenya. Ọ kụzikwaara na Mahadum Aberdeen ruo afọ abụọ, mgbe ọ na-agbaso nzere doctorate ya.[3]
Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị
[dezie | dezie ebe o si]Nshuti jere ozi na Cabinet nke mba Rwanda site na oge afọ 2003 ruo oge afọ 2005, dịka Minista nke Azụmaahịa, Ụlọ Ọrụ, Nkwalite Ntinye ego, Njem na Cooperatives. A kpọfere ya na Ministry of Finance n'oge afọ 2005, ọ nọchiri anya Donald Kaberuka, [4] onye a họpụtara dịka onye isi oche nke African Development Bank. [2]
N'oge afọ 2006, a họpụtara ya ka ọ bụrụ Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ ọha na eze na ọrụ, na-eje ozi n'ebe ahụ ruo n'oge afọ 2008, mgbe a kpọrọ ya onye ndụmọdụ akụ na ụba nke onye isi ala mba Rwanda. Ruo oge ụfọdụ, n'etiti oge afọ 2008 na oge afọ 2013, Nshuti jere ozi dịka Onye isi oche nke Crystal Ventures Limited, akụkụ azụmahịa nke Ndị agha Rwanda. [2]
N'ọnwa Mee nke oge afọ 2020, ọ weghaara ngalaba East African Community, na-anọchi Olivier Nduhungirehe, onye a chụpụrụ na kansụl, na ụbọchi iri nke ọnwa Eprel n’oge afọ 2020, maka "ịkwado echiche nke onwe ya n'ihu iwu gọọmentị. " [2] Ọ bụ ọrụ ya iduzi mgbalị iji weghachite mmekọrịta dị mma na Uganda agbata obi ya, nke mebiri emebi n'ime oge afọ abụọ ruo nke atọ gara aga.[1]
Edensibia
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ 1.0 1.1 1.2 Ivan Mugisha (1 May 2020). Rwanda names new EAC minister. Retrieved on 3 May 2020.Ivan Mugisha (1 May 2020). "Rwanda names new EAC minister". The EastAfrican. Nairobi. Retrieved 3 May 2020.
- ↑ 2.0 2.1 2.2 2.3 Taarifa Rwanda (30 April 2020). Kagame Appoints Nshuti Manasseh For EAC Portfolio, Who Is He?. Archived from the original on 25 February 2022. Retrieved on 3 May 2020.Taarifa Rwanda (30 April 2020). . Taarifa Rwanda. Kigali. Archived from the original on 25 February 2022. Retrieved 3 May 2020.
- ↑ 3.0 3.1 University of Kigali (2019). Profile of Professor Manasseh Nshuti, Chairman of the University of Kigali. University of Kigali. Archived from the original on 26 February 2022. Retrieved on 3 May 2020.University of Kigali (2019). . Kigali: University of Kigali. Archived from on 26 February 2022. Retrieved 3 May 2020.
- ↑ The rise of the economic technocracy in Rwanda: A case of a bureaucratic pocket of effectiveness or state-building prioritisation?. Archived from the original on 2020-03-07.