Gaa na ọdịnaya

Maranboy

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ebe a na-egwupụta Tin dị na Maranboy

Maranboy bụ ebe a na-egwupụta tin dị nso na Barunga, ihe dị ka kilomita iri asaa n'ebe ọwụwa anyanwụ Katherine na mpaghara mgbago ùgwù Australia.[1]

Ntọala maọbu Nhiwe Ya

[dezie | dezie ebe o si]

Ndị Aborigine dị ka ndị Jawoyn ebiela n'ógbè gbara Maranboy gburugburu ọtụtụ puku afọ. N'oge ndị Europe biri n'afọ 1869 na Palmerston, bụ Darwin Ugbu a, ewerela ọtụtụ n'ime akụ ndị ọzọ dị na mba ahụ mee ihe. Ya mere, ohere ọhụrụ nke igwupụta ihe mere ka mmepe dị ngwa n'ebe ugwu.[2]

Tim O'Shea chọtara ọ̀dọ́ tin n'ógbè ahụ na 1910, onye na-azụ anụ si Pine Creek, mana ọ dịghị mgbe ọ debanyere aha.[2] Na Septemba 1913, a mara Maranboy dị ka ebe a na-egwu ọlaedo ruo afọ abụọ.[3]

Ndị na-achọ ihe bụ Scharber na Richardson chọpụtara tin na Maranboy n'afọ 1913. [4][5] Ebe a na-egwupụta tin na batrị nọọrọ na-arụ ọrụ n'otu afọ ahụ.[6]

Ka ọ na-erule afọ 1918, ọnụahịa tin nọ na-arị elu.[7]

Batrị ahụ mechiri n'afọ 1949 maka nrụzi mana emegheghị ya ọzọ.[8]

Ndị ọrụ

[dezie | dezie ebe o si]

Ndị na-achọ ihe ndị si Europe, China na Aborigine rụrụ ọrụ na Maranboy. Otu n'ime ndị ọrụ a bụ Harold Snell, onye mechara wuo ọtụtụ ụlọ dị mkpa na Darwin, onye ọzọ bụ Eustratios Georgiou Haritos onye bụ onye mbịarambịa Gris mbụ eweere n'ọrụ n'ebe ahụ.

Batrị ahụ mechiri na 1949 maka nrụzi mana emegheghị ya ọzọ.[9]

Ọtụtụ n'ime ndị Aborigine na-arụ ọrụ n'ebe ahụ a na-egwupụta ihe laghachiri Beswick Creek (mesịrị bụrụ Barunga).

Edensibia

[dezie | dezie ebe o si]
  1. Barunga. Roper Gulf Regional Council. Retrieved on 12 August 2016.
  2. 2.0 2.1 Harlow (1997). Tin gods: a social history of the men and women of Maranboy 1913-1962. Darwin, N.T.: Historical Society of the Northern Territory. ISBN 0959970282.  Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "Tin gods" defined multiple times with different content
  3. "PROCLAMATION.", Northern Territory Times and Gazette, 2 October 1913, p. 8. Retrieved on 10 August 2016.
  4. "Maranboy Tinfield.", Northern Territory Times and Gazette, 5 October 1918, p. 12. Retrieved on 10 August 2016.
  5. Mining in the early Commonwealth years - Commonwealth Government Records about the Northern Territory. Archived from the original on 30 March 2018. Retrieved on 30 July 2018.
  6. "Mining News", Northern Territory Times and Gazette, 11 May 1918, p. 7. Retrieved on 10 August 2016.
  7. "MINING NEWS", Northern Territory Times and Gazette, 11 May 1918, p. 7. Retrieved on 10 August 2016.
  8. "Living on Credit Maranboy Battery Still Closed Mines Dept. Inefficiency", Northern Standard, 16 December 1949, p. 1. Retrieved on 12 August 2016.
  9. "Living On Credit Maranboy Battery Still Closed Mines Dept. Inefficiency", Northern Standard, 16 December 1949, p. 1. Retrieved on 12 August 2016.