Gaa na ọdịnaya

Margaret Levyns

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Margaret Rutherford Bryan Levyns (a mụrụ n'ezinụlọ Michell, 24 Ọgọst 1890 Cape Town - 11 Nọvemba 1975 Cape Town) bụ onye phytogeographer , onye na-ahụ maka akụmakụ na onye na-ahụ maka ikpọ ihe aha ama ama na South Africa.

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ

[dezie | dezie ebe o si]

Margaret Levyns bu ụzọ gụọ akwụkwọ n'ụlọ site n'aka nne ya ma mesịa gaa Ellerslie Girls' School. O nwetara akara ugo mmụta na klas mbụ ma nye ya nkwado ego ụzọ abụọ. N'afọ 1908, ọ debanyere aha na Kọleji South Africa na-ezube ịmụ mgbakọ na mwepụ, geology na kemịstrị, na ọmụmụ maka akụmakụ maka afọ nsọpụrụ ya. Prọfesọ Harold Pearson rụgidere ya ka o kwenye iwere ọmụmụ maka akụmakụ dị ka isi ihe ọmụmụ ya. Mgbe ọ nwetasịrị agụmakwụkwọ uzọ abụọ n'efu, Queen Victoria Scholarship yana 1851 Exhibition Memorial Scholarship ma nọrọ site n'afọ 1912 ruo 1914 na Newnham College, ọ laghachiri South Africa a ma nye ya ohere agụmakwụkwọ n'efu ọzọ na John Innes Institute ebe ọ họọrọ ịmụ gbasara mkpụrụ ndụ ihe nketa. Mgbe ọ laghachiri South Africa nke ugboro abụọ, ọ malitere ọrụ nkuzi na Ngalaba Botany na South African College nke mesịrị ghọọ Mahadum Cape Town. Ọ bụ nwanyị mbụ natara nzere D.Sc. na Mahadum Cape Town, maka edemede ya nke afọ 1932 'A taxonomic study of Lobostemon and Echiostachys'. Akwụkwọ ya gụnyere A Guide to the Flora of the Cape Peninsula na 1929, na akụkụ dị ukwuu nke Flora of la Cape Peninsula nke Adamson & Salter dere n'afọ 1950.

Mgbe ọ lara ezumike nká n'afọ 1945, ọ nọgidere na-arụsi ọrụ ike na ngalaba ọmụmụ akụmakụ ma bipụta ọtụtụ akwụkwọ na taxonomy na phytogeography. Ọ dezigharịrị ọtụtụ ụdị South Africa dịka Muraltia. N'afọ 1923, ọ lụrụ John Levyns, onye mechara bụrụ osote odeakwụkwọ mpaghara nke Cape Province na onye jere ozi na kansụl nke Botanical Society of South Africa.

A na-echeta Margaret Levyns na Thamnochortus levynsiae Pillans, Nivenia levynsiae e H. Weimarck na Crassula levynsiae Adamson. E tinyere ihe dị ka puku iri na abụọ n'ime ihe ndị ọ chịkọtara na Bolus Herbarium (BOL) dị na Cape Town, Ebe Nchekwa akụmakụ mba "PRE" dị na Pretoria, Royal Botanic Gardens Kew (K) na ebe nchekwa as akụmakụ ndị ọzọ. A na-eji mkpirisi odee Levyns egosi onye ọkà mmụta ihe ọkụkụ a mgbe a na-ezo aka na aha ihe ọkụkụ.[1]

Nkwanye Ùgwù na Ihe Nrite

[dezie | dezie ebe o si]
  • Onye isi oche nke ngalaba B nke South African Association for Advancement of Science 1952/53
  • Ihe nrite South Africa 1958
  • Onye isi oche nke Royal Society of South Africa 1962/63 (nwaanyị mbụ nọrọ n'oche a)
  • Usoro oge nke ụmụ nwanyị na sayensị

Edensibịa

[dezie | dezie ebe o si]
  1. Brummitt (1992). Authors of Plant Names. Royal Botanic Gardens, Kew. ISBN 1-84246-085-4. 

Njikọ mpụga

[dezie | dezie ebe o si]