Marguerite Archie-Hudson
Marguerite Archie-Hudson | |
|---|---|
| Member of the California State Assembly from the 48th district | |
| In office December 3, 1990 – November 30, 1996 | |
| Preceded by | Maxine Waters |
| Succeeded by | Roderick Wright |
| 17th President of Talladega College | |
| In office 1998–2001 | |
| Succeeded by | Henry Ponder |
| Personal details | |
| Born | Marguerite Archie 18 Novemba 1937 Yonges Island, South Carolina, U.S. |
| Political party | Democratic |
| Education | Talladega College, Harvard University, University of California, Los Angeles |
Marguerite Archie-Hudson (a mụrụ n'ọnwa Novemba n'ubochi 18, n'afọ 1937) bụ onye America bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na onye nchịkwa agụmakwụkwọ. Ọ jere ozi dịka onye democrat na Mgbakọ steeti California site na mpaghara 48th, site na 1990 ruo 1996.[1][2] Ọ rụkwara ọrụ dị ka onye isi nke ụlọ akwụkwọ ọ gụsịrị akwụkwọ na ya, bụ́ Talladega College, ma bụrụkwa nwanyị mbụ bụ́ onye Afrika Amerịka duziri ụlọ akwụkwọ agụmakwụkwọ ka elu nke afọ anọ n'akụkọ ihe mere eme nke steeti Alabama.[3]
Akụkọ ndụ
[dezie | dezie ebe o si]Ọ gụrụ akwụkwọ na Talladega College (ebe ọ nwetara nzere BA n'afọ 1958) ma mụọ gbasara akparamàgwà mmadụ (psychology); na Harvard University (ebe ọ nwetara nzere MA n'afọ 1962) n'ihe gbasara agụmakwụkwọ na ndụmọdụ; o nwetakwara nzere PhD na University of California, Los Angeles (UCLA).[3]
Ọ rụrụ ọrụ na California State Assembly site n'afọ 1990 ruo mgbe oge ọrụ ya kwụsịrị n'afọ 1996 n'ihi oke oge a kara aka maka ọkwa ahụ. N'oge ahụ, ọ bụ onye otu California Legislative Black Caucus.[4]
Site na 1998 ruo 2001, Archie-Hudson jere ozi dị ka onye isi nke ụlọ akwụkwọ ochie ya, bụ́ Talladega College, na Talladega, Alabama.[3][5] Ọ bụ nwanyị mbụ bụ onyeisi oche nke Talladega College n'akụkọ ihe mere eme nke ụlọ akwụkwọ; ọ bụkwa nwanyị mbụ bụ onye Afrịka-Amerịka nke chịrị ụlọ akwụkwọ mahadum afọ anọ n'akụkọ ihe mere eme nke steeti Alabama.[3][5] N'oge ọ bụ onyeisi ụlọ akwụkwọ, ọ mụbara ndebanye aha ụmụ akwụkwọ ma belata ụgwọ mahadum, mana emeghị ka nkwekọrịta ya dị ọhụrụ na 2001.[3][6] Henry Ponder nọchiri ya dị ka onye isi oche nwa oge.[6]
Edensibia
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ "LOCAL ELECTIONS : 48TH ASSEMBLY DISTRICT : Despite Residency Flap, Farrell Proves Tough for Archie-Hudson". Articles.latimes.com. 1990-06-03. Retrieved 2018-04-23.
- ↑ "LOCAL ELECTIONS / 48TH ASSEMBLY DISTRICT : 4 Democrats Wrestle in Redrawn Area". Articles.latimes.com. 1992-05-30. Retrieved 2018-04-23.
- 1 2 3 4 5 "Marguerite Archie–Hudson". Encyclopedia.com. Retrieved 2023-06-15.
- ↑ "Past members of the California Legislative Black Caucus".
- 1 2 Ebony (in Bekee). Vol. 56. Johnson Publishing Company. October 2001. p. 14. ISSN 0012-9011.
- 1 2 "Talladega College Names Interim Leader, After Letting President Go at Start of Academic Year". The Chronicle of Higher Education (in Bekee). 2001-10-11. Retrieved 2023-06-15.