Marie-Claire Faray
Marie-Claire Faray bụ onye na-ahụ maka ụmụ nwanyị si Democratic Republic of the Congo.
Mbido ndụ na agụmakwụkwọ
[dezie | dezie ebe o si]Faray nwetara nzere Bachelor nke sayensị na Mahadum Metropolitan nke London ma gụsịrị akwụkwọ na London School of Hygiene and Tropical Medicine na Master of Science. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ, ọ gara Mahadum Queen Mary nke London ịrụ ọrụ mgbe ọ na-emecha PhD ya.[1]
Ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]Faray na-arụ ọrụ dị ka onye ndụmọdụ ozi ahụike na onye nyocha sayensị na ọrịa na-efe efe na Mahadum Queen Mary nke London na Barts Hospital.[2] Faray na-akwado ịmepụta ntuziaka mba ụwa nke na-asọpụrụ iwu na gọọmentị site na mkpọsa megide ime ihe ike megide ụmụ nwanyị n'Africa, yana maka udo na ihe ndị ruuru mmadụ. [3][4]
Faray na-etinye aka n'ịkwalite Protocol Maputo maka ikike ụmụ nwanyị Africa. Otu n'ime ebumnuche ya bụ iji hụ na ikike mmadụ bụ isi maka ụmụ nwanyị niile na nchekwa ha na nkwekọrịta nke Isiokwu nke atọ, ịrị na asaa , ịrị na asatọ, ịrị na itọọlu na ịrị abụọ nke Universal Declaration of Human Rights gafee Africa site n'afo pụkụ abụọ na ịrị abụọ dị ka akụkụ nke African Women's Decade movement.[3] Ọ bụ osote onye isi oche nke UK nke Women's International League for Peace and Freedom, ma nọ na kọmitii na-ahụ maka Common Cause UK, ikpo okwu nke na-akwalite ụmụ nwanyị Congo na mba UK. [4][2] Ọ bụkwa onye otu Million Women Rise . [3] Ọ bụkwa onye otu UK nke Million Women Rise, njikọ mba nke ụmụ nwanyị. n'ubochi ịrị na isii n'onwa Disemba n'afọ pụkụ abụọ na asaa, na Faray jiri enyemaka abụọ ndị ọzọ guzobe alaka nke WILPF na isi obodo Congo nke Kinshasa.
Mba Ndị Dị n'Otu
[dezie | dezie ebe o si]Faray gara United Nation's 2008 Biennial Meeting of States iji kwurịta mmekọrịta dị n'etiti obere ngwá agha na ime ihe ike megide ụmụ nwanyị n'Afrika.[5]
Ndụ onwe onye
[dezie | dezie ebe o si]Faray na ụmụ ya nwanyị abụọ bi na mba London.[3]
Edemsibịa
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ GUEST SPEAKERS. metimun2011.weebly.com. Retrieved on 20 November 2016.
- ↑ 2.0 2.1 Jan 30 – Marie Claire Faray – Congolese Women's Resistance, Past and Present. Congolive.org (30 January 2016). Retrieved on 25 March 2016. Kpọpụta njehie: Invalid
<ref>tag; name "CL" defined multiple times with different content - ↑ 3.0 3.1 3.2 3.3 Our March Interview with Marie Claire Faray-Kele. Makeeverywomancount.org (1 March 2011). Retrieved on 25 March 2016. Kpọpụta njehie: Invalid
<ref>tag; name "MEWC" defined multiple times with different content - ↑ 4.0 4.1 'Give African women a voice,' say activists. CNN (30 November 2012). Retrieved on 25 March 2016. Kpọpụta njehie: Invalid
<ref>tag; name "CNN" defined multiple times with different content - ↑ TALKS CONCLUDE ON MARKING, TRACING ILLEGAL SMALL ARMS, LIGHT WEAPONS, AS BIENNIAL MEETING OF STATES SEEKS TO STRENGTHEN POLITICALLY-BINDING GLOBAL INSTRUMENT. un.org. Retrieved on 20 November 2016.