Gaa na ọdịnaya

Mohamed Abdulkarim Ali

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Mohamed Abdulkarim Ali bụ onye edemede si Somalia nke bi na Canada . Ali dere akwụkwọ mbụ ya, akwụkwọ ncheta, Angry Queer Somali Boy, mgbe ọ bi n'ebe obibi maka ndị na-enweghị ebe obibi na Toronto.

Ndụ mbido

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Ali n'ezinụlọ ọdịnala Somalia na Somalia n'afọ 1985.[1] Nna ya, onye ya na nne ya kewapụrụ kpọọrọ ya n'aka nne ya mgbe ọ dị obere, Ali wee soro nna ya, nwunye ọhụrụ nna ya, na ụmụnne ya nwanyị nwanyị ndị ọzọ biri na Abu Dhabi. Nwunye ọhụrụ nna ya ji okwu ụgha tinye akwụkwọ ka- anabata ya dịka onye gbara ọsọ ndụ na Netherlands.

Mgbe ọ ka bụ onye ntorobịa, ezinụlọ ya kwagara Canada. Ali nwere nsogbu site na iji ọgwụ ọjọọ na mmanya na-aba n'anya eme ihe.[2]

Ọrụ ide ihe

[dezie | dezie ebe o si]

<i id="mwMQ">CBC</i> kọwara akwụkwọ ya n'otu edemede gbasara akwụkwọ ndị dị mkpa gbasara ahụike uche.

The Advocate kọwara akwụkwọ ya n'otu edemede na "The Best LGBTQ Memoirs of 2019".

<i id="mwQA">CBC</i> tinyere akwụkwọ ya na ndepụta ha akwadoro ka a gụọ n'oge oyi nke afọ 2020.

Edensibịa

[dezie | dezie ebe o si]

 

  1. ↑ "Mohamed Abdulkarim Ali". uofrpress.ca. Retrieved 2020-11-30.
  2. ↑ "Exile, addiction and racism: what it means to be a gay, Muslim immigrant | CBC Radio". CBC (in Bekee ndị America). Retrieved 2020-11-19.