Gaa na ọdịnaya

Morocco Maduka

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Morocco Maduka
mmádu
Ụdịekerenwoke Dezie
Mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1947 Dezie
Ebe ọmụmụAnambra State Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya2020 Dezie
Ebe ọ nwụrụAnambra State Dezie
Asụsụ obodoAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaAsụ̀sụ̀ Ìgbò, English Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye egwu Dezie
Ụdị ọrụ yamusic Dezie
Nnọchiaha nkeonweL485 Dezie

Chief Dr Chukwuemeka Morocco Maduka (amụrụ ya n’afọ 1944-ọ nwụọ n’afọ 2020) bụ onye egwu highlife Naijiria nke a maara nke ọma maka ụdị egwu ya Egwu Ekpili, nke mere ka ọ nweta aha "Eze Egwu Ekpi" (Eze nke Egwú Ekpili).

A mụrụ ya na ọnwa Eprel n’ụbọchi asaa, n’ohe afọ 1945, Ukwulu, Dunukofia Local Government Area nke di na Anambra Steetị, Nigeria, nke bụkwa obodo nna nna ya.

Ọ malitere njem egwu nke ya mgbe ọ dị afọ iri na abụọ. Otú ọ dị, nna ya na mbụ megidere ihe egwu ya, na-atụ egwu na ọ ga-eduga na ndụ mpụ. Kama nke ahụ, nna ya chepụtara ụzọ ọzọ ka mma maka ya, na-achọ ka ọ bụrụ dọkịnta maọbụ onye ọka iwu.[1]

Site na ọrụ karịrị afọ iri isii, Chief Emeka Morocco Maduka wepụtara abọm mbụ ya, "Aya Nigeria" (Nigerian War), n’oge afọ 1971, wee gaa n'ihu na-emepụta abọm ruru nọmba 120 dị egwu n'oge ọrụ ya niile. Ọ ka na-arụsi ọrụ ike na egwu ruo mgbe oge ọ nwụrụ, na-eme atụmatụ iwepụta abọm ọhụrụ na ọbụna na-eme ihe omume akụkọ ihe mere eme iji mee ka afọ iri isịị ya pụta ìhè n'ọkwa n’ogd afọ 2020. [2][3]

Ndụ onwe onye

[dezie | dezie ebe o si]

Morocco lụrụ nwunye ya bụ, Bridget Ifeonugekwu maduka, ma nwee ezinaụlọ nwere ụmụ asatọ, nke nwere ụmụ nwoke anọ na ụmụ nwanyị dikwazi anọ.[2]

Ọnwụ

[dezie | dezie ebe o si]

Ọ nwụrụ n'mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Ọktoba n'oge afọ 2020, mgbe ọ dịzikwa afọ iri asaa na isii.[4][5] Onye bụbu Gọvanọ nke Anambra steeti bụ, Peter Obi, ndị otu Performing Musicians Association of Nigeria PMAN sitere na isi dị iche iche na ndị ọzọ nọ n'ọkwá dị elu gbakọtara iji kwanyere onye na-ese egwu ùgwù ikpeazụ.[6][7]

Edensibia

[dezie | dezie ebe o si]
  1. Nigeria (2020-05-16). 60 years on stage: Mixed bag of puzzle, fairy tale for Morocco Maduka (en-US). The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News. Retrieved on 2024-11-28.
  2. 1 2 Rapheal (2020-11-13). Chukwuemeka Morocco Maduka (1944 - 2020) (en). The Sun Nigeria. Retrieved on 2024-11-28.Rapheal (2020-11-13). "Chukwuemeka Morocco Maduka (1944 - 2020)". The Sun Nigeria. Retrieved 2024-11-28.
  3. Afripol (2022-06-09). How Nigeria’s Igbo highlife music provided hope after a devastating civil war (en). Global Voices. Retrieved on 2024-12-02.
  4. Chukindi (2020-11-01). Morocco: Anambra govt mourns renowned highlife musician, Maduka (en-US). Daily Post Nigeria. Retrieved on 2024-11-28.
  5. Highlife musician, Chief Morocco Maduka is dead (en-US). Retrieved on 2024-11-28.
  6. Egwu Ekpiri Legend Emeka Morocco Maduka Laid To Rest At Ukwulu Dunukofia Council Area (en-US). Heartbeat Of The East. Archived from the original on 2024-12-02. Retrieved on 2024-11-29.
  7. Chukindi (2020-11-01). Morocco: Anambra govt mourns renowned highlife musician, Maduka (en-US). Daily Post Nigeria. Retrieved on 2024-11-29.