Moses Simon

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Moses Simon
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
obodo maka egwuregwuNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoMoses Simon Dezie
Aha ọmụmụMoses Daddy Simon Dezie
Aha enyereMoses Dezie
aha ezinụlọ yaSimon Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya12 Julaị 1995 Dezie
Ebe ọmụmụJos Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye otu egwuregwu bọọlụ Dezie
ọnọdụ egwu na otu / ọpụrụichegaa n'ihu Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2014 Dezie
ụdị egwuregwuFootbọl Dezie
nọmba egwuregwu27 Dezie
so na2019 Africa Cup of Nations, Iko Mba Afrịka nke 2021 Dezie

Moses Daddy-Ajala Simon (a mụrụ na abalị iri na abụọ nke ọnwa Julaị n'ime otu puku afọ na narị iteghete na iri iteghete na ịse (1995) bu onye Naijiria bụ okacha mara n'egwuregwu bọọlụ nke na-agba ihu na otu egwuregwu Nantes Ligue 1 na otu egwuregwu mba Nigeria . [1]

Ọrụ klọb[dezie | dezie ebe o si]

Ọrụ mmalite[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ na Jos, nna ya jere ozi na ndị agha Naịjirịa tupu ọ laa ezumike nka. Simon bụ ngwaahịa sitere na GBS Academy a ma ama, otu ụlọ akwụkwọ egwuregwu bọọlụ ahụ na Nigeria nke zụpụtara ndị dika Ahmed Musa . [2] E jikọtara ya na ụlọ ọgbakọ Premier League nke Nigeria Kaduna United, n'ihi na ọtụtụ klọb ndị ọkachamara n'ụwa niile chọkwara ịbịnye aka na ya. [3] Na abalị iri nke ọnwa May ọfọ puku abụọ na ịrị na atọ (2013), a mara ọkwa na Simon abanyela na nkwekọrịta ya na otu egwuregwu Dutch AFC Ajax isonyere ha na ọzụzụ oge tupu oge, ebe e jikọtaburu ya na Liverpool FC na Tottenham Hotspur . [4] Ọ pụtara ìhè nke mbụ ya maka Ajax na abalị iri na atọ nke ọnwa Julị na afọ puku abụọ na ịrị na atọ (2013) na asọmpi nkwado nke enyi megide De Graafschap, na-abata dị ka onye eji gbanwe onye ọzọ ma sụnye ọkpụ goolu nke abụọ na nke ikpeazụ, na mmeri goolu atọ asatara nanị otu. Ọ pụtarakwara ọzọ na abalị iri na asaa nke ọnwa Julaị, gbaara ndị ọnọ na oche Jong Ajax na egwuregwu enyi na enyi nkwado oge megide Voorschoten '97, ebe ọ sụnyere goolu nke abụọ na mmeri ụlọ ha nwetara site na ọkpụ goolu ise asaghị asa. [5] Na ịrị abụọ na ise nke ọnwa Julaị, afọ puku abụọ na ịrị na atọ, a mara ọkwa na otu egwuregwu Ajax agaghị ebinye aka na akwụkwọ ịkọrọ nwa okorobịa Naijiria a, ma hapụ ya site na nchịkọta oge tupu oge. [6] Mgbe mkparita ụka nke nkwupụta a bidorochara ha na AS Trenčín; otu egwuregwu ha na Ajax na emekọri na Slovakia nke onye nwe ya bụ onye gbagburu Ajax bọọlụ Tschen La Ling. [7]

AS Trenčín[dezie | dezie ebe o si]

Na abalị iri na atọ nke ọnwa Jenụwarị afọ puku abụọ na ịrị na anọ (13 Jenụwarị 2014), Simon bịanyere aka na nkwekọrịta afọ atọ na otu egwuregwu AS Trenčín . [8] [9] nKe Slovak.Ọ ga-eso onye ogbo ya Kingsley Madu . O mere egwuregwu mpụta mbụ ya na asọmpi ha gbara otu ọkpụ otu ọkpụ megide MFK Košice malite na nku aka nri ya na Gino van Kessel onye nọ lonu sitere na otu egwuregwu Ajax. [10] O mere mpụta mbụ nke mba ụwa na klọb ya n'oge mkpọsa Trenčín's 2014–15 UEFA Europa League, mgbe ewebatara ya n'oge asọmpi mbido nke abụọ, na egwuregwu ụlọ megide Vojvodina Novi Sad si Serbia (nke e gwuritara na ama egwuregwu dị na Dubnica, Slovakia) Simon sụnyere okpu goolu atọ na mpụta mbụ ya na mmeri ha ji ọkpụ anọ asaghị asa wee merie n'ụlọ. Dika Trenčín ga-emecha kpochapụ na agba na-esote, n'ihi enwetaghi mmeri n'ụlọ, nakwa mmeri ndị otu Hull City . jiri ọkpụ goolu abụọ asatara otu merie ha n'ụlọ nke ha.

Na ọnwa Octooba afọ puku abụọ na ịrị na anọ (October 2014) egwuregwu ESPN kwadoro akụkọ nnyocha maka Moses Simon nke jikọtara ọgba ákụkụ ahụ na ịkwaga otu egwuregwu Liverpool, Tottenham Hotspur, Hull City tinyere nnukwu ihe nnweta nyere otu egwuregwu Ajax. [11] Ọnọdụ ahụ ghọrọ nnukwu agha n'etiti Dutch club SC Heerenveen na KAA Gent, nke otu egwuregwu nke abụọ ahụ mesịrị nwee nkwekọrịta ka ọgba ákụkụ ahụ sonyeere otu egwuregwu ha afọ atọ.[12]

Gent[dezie | dezie ebe o si]

Simon na KAA Gent, 2015

Na abalị isii nke ọnwa Jenụwarị afọ puku abụọ na ịrị na ịse (6 Jenụwarị 2015), a mara ọkwa na KAA Gent abịanyela aka na akwụkwọ maka Moses Simon na nkwekọrịta afọ atọ. [13] Ọ mere mpụta mbụ ya maka Gent na abalị iri na asaa nke ọnwa Jenụwarị afọ puku abụọ na ịrị na ise (17 Jenụwarị 2015) na mmeri ọkpụ atọ asatara otu (3–1) megide Royal Mouscron-Péruwelz na egwuregwu liigi. [14] Mpụtara ya nke abụọ mere ụbọchị anọ ka e mesịrị na mmeri ụlọ ha ji otu ọkpụ asaghị asa meria Sporting Lokeren na Iko ndị Belgian , bụ nke a chụpụrụ Simon na tinkọm tinkọm ole e jiri webata ya.. [15] N'egwuregwu liigi nke atọ ya megide Sporting Lokeren, Simon sụnyere ọkpụ goolu atọ, nke mere e jiri kpọọ ya onye ọkpụkpọ egwuregwu Belgium nke izu ahụ. Ọ ghọrọ onye ọkpụkpọ isi ngwa ngwa na nhazi onye nchịkwa Hein Vanhaezebrouck wee nyere Gent aka imeri aha asọmpi mba mbụ ha na Mee afọ puku abụọ na ịrị na ise. Ọnwa abụọ ka e mesịrị, Simon nyere Laurent Depoitre aka na ọkpụ mmeri ọ sụnyere na Nnukwu Iko Belgian nke afọ puku abụọ na ịrị na ise megide ndị mmeri iko Club Brugge .

Levante[dezie | dezie ebe o si]

Na abalị isii nke ọnwa Ọgọst afọ puku abụọ na ịrị na asatọ ( 6 August 2018), Simon sonyeere Levante otu egwuregwu si Spanish La Liga na nkwekọrịta afọ ise. [16] N'ọnwa Maachị afọ puku abụọ na ịrị na iteghete (2019) o kwuru na obi dị ya ụtọ na ọ na-agbara otu egwuregwu ahụ. [17]

Nantes[dezie | dezie ebe o si]

Na abalị iri na ise nke ọnwa Ọgọst afọ puku abụọ na ịrị na iteghete (15 Ọgọst 2019), enyefere Simon n'aka otu egwuregwu Ligue 1 FC Nantes . [18] Na njedebe nke oge, Nantes kpalitere nhọrọ ịzụta Simon. Ọ bịanyere aka n'akwụkwọ nkwekọrịta afọ anọ na otu egwuregwu ahụ. [19]

Ọrụ mba ụwa[dezie | dezie ebe o si]

Simon nwetara ọkpụkpọ oku mbụ ya na ndị otu egwuregwu mba Nigeria site n'aka onye nchịkwa Daniel Amokachi na ọnwa Maashị afọ puku abụọ na ịrị na ịse (March 2015) wee mee mpụta mbụ ya na abalị iri abụọ na ise nke ọnwa ahụ na egwuregwu enyị na enyi nke ụwa megide Uganda, mgbe ọ nọchiri Anthony Ujah mgbe nkeji iri ise na iteghete gasịrị na egwuregwu ahụ. [20] Simon nyere goolu mbụ ya maka Naijiria na egwuregwu enyi na enyi mba ụwa megide Niger na abalị asatọ nke ọnwa Septemba afọ puku abụọ na ịrị na ịse (8 September 2015), nke abụọ na mmeri ọkpụ goolu abụọ asaghị asa (2–0). [21] Naijiria họpụtara ya maka ndị otu ha dị mmadụ iri atọ na ise maka asọmpi Olimpiks Summer nke afọ puku abụọ na ịrị na isii (2016). [22]

N'ọnwa Mee afọ puku abụọ na ịrị na asatọ (2018), a kpọrọ aha ya na ndị otu egwuregwu iri atọ mbụ Naịjirịa maka asọmpi Iko Mbaụwa nke afọ 2018 na Russia . [23] Agbanyeghị, o soghị na mmadụ iri abụo na atọ ikpeazụ n'ihi mmerụ ahụ. [24] Agụnyere ya na otu nwoke iri abụọ na atọ nke mba ahụ maka asọmpi iko mba Afrịka nke afọ 2019 . [25]

Ọnụ ọgụgụ ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Klọb[dezie | dezie ebe o si]

Àtụ:Updated

Dika asọmpi e mere na abalị iri atọ nke ọnwa Julaị afọ puku abụọ na ịrị abụọ

Appearances and goals by club, season and competition
Club Season League Cup Europe Other Total
Division Apps Goals Apps Goals Apps Goals Apps Goals Apps Goals
Trenčín 2013–14[26] Slovak Super Liga 14 7 14 7
2014–15[26] Slovak Super Liga 19 6 2 1 4[lower-alpha 1] 3 25 10
Total 33 13 2 1 4 3 39 17
Gent 2014–15[27] Belgian Pro League 9 6 3 0 8[lower-alpha 2] 1 20 7
2015–16[27] Belgian Pro League 24 2 3 0 5[lower-alpha 3] 0 9[lower-alpha 4] 1 41 3
2016–17[27] Belgian First Division A 23 3 2 0 10[lower-alpha 1] 0 7[lower-alpha 2] 2 42 5
2017–18[27] Belgian First Division A 20 5 2 0 2[lower-alpha 1] 0 9[lower-alpha 2] 1 33 6
Total 76 16 10 0 17 0 33 5 136 21
Levante 2018–19[26] La Liga 19 1 4 0 23 1
Nantes (loan) 2019–20[26] Ligue 1 26 5 4 4 30 9
Career total 154 35 20 5 21 3 33 5 228 48

Mpụtara na UEFA Europa league

Mpụtara na nkwado Belgian league

Mpụtara na UEFA Champions league

Mpụtara not nkwado Belgian league nakwa Belgian Super Cup.

Mba ụwa[dezie | dezie ebe o si]

Àtụ:Updated[28]

Dịka asọmpi osonyere na abalị iri na ise nke ọnwa Jenụwarị afọ puku abụọ na ịrị abụọ na abụọ.

Mpụta na goolu nke otu mba na afọ
Otu mba Afọ Ngwa Ebumnuche
Nigeria 2015 8 3
2016 5 0
2017 5 1
2018 3 0
2019 12 1
2020 2 0
2021 8 0
2022 2 1
Mkpokọta 45 6

Ọkpụ goolu mba ụwa[dezie | dezie ebe o si]

Dị ka egwuregwu emere na abalị iri na ise nke ọnwa afọ puku abụọ na ịrị abụọ na abụọ (15 Jenụwarị 2022). Akara Naijiria depụtara[28] nke mbụ, kọlụm akara na-egosi akara mgbe ọ bụla Simon gbachara.
Ihe mgbaru ọsọ mba ụwa site na ụbọchị, ebe, okpu, onye mmegide, akara, nsonaazụ na asọmpi
Mba. Ụbọchị Ebe Okpu Onye mmegide Akara Nsonaazụ Asọmpi
1 Septemba 8, 2015 Adokiye Amiesimaka Stadium, Port Harcourt, Nigeria 4 </img> Niger 2–0 2–0 Enyi na enyi
2 Ọktoba 11, 2015 Edmond Machtens Stadium, Brussels, Belgium 6 </img> Cameroon 2–0 3–0 Enyi na enyi
3 Nọvemba 17, 2015 Adokiye Amiesimaka Stadium, Port Harcourt, Nigeria 8 </img> Swaziland 1–0 2–0 2018 FIFA World Cup iru eru
4 Septemba 4, 2017 Stade Ahmadou Ahidjo, Yaoundé, Cameroon 17 </img> Cameroon 1–0 1–1 2018 FIFA World Cup iru eru
5 Maachị 21, 2019 Stephen Keshi Stadium, Asaba, Nigeria 22 </img> Seychelles 3–1 3–1 Iso ntozu Iko Mba Afrịka 2019
6 15 Jenụwarị 2022 Roumdé Adjia Stadium, Garoua, Cameroon 45 </img> Sudan 3–0 3–1 2021 Africa Cup of Nations

Nkwanye ugwu[dezie | dezie ebe o si]

Gent

  • Njikọ ndị Belgium : 2014–15
  • Super Cup nke Belgium : 2015

Ntụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. Moses Daddy-Ajala Simon profile 14 February 2014, Soccerway.com
  2. Atkins (28 October 2014). Nigerian striker Moses Simon making his name at Slovakian side AS Trencin. ESPN. Retrieved on 23 January 2021.
  3. NPFL clubs vie for teenage star 'Moses Daddy' 5 March 2013, Supersport.com
  4. Ajax sign Nigerian sensation 10 May 2013, Supersport.com
  5. Jong Ajax wint ruim van Voorschoten 17 July 2014, Ajax Showtime
  6. Official: Ajax Amsterdam Did Not Offer Moses Daddy-Ajala Simon A Contract 25 July 2014, All Nigeria Soccer
  7. Moses Daddy naar AS Trencin 9 January 2014, Ajax Showtime
  8. Nigeria U20 duo join Slovakian club 13 January 2014, supersport.com
  9. Mladí Nigérijčania podpísali s AS Trenčín zmluvy na tri roky 14 January 2014, profutbal.sk
  10. MFK Košice VS.
  11. "Nigerian striker Moses Simon making his name at Slovakian side AS Trencin", ESPNFC.com. Retrieved on 31 May 2018.
  12. [Update Daddy voor drie jaar naar Gent]. www.ajaxshowtime.com. Archived from the original on 9 January 2015. Retrieved on 31 May 2018.
  13. 'Ajax en Heerenveen vissen achter het net' 6 January 2015, Voetbal.com
  14. Moses Simon debuts in Gent win 18 January 2015, Africanfootball.com
  15. Moses Simon red carded in Belgium 22 January 2015 SL10.ng
  16. Moses Simon se compromete con el Levante por las próximas cinco temporadas (es). Levante UD (6 August 2018). Retrieved on 6 August 2018.
  17. Oluwashina Okeleji (17 March 2019). Nigeria's Moses Simon enjoying regular football with Levante. BBC Sport. Retrieved on 27 August 2019.
  18. Spain's Levante loan Nigeria's Moses Simon to Nantes. BBC Sport (15 August 2019). Retrieved on 24 July 2020.
  19. Moses Simon: Nantes sign Nigeria winger permanently from Levante. Goal.com (15 June 2020). Retrieved on 24 July 2020.
  20. Nigeria vs.
  21. Nigeria vs.
  22. Oluwashina Okeleji (24 June 2016). Kelechi Iheanacho included in Nigeria's Olympics squad. BBC Sport. Retrieved on 25 June 2016.
  23. Wagih (15 May 2018). Nigeria announce preliminary World Cup squad. KingFut. Retrieved on 4 November 2019.
  24. World Cup 2018: Arsenal's Iwobi in Nigeria's 23-man squad. BBC Sport (3 June 2018). Retrieved on 27 August 2019.
  25. Nigeria: Super Eagles' Team List for Afcon 2019. allAfrica.com (12 June 2019). Retrieved on 9 August 2019.
  26. 26.0 26.1 26.2 26.3 M. Simon Summary. Soccerway. Perform Group. Retrieved on 20 May 2018.
  27. 27.0 27.1 27.2 27.3 Moses Simon » Club matches. worldfootball.net. Retrieved on 30 July 2020.
  28. 28.0 28.1 Moses Simon.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

Àtụ:FC Nantes squad