Nancy Dorian
| Ụdịekere | nwanyị |
|---|---|
| Mba o sị | Njikota Obodo Amerika |
| Aha n'asụsụ obodo | Nancy Dorian |
| Aha enyere | Nancy |
| Aha ezinụlọ ya | Dorian |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 1936 |
| Ebe ọmụmụ | New Brunswick |
| Ụbọchị ọnwụ ya | 24 Eprel 2024 |
| Ebe ọ nwụrụ | Brunswick |
| Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | English, Scottish Gaelic, German |
| Ọrụ ọ na-arụ | linguist, anthropologist, university teacher |
| Ụdị ọrụ ya | linguistics, nkà mmụta ihe ọmụmụ, Scottish Gaelic |
| Onye were ọrụ | Bryn Mawr College, University of Pennsylvania, Christian-Albrechts-Universität zu Kiel |
| Ebe agụmakwụkwọ | University of Michigan, Connecticut College |
| Okpukpere chi/echiche ụwa | Unitarian Universalism |
Nancy Currier Dorian (1936 - Eprel 24, 2024) bụ nwanyị America bụ ọkammụta asụsụ nke mere nchọpụta banyere ọdịda nke asụsụ amaala East Sutherland nke Scottish Gaelic ruo ihe karịrị afọ iri anọ, ọkachasị n'obodo Brora, Golspie na Embo. N'ihi ikewapụ ha n'obodo ndị ọzọ na-asụ Gaelic, obodo ndị a dị n'Ebe Ọwụwa Anyanwụ Sutherland nyere ezigbo ohere ịmụ ọnwụ asụsụ. Nnyocha Dorian nwere ike ịbụ nke kachasị ogologo n'isi ọmụmụ ahụ. A na-ewere ya dị ka "onye isi dị ike" na ọnwụ asụsụ. Language Death: The Life Cycle of a Scottish Gaelic Dialect, ọmụmụ o mere n'ihe kpatara ọdịda nke Gaelic na East Sutherland, ka a na-ewere dị ka "akwụkwọ mbụ dị mkpa" na ọnwụ asụsụ. Dị ka ọkà mmụta asụsụ Joan Argenter si kwuo, aha Dorian "bụ nke a maara nke ọma nye ndị ọkà mmụta na-arụ ọrụ" na ọtụtụ akụkụ nke nkà mmụta asụsụ.
Ndụ
[dezie | dezie ebe o si]
A mụrụ Nancy Dorian na New Brunswick, New Jersey na 1936. [1] A zụlitere ya na Highland Park dị nso, ọ gụsịrị akwụkwọ na Highland park High School na 1954. Ọ gụrụ German na Connecticut College for Women ma gụsịa akwụkwọ nweta summa cum laude na 1958. Ọ natara nzere MA (1961) na nzere PhD (1965) site na Mahadum Michigan ma kụzie asụsụ na German na Bryn Mawr College site na 1965 ruo 1989, ma kụzikwaa na Mahadum Pennsylvania na Mahadim Kiel. Dorian bụ prọfesọ lara ezumike nká na Bryn Mawr. Ọ bụ onye Unitarian Universalist; ukwe ya Dear Weaver of our Lives' Design ritere ihe nrite maka ime emume ịbụ nwanyị nke chi. Ọ nwụrụ na mberede na Eprel 24, 2024, na Brunswick, Maine.[2]
Dorian chọpụtara asụsụ Gaelic na mbụ mgbe ọ na-arụ ọrụ n'ọhịa maka Nnyocha Asụsụ nke Scotland na 1963. N'ịhụ na mbelata nke ụdị asụsụ obodo na-enye ohere ịchọpụta ụdị mgbanwe ndị mere ka ụdị asụsụ ọbụla na-anwụ, ọ malitere ọmụmụ ogologo oge banyere ọdịiche na mgbanwe dị na East Sutherland Gaelic. Mgbe Dorian malitere ịmụ asụsụ ahụ, a ka nwere ihe karịrị ndị na-asụ ya dị narị abụọ na Brora, Golspie na Embo, gụnyere mmadụ otu narị na ise na Embo ebe e nwere ihe karịrị otu ụzọ n'ime ụzọ atọ nke ndị bi na ya. Ọ bụ ezie na omume ọdịnala na-akpọ ndị ọkammụta anthropology òkù ka ha gbanwee ntọala ọrụ n'ime ọhịa, nsogbu ahụike mere ka Dorian gaa n'ihu na-amụ banyere mmepe asụsụ East Sutherland, ọnọdụ nke nwere mmetụta bara uru nke ịmepụta ọmụmụ nke oke na ịga n'ihu a na-ahụtụbeghị. Ndị meburu nchọpụta n'oge gara aga lekwasịrị anya na ndị na-asụ NORM (ndị agadi nwoke imeobodo na-adịghị agagharị agagharị), na-asụ ya bụ asụsụ, ndị nwere asụsụ na-agbaso omenala, na-ahapụ ndị ọzọ na-asụ ya n'obodo ndị ka n'ọnụ ọgụ.[3][4]
O chepụtara aha ahụ bụ "onye na-asụ ọkara asụsụ" maka ndị, ọkachasị site na ọgbọ ndị na-eto eto, ndị nwere ike ịsụ Gaelic mana n'ezughi oke.[3] Nlebara anya ya n'ụzọ inwe ikike ịsụ asụsụ ọfụma si na-etolite n'ụzọ dị iche n'etiti asụsụ ndị nọ n'ihe ize ndụ na ndị na-adịghịzi adị mere ka ndị ọkà mmụta asụsụ inwe mmasị ịghọta ụdị ndị ọkà okwu dị iche iche na mmekọrịta ha n'usoro mgbanwe asụsụ na mmeghachị mgbanwe asụsụ. Dorian katọrọ ndị nnyocha na-elekwasị anya na ndị na-asụ asụsụ naanị ha, nke na-eleghara ọdịiche dị n'etiti ndị na-asụ asụsụ dị iche iche anya.[3]
Akwụkwọ ya bụ The Tyranny of Tide: An Oral History of the East Sutherland Fisherfolk mebiri ọdịiche dị n'etiti nka mmụta asụsụ na ethnology, na-ekpughe òtù isi ọmụmụ ndị a si enyere onwe ha aka ịchake nakwa imejupụta onwe ha n'ebe nke ọbụla na-eri mperi.
Ọrụ ya ndị a ma ama
[dezie | dezie ebe o si]Language Death: The Life Cycle of a Scottish Gaelic Dialect (1981)
[dezie | dezie ebe o si]Dorian bipụtara afọ iri na isii nke nnyocha o mere n'asụsụ East Sutherland Gaelic dị ka Language Death: The Life Cycle of a Scottish Gaelic Dialect. Dị ka nnyocha nke Wolfgang U. Dressler mere si kwuo, ọ bụ "akwụkwọ edemede mbụ bụ ọkpọkọpị" gbasara ọnwụ asụsụ. N'echiche nke Prọfesọ Tracy Harris na Suzanne Romaine, ọ bụ ọrụ kacha zuo òkè n'isiokwu ahụ nke e bipụtara; Harris kwukwara na ọ bụ "nnukwu onyinye na ngalaba nkà mmụta asụsụ". Dressler dere na "[ọ] ga-ewe ogologo oge iji kọwaa akụkụ niile kwesịrị otuto nke akwụkwọ a", nakwa na ọ bụ "ihe dị mkpa" nye ndị ọkà mmụta nke ọnwụ asụsụ. Romaine gosipụtara echiche dịgasị iche iche nke Dorian tinyere n'ọrụ ya ahụ, na-emepụta akwụkwọ nke ga-adọrọ mmasị ndị na-ahụ maka ọdịbendị, Ndị ọkà mmụta mmekọrịta mmadụ na ibe ya, ndị ọkà akwụkwọ Celtic, ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme nke Scotland, na ọtụtụ ndị ọkà mmụta asụsụ, gụnyere ndị ọkachamara na Sociolinguistics, akụkọ ihe mere mere eme asụsụ, na syntax.
Dorian chọpụtara ụzọ ụfọdụ na-emegide nghọta nke mgbanwe asụsụ na-arụ ọrụ na East Sutherland, na-ekwu na asụsụ Gaelic nwenwuru ike ịgbanwe baa na ndụ nke oge a ọbụna mgbe ọ na-anwụ anwụ. Enweghị diglossia o nwere, n'ihi na ndị na-asụ asụsụ nwenwuru ike ịgbaziri okwu site na Bekee ma tinye ha na mkparịta ụka ọ bụla, ọbụlagodi maka isiokwu teknụzụ dị elu. Ọ haziri ndị na-asụ asụsụ dị ka "ndị okenye na-asụ nke ọma", "ndị na-eto eto na-asụ nke ọma", na "ndị na-asụ ọkara asụsụ", na-akọwa ọdịiche asụsụ dị n'etiti ụdị ndị ọkà okwu ọ bụla na ndị a. Ọ kọwara n'ebe o doro anya nke ọma n'akwụkwọ ya o dere n'afọ 2010, 'Investigating Variation: The Effects of Social Organization and Social Setting', nchọpụta o mere na obodo gwakọtara ndị nọ n'ógó dị iche iche n'obodo ma nọrọkwa n'ógó akụnaụba dị iche iche ọnụ nwere nnukwu ọdịiche dị n'etiti ndị na-asụ ya bụ asụsụ. Ụdị ụfọdụ nke ọdịiche syntactic, dị ka gramatical jenda, case markings, na passive constructions abụọ, jiri nwayọọ nwayọọ fuo efu, kama ihichapụ n'ozuzu, dị ka ụfọdụ ndị ọkà mmụta kwuru na ọ bụ. Dorian ahụghị otu ụdị mgbanwe asụsụ nke e chere na ọ na-egosi asụsụ ndị nọ n'ihe ize ndụ.
O kwuru na ụdị mgbanwe dị n'asụsụ ndị nọ n'ihe ize ndụ bụ otu ihe ahụ dị ka n'asụsụ ndị dị mma, mana ógó mgbanwe ahụ ruru ka e mere ka ọ dị ngwá ngwá; ihe ndị na-akọwa asụsụ dị n'ihe egwu bụ dịka o si metụta ndị mmadụ na-asụ ya bụ asụsụ kama mmetụta nhazi. Nnyocha ya gosiri na mwepu nke Gaelic na usoro agụmakwụkwọ ụlọ akwụkwọ bụ isi ihe na-eme ka ọ daa, n'ihi na ọ belatara ohere iji Gaelic mee ihe ma mee ka ọnọdụ ya na "uru" ya dị ala n'anya ndị obodo. Ihe ọzọ dị mkpa, Dorian chọpụtara, bụ ọnụnọ nke ndị na-asụ Bekee nke bara ọgaranya nke mere ka ndị na-asụ asụsụ Gaelic dara ogbenye ịna-eche na ịsụ asụsụ Bekee na ịkpata ego na-agakọ. Nnyocha e mechara mee gosiri na ihe ndị Dorian chọpụtara maka ọdịda Sutherland Gaelic metụtakwara ọtụtụ asụsụ ndị ọzọ na-adịghịzi adị.
Investigating Obsolescence: Studies in Language Contraction and Death (1989)
[dezie | dezie ebe o si]A kpaliri Dorian ịhazi nchịkọta edemede a mgbe ọ ghọtara na enweghị nzukọ ma ọ bụ akwụkwọ akụkọ a raara nye ọmụmụ nke ọnwụ asụsụ, ebe ndị ọkà mmụta nọ n'isi ọmụmụ ahụ nwere ike ịkekọrịta echiche ha. Dorian kọwara akwụkwọ ahụ dị ka "nkume nzọụkwụ" maka nnyocha n'ọdịnihu banyere ọnwụ asụsụ. Site n'inyocha asụsụ na olumba dị iri atọ na asaa, ndị dere edemede ndị ahụ nyere aka n'inweta ozi gbasara asụsụ ole na ole dị nta. N'otu oge ahụ, usoro dị iche iche e ji mee ihe na-enyere ndị nchọpụta ndị ọzọ aka ịmụta ihe gbasara nyocha asụsụ ndị dị n'ihe ize ndụ. Edemede ndị ahụ kọwara etu a ga-esi tinye usoro mmụta asụsụ nke abụọ n'ọrụ na ọmụmụ nke ndị na-asụ asụsụ nketa nke asụsụ ndị nọ n'ihe ize ndụ, bụ ndị asụsụ ahụ abụghị asụsụ mbụ ha, bụ otu n'ime ebumnuche ndị bụ isi Dorian ji mee nchịkọta ahụ. Na mgbakwunye, Carl Blyth kọwara akwụkwọ ahụ dị ka "ihe dị ịrịba ama" n'ihi na ọ "na-eguzobe atụmatụ dị n'otu n'ime mpaghara dị iche iche na nke ka na-apụta". Investigating Obsolescence "n'enweghị obi abụọ na-atụnyere nchịkọta ndị ọzọ dị mkpa nke edemede mmekọrịta mmadụ na ibe ya", dị ka Emanuel Drechsel si kwuo.
Small-Language Fates and Prospects: Lessons of persistence and Change from Endangered Languages (2014)
[dezie | dezie ebe o si]N'ime akwụkwọ a, isi ihe Dorian lekwasịrị anya ịmụ bụ obodo ịkụ azụ nke Brora, Golspie, na Embo, nke dị n'ebe ọwụwa anyanwụ Sutherland, na mgbanwe nke asụsụ Gaelic n'obodo ndị a. Dorian na-ekwu na mgbe ọ bịarutere, ọtụtụ ndị mmadụ na-asụ asụsụ abụọ na Gaelic na Bekee - nke a dugara na akwụkwọ ndị ọzọ na mgbanwe asụsụ dị ka usoro okwu na mbelata zuru oke na nkà na ọmụma. [5] Dorian na-enyocha echiche asụsụ na mkpa ọ dị na mgbanwe asụsụ. Ọ na-ekwu na ọ dị mkpa inyocha ebe ndị na-ekwu okwu na ikike iji asụsụ Gaelic eme ihe.[6] Dorian mechiri akwụkwọ a na ihe edeturu banyere ọrụ ike ọhịa yana usoro nke ịrụ ọrụ n'ime obodo mgbe ọ nọ n'ọnọdụ dị ka onye si n'èzí, ma jiri ọtụtụ iri afọ nke ịrụ ọrụ ya nye echiche miri emi maka mgbanwe asụsụ Gaelic.
Dị ka nnyocha nke onye ọkà mmụta asụsụ Lenore A. Grenoble si kwuo, ihe kachasị dị ịrịba ama banyere akwụkwọ ahụ bụ na ọ nwere mkpa n'isi ọmụmụ ya taa n'ihi na akwụkwọ ahụ na-arụtụ aka ọtụtụ iri afọ nke ịrụ ọrụ.[7] Ọzọkwa, onye na-ahụ maka ụmụ mmadụ bụ Emily McEwan-Fujita na-ekwu maka uru ya dị ka ihe enyemaka nye ụmụ akwụkwọ na ndị ọkà mmụta. Grenoble na-egosipụtakwa uru nke ibipụta akwụkwọ nke nchịkọta ndị a nke na-enye ohere ịnweta ngwa ngwa ebe ịchọpụta isiokwu ndị ochie nwere ike isi ike.[8]
Ihe Ncheta
[dezie | dezie ebe o si]Carl Blyth dere na 1994 na Dorian "kwesịrị otuto kachasị maka ịdọta uche ndị ọkà mmụta asụsụ na ndị ọkà mmụta ọdịdị mmadụ kwa mgbe kwa mgbe n'uru asụsụ ndị nọ n'ihe ize ndụ bara". N'afọ 2005, Dorian bụ isiokwu e kwuru n'ihe ngosi nke gosipụtara na BBC Alba: "Mar a Chunnaic Mise: Nancy Dorian agus a'草" ("Dị ka m hụrụ ya: Nancy Dorien na Gaelic"). Ihe nkiri ahụ lekwasịrị anya n'ọrụ ya na East Sutherland Gaelic. [9]
N'afọ 2012, Linguistic Society of America nyere Dorian ihe nrite Kenneth L. Hale, ihe nrite na-asọpụrụ ndị ọkà mmụta maka ọrụ ha na asụsụ ndị nọ n'ihe ize ndụ ma ọ bụ ndị na-adịghịzi adị. Ihe nrite Dorian nyere ya otuto maka "nnyocha na Scots Gaelic nke gafere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ iri ise - ikekwe ihe ndekọ nke nyocha a kacha sochie anya na asụsụ ọ bụla nọ n'ihe ize ndụ; na maka nkwado ya dị irè maka nchekwa na ime ka asụsụ dị n'ihe egwu dị ndụ ọzọ. Ólú ya bụ otu n'ime ndị mbụ na otu n'etiti olu ndị a ma ama kacha akwado asụsụ ndị nọ n'ize ndụ. [10] Dorian nwetara akara ugo mmụta nsọpụrụ site na Mahadum Glasgow na 2015 .[9][3]
Ndepụta ọrụ ndị Ọ Rụrụ
[dezie | dezie ebe o si]- Dorian (1978). East Sutherland Gaelic: the dialect of the Brora, Golspie, and Embo fishing communities (in en). Dublin Institute for Advanced Studies. ISBN 9781855000995.
- Dorian (1981). Language Death: The Life Cycle of a Scottish Gaelic Dialect (in en). University of Pennsylvania Press. ISBN 9780812277852.
- Dorian (1985). The tyranny of tide: An Oral History of the East Sutherland Fisherfolk (in en). Karoma. ISBN 9780897200622.
- [1989] (1992) in Dorian: Investigating Obsolescence: Studies in Language Contraction and Death (in en). Cambridge University Press. ISBN 9780521437578.
- Dorian (2010). Investigating Variation: The Effects of Social Organization and Social Setting (in en). Oxford University Press. ISBN 9780199738250.
- Dorian (2014). Small-Language Fates and Prospects: Lessons of Persistence and Change from Endangered Languages: Collected Essays (in en). Brill. ISBN 9789004261938.
Edensibịa
[dezie | dezie ebe o si]- Ebe e si Nweta Ihe ndị e dere n'akwụkwọ
- ↑ Nancy Dorian. Tobar an Dualchais. Archived from the original on September 4, 2018. Retrieved on August 28, 2012.
- ↑ Obituary: Nancy Dorian. Portland Press Herald (May 30, 2024). Retrieved on May 30, 2024.
- 1 2 3 4 McEwan-Fujita (July 31, 2015). Nancy Dorian's "Greatest Hits". Gaelic.co. Retrieved on September 7, 2018.
- ↑ Celtic academics from across the world prepare for major conference (en, gd). University of Glasgow. Retrieved on September 7, 2018.
- ↑ Grenoble (December 24, 2016). "Grenoble 2016. p.105." (in en). Anthropological Linguistics 58 (1): 104–106. DOI:10.1353/anl.2016.0023. ISSN 1944-6527.
- ↑ Grenoble (December 24, 2016). "Grenoble 2016 p.105" (in en). Anthropological Linguistics 58 (1): 104–106. DOI:10.1353/anl.2016.0023. ISSN 1944-6527.
- ↑ Grenoble (December 24, 2016). "Grenoble 2016 p.106" (in en). Anthropological Linguistics 58 (1): 104–106. DOI:10.1353/anl.2016.0023. ISSN 1944-6527.
- ↑ Grenoble (December 24, 2016). "Grenoble 2016. p.106" (in en). Anthropological Linguistics 58 (1): 104–106. DOI:10.1353/anl.2016.0023. ISSN 1944-6527.
- 1 2 "Mar a Chunnaic Mise: Nancy Dorian agus a' Ghaidhlig", BBC Alba, December 17, 2015. Retrieved on September 4, 2018.
- ↑ Kenneth L. Hale Award Previous Holders | Linguistic Society of America (en). Linguistic Society of America. Retrieved on September 7, 2018.
Njikọ mpụga
[dezie | dezie ebe o si]- Black. "Gàidhlig Taobh Sear Chataibh: dualchainnt air a dhol a mach a bith", The Scotsman, May 16, 2004. (in gd)
- Lexical Loss Among the Final Speakers of an Obsolescent Language: a formerly-fluent speaker and a half-speaker compared. Akwụkwọ e bipụtara n'ịntanetị na Jun 1997
- Iji Asụsụ nkeonwe maka ebumnuche ọha na eze: Ụfọdụ nkuzi siri ike site n'ime ihe ngosi TV na asụsụ na-anwụ anwụ. Okwu e nyere ngalaba emeritus na Bryn Mawr College, March 16, 2006, sitere n'aka Nancy Dorian
- Articles with ISNI identifiers
- Articles with VIAF identifiers
- Articles with BIBSYS identifiers
- Articles with BNF identifiers
- Articles with GND identifiers
- Articles with J9U identifiers
- Articles with LCCN identifiers
- Articles with NKC identifiers
- Articles with NLA identifiers
- Articles with NSK identifiers
- Articles with NTA identifiers
- Articles with CINII identifiers
- Articles with faulty RERO identifiers
- Articles with SUDOC identifiers
- Articles with Trove identifiers
- Articles with WorldCat-VIAF identifiers
- Ibé ndị na-eji njikọ anwansi ISBN