Nancy Njie
Nancy Njie | |
|---|---|
| Secretary of State for Tourism and Culture of The Gambia | |
| In office 2008–2010 | |
| President | Yahya Jammeh |
| Preceded by | Angela Colley |
| Succeeded by | Fatou Mass Jobe-Njie |
| Deputy mayor of Banjul City Council | |
| In office 2008–2008 | |
| Personal details | |
| Born | Nancy Seedy Njie 07 Ọktoba 1965 |
| Died | 22 Ọgọstụ 2025 (aged 59) |
| Alma mater | Gambia High School |
Nancy Seedy Njie (7 Nọvemba 1965 - 22 Ọgọst 2025) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Nike Gambia nke jere ozi dị ka Odeakwụkwọ nke steeti maka njem nleta na ọdịbendị site n'afọ 2008 ruo n'afọ 2010 n'okpuru ọchịchị onye isi ala nke Yahya Jammeh .
Mmalite ndụ na ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]Njie gụrụ akwụkwọ na Gambia High School . N'agbata afọ 1984 na 1991, ọ rụrụ ọrụ na ụlọ oru ndị Gambia Airways . [1] Ọ bidoro Gambia Ports Authority Canteen ma rukwaa ọrụ ebe a tupu nhọpụta ya dika onye otu nke Banjul City Council (BCC) na Nọvemba 2007. [2] A họpụtara Njie ka ọ bụrụ osote onye isi nke otu ahụ na ebrụwarị [3]
Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị
[dezie | dezie ebe o si]Na Machị 19, 2008, Onye isi ala Yahya Jammeh chụpụrụ ndị minista abụọ ya: odeakwụkwọ nke steeti maka ozi, nkwukọrịta na teknụzụ, Neneh Macdouall-Gaye, ya na odeakwụkwọ nke mba maka njem nleta, Angela Colley. Njie nọchiri Colley dị ka Odeakwụkwọ nke steeti maka njem nleta na ọdịbendị nke Gambia, ọrụ ọ rụrụ ruo n'afọ 2010. [4][5]
Na 27 Jenụwarị 2009, Njie gara Kachikally Museum na Crocodile Pool dị ka akụkụ nke ọrụ njem ya. [6] N'abalị asaa n'ọnwa Ọgọstụ n'afọ 2009, ọ tọrọ ntọala ụlọ akwụkwọ Gambia Hotel School nke e wuru ọhụrụ na Kanifing North.[7]
Ndụ onwe
[dezie | dezie ebe o si]Njie nwụrụ na 22 Ọgọstụ 2025, mgbe ọ dị afọ 59. [8]
Ihe odide
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Hughes (2008). Historical Dictionary of The Gambia. Scarecrow Press. ISBN 978-0-8108-5825-1.
- ↑ Hughes (2008). Historical Dictionary of The Gambia. Scarecrow Press. ISBN 978-0-8108-5825-1.
- ↑ Hughes (2008). Historical Dictionary of The Gambia. Scarecrow Press. ISBN 978-0-8108-5825-1.
- ↑ (2008) "The Gambia: Cabinet Reshuffle". Africa Research Bulletin: Political, Social and Cultural Series 45 (3). DOI:10.1111/j.1467-825X.2008.01611.x. ISSN 0001-9844. Retrieved on 17 April 2026.
- ↑ Secretary of State for Tourism and Culture. Archived from the original on 28 September 2007. Retrieved on 8 October 2008.
- ↑ Gambia: SOS Nancy Njie Tours Kachically Crocodile Pool. AllAfrica. Retrieved on 17 April 2026.
- ↑ 1.3m Euro Hotel School Foundation Stone Laid. The Point (7 August 2009). Retrieved on 17 April 2026.
- ↑ "Gambia Mourns Former Tourism Minister Nancy Seedy Njie", The Fatu Network, 23 August 2025. Retrieved on 24 August 2025.