Nata Albot
Lua error in package.lua at line 80: module 'Module:Yesno' not found.
Nata Albot (amụrụ na 26 Ọktoba 1979 na Chișinău) bụ onye na-ede blọgụ, onye na-emepụta ihe nkiri TV, onye nta akụkọ na onye njikwa mgbasa ozi si Moldova. O nweela ọtụtụ ihe ngosi a ma ama na redio na telivishọn na Moldova kemgbe ọ dị afọ iri na isii. Ọ gụsịrị akwụkwọ na ụlọ akwụkwọ ọmụmụ iwu nke mahadum steeti Moldova. Nata Albot jere ozi dị ka onye na-emepụta Jurnal TV site na Machị 2010 ruo Julaị 2013. Ọ rụkwara ọrụ dị ka onye nduzi nke Radio Pro FM Chișinău, onye nta akụkọ maka Pro TV, onye nduzi ihe ngosi TV "Star Academy" na Prime TV. Ọzọkwa, dị ka onye na-arụ ọrụ n'onwe ya, o mepụtara usoro TV "Aventura Americană" banyere ụmụ akwụkwọ Moldova oge okpomọkụ na-arụsi ọrụ ike na njem na United States.
Ya na Andrei Bolocan, bia buzie otu ,onye na-eme ihe nkiri TV nke Moldova, [1] ma oge mgbu o nugbu R. Uskov, onye ọka iwu(Lauya). [2] Albot nwere ụmụ azi anọ.[3]
Na 2013 ọ si Chișinău gawa Montreal.[4]
Onyinye
[dezie | dezie ebe o si]- Na Disemba 10, 2011, United Nations nyere Nata Albot onyinye maka mkpọsa mgbasa ozi megide enweghị nnwere onwe n'ebe ụmụaka nwere nkwarụ nọ.
- Nwanyị nke Afọ 2010 na Moldova, VIP Magazin
Edensibia
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Nata Albot și Andrei Bolocan vorbesc despre relația lor de cuplu. Andrei: "Eu sunt cel mai iubit copil din familie" (2 July 2017).
- ↑ Nata Albot & Ruslan Uskov: O casă pentru Bogdan. VIP Magazin (2005). Archived from the original on 2016-08-06. Retrieved on 2017-01-25.
- ↑ Nat Albot - despre vacanțele cu cei mici. "Vă spun ceea ce mie nimeni nu mi-a povestit despre parenting.". perfecte.md (January 7, 2020). Retrieved on January 16, 2020.
- ↑ Hadei (2015-07-13). Nata Albot a NĂSCUT o FETIȚĂ. Cum a numit-o pe micuță. Ziarul Național. Retrieved on 2017-01-25.