Gaa na ọdịnaya

Ndave David Njoku

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

David Njoku Listenⓘ (amụrụ ma kpọọ Ndave David Njoku ) bụ onye na-emepụta ihe nkiri na Naịjirịa, onye njikwa mmepụta ihe n'ụlọ ọrụ Nollywood. [1] [2]

Ndụ mbido

[dezie | dezie ebe o si]

Ndave si obodo Ukelefi dị na okpuru ọchịchị gọọmentị obodo nke Nkanu East nke Enugu steeti mana a mụrụ ya ma zụlite ya na Abraka, Delta steeti, Naịjirịa . Ọ bụ nwa ikpeazụ sitere n'ezinụlọ nwere ụmụ asaa ma o tolitere n'enweghị nna n'ihi ọnwụ nna ya mgbe ọ dị naanị afọ iri na anọ. [3] [4]

Agụmakwụkwọ

[dezie | dezie ebe o si]

Ndave gụrụ akwụkwọ Praịmarị na Sekọndrị ya na Abraka . Ọ gụchara akwụkwọ mnweta nzere bachelọ ya na Mahadum Delta State (DELSU) n'aha ịchafụ. [5]

Ndụ nkeonwe

[dezie | dezie ebe o si]

Ndave mere ngosipụta mbụ ya n'afọ 2004 n'okpuru nlekọta nke Maazị Perfect, onye katọrọ ya ma gwa ya na ọ nweghị ọdịnihu n'ihe nkiri ahụ. N'echi ya, ọ laghachiri n'ebe a na-eme ngosipụta a wee wepụta otu ihe n'akwụkwọ ha. O jiri edemede ahụ gbanwee akụkọ dị n'isi ya wee dee edemede peeji anọ. O buru edemede ahụ gaa Chọọchị Katọlik nke St. Paul, Mahadum Delta State wee gaa njem ya na ndị otu ihe nkiri. Site n'ebe ahụ ka ndị mmadụ malitere ịgba ya ume ka ọ o tinye anya n' ihe nkiri. Ihe omume ntụrụndụ ya bụ ime nnyocha na igwu egwuregwu. Ndị nduzi kacha amasị Ndave bụ Maazị Ifeanyi Ikenyi (Maazị Hollywood) na Maazị Chris Nkem Okafor nke a makwaara dịka ChrisNX. Onye na-eme ihe nkiri mba ofesi kacha amasị ya bụ Steven Spielberg .

Ọ rụkwara ọrụ ya na Queen Collete Nwadike nke bụ Exquisite Face of Universe.

Ihe nkiri mbụ ya bụ Smack Down, ebe o so ndị na-eme ihe nkiri dịka Van Vicker, Chiwetalu Agu na Uche Jombo rụkọọ ọrụ. O mechara mepụta obere ihe nkiri akpọrọ The War Lord na 2008, Ndave dere, soro duziri ma bụrụkwa onye na-emepụta ihe nkiri dịka Oshilim Gabriel na Oshilim Anthony, ihe nkiri bụ Wicked Conscience, nke Chiwetalu Agu, John Paul, Uche Elendu, na Emmanuel Ahummadu nke a makwaara dịka Labista gosipụtara. Ihe nkiri ahụ enweghị ezigbo ihe ọ pụtara, o wee banye ezumike afọ anọ.N'afọ 2012, Ndave malitere ọrụ ya n'isi dịka onye njikwa ebe ọrụ na Awka, steeti Anambra . Mgbe otu afọ gachara, ọ jikọtara ma na-arụ dịka onye njikwa ebe ọrụ na onye njikwa mmepụta ihe. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ banyere na mmepụta ihe nkiri wee mee ihe nkiri ndị a:

    • Broken Bottle
    • JohnPaul and Rebecca
    • Little Calabash
    • Plantain girl
    • Ghetto Packaging
    • Oh Blood Money
    • Sorrows of Nene
    • Tears of Nene[6]

N'afọ 2015, Ndave David Njoku so mepụta ihe nkiri sinima mbụ a ma ama pụtara ihe na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, bụ The Last Kidnap . Kas-Vid International mepụtara ihe nkiri ahụ, ma Ifeanyi Ikpeonyi, nke a makwaara dịka Maazị Hollywood, duziri ya.N'afọ a, 2016 nyere Ndave ohere ịse ihe nkiri sinima mbụ ya nke akpọrọ The Inhaler site na CD Initiative Films. O sokwa mepụta ihe nkiri ọzọ, bụ Polygamous Family nke Pete Edochie, Remi Ohajianya, na Imet Goodluck, nke a makwaara dịka Tallest man, mere. OG Best International bụ ya mepụtara ihe nkiri ahụ.Emechara ihe nkiri ọhụrụ nke Nkem Owoh, Tana Adelena Egbo, na ndị ọzọ mere maka Amaco Investment, ma ọ ka mechara ọrụ ihe nkiri maka Dekross Productions, Ya na Kingsley Onyenma .a rụkọkwala ọrụ [ ihe achọrọ n'akara ] Ọ rụọla ọrụ ya na ndị na-eme ihe nkiri dị iche iche, ndị na-eme ihe nkiri ụmụ nwanyị, ndị nlereanya na ụlọ ọrụ ntụrụndụ ndị ọzọ. [7] [8]

Edensibịa

[dezie | dezie ebe o si]
  1. ↑ "friendite talks with Ndave David". Archived from the original on 2016-08-27. Retrieved 2016-06-30.
  2. ↑ "Archived copy". Archived from the original on 2016-09-22. Retrieved 2016-07-07.{{cite web}}: CS1 maint: archived copy as title (link)
  3. ↑ "Nollywood Filmmaker, NDave David Njoku concludes a new movie ..." Archived from the original on 2016-08-27. Retrieved 2016-06-30.
  4. ↑ "Archived copy". Archived from the original on 2016-09-22. Retrieved 2016-07-07.{{cite web}}: CS1 maint: archived copy as title (link)
  5. ↑ "talksfriendite.com/tag/ndave-david-njoku/". Archived from the original on 2016-09-10. Retrieved 2016-06-30.
  6. ↑ "Nollywood Filmmaker, NDave David Njoku concludes a new movie | FriendITEgossip". Archived from the original on 2016-09-18. Retrieved 2016-07-06. {{cite web}}: More than one of |accessdate= and |access-date= specified (help); More than one of |archivedate= and |archive-date= specified (help); More than one of |archiveurl= and |archive-url= specified (help)
  7. ↑ "MEET NDAVE DAVID NJOKU, NOLLYWOOD FILMMAKER ...Nollywood Filmmaker, NDave David Njoku concludes a new movie ..." Archived from the original on 2016-08-27. Retrieved 2016-06-30.
  8. ↑ "永旺快投网-优惠大厅". Archived from the original on 2016-09-10. Retrieved 2016-06-30.

Njikọ mpụga

[dezie | dezie ebe o si]