Gaa na ọdịnaya

Nesrine Malik

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Nesrine Malik
mmádu
Ụdịekerenwanyị Dezie
Mba o sịSudan Dezie
Aha enyereNesrine Dezie
Aha ezinụlọ yaMalik Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya24 Ọktoba 1975 Dezie
Ebe ọmụmụSudan Dezie
Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaEnglish Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ntaakụkọ, odee akwụkwọ Dezie
Ebe agụmakwụkwọUniversity of Khartoum, University of London, The American University in Cairo Dezie
AgbụrụAfrican people Dezie
Okpukpere chi/echiche ụwaOkpukpere Alakụba Dezie
Ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
Ihe nriteFellow of the Royal Society of Literature Dezie
Has written forTheGuardian.com Dezie
Nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Nesrine Malik FRSL bụ onye nta akụkọ a mụrụ na mba Sudan na onye dere akwukwo We Need New Stories: Challenging the Toxic Myths Behind Our Age of Discontent (W&N, 2019). N'ịbụ onye bi na obodo London, Malik bụ onye na-ede akụkọ maka The Guardian ma jekwazie ozi dịka onye na-eme ihe nkiri na mmemme mkparịta ụka akụkọ kwa izu nke ndi oru BBC Dateline London . [1]

Oge ọ malitere

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Malik na Khartoum, Sudan, ma zụlite ya na obodo Kenya, Egypt ya na Saudi Arabia . [2][3] Ọ gara Mahadum America dị na Cairo gakwaa Mahadum nke Khartoum dịka onye na-agụ akwụkwọ, tupu ọ kwaga UK n’oge afo 2004 iji mezue ọmụmụ ya na Mahadum nke London.[3][4]

N'akụkụ ọrụ ya dịka onye nta akụkọ, Malik nọrọ afọ iri (10) n'ahịa ndị na-apụta. [5] Ọ na-ede banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị Britain nakwa America, ndọrọ ndọrọ ọchịchị njirimara na Islamophobia. E hotara okwu ya na The Guardian Oge Charlie Hebdo gbagburu ya na magazin New York na The New York Times, [6] isiokwu ọ kwukwara banyere ya na BBC's Newsnight n'akụkụ David Aaronovitch nke The Times na Myriam François-Cerrah nke New Statesman.[7] Akụkụ na ozi Malik maka magazin Foreign Policy lekwasịrị anya na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke obodo Sudan.[8]

N'oge afọ 2015, Malik na Peter Hitchens kwurịtara ọrụ nke hijab na ọdịbendị ndị Alakụba na Britain na Channel 4 News. N'oge afọ 2016, Malik bụ otu n'ime ndị edemede atọ gosipụtara na usoro "The Web We Want" nke The Guardian na-atụle mmetọ n'ịntanetị na nkwupụta ọjọọ ha nwetara n'ịntanetị gbasara ọrụ ha.[9][10] Mgbe ihe ndi nke a gasịrị, o nyere aka na nnọkọ na Nzukọ Ndị Omeiwu nke Britain na ebumnuche nke ịlụso mmetụta na-emebi emebi n'ịntanetị nwere na ndị edemede na-apụta.   [citation needed]

N'oge afọ 2018, onye nta akụkọ Peter Oborne kọwakwaziri Malik na British Journalism Review dịka onye na-ede "n'amaghị ama na punch banyere agbụrụ, ọkwa, na okike, yana Islam". Oborne kọwara ya dịka ihe atụ nke ọgbọ na-eto eto nke ndị nta akụkọ ndị Alakụba na-eme ihe ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ ndị "na-eji njirimara ha eme ihe iji mee ka ọdịiche dị n'etiti ndị Britain pụtakwaazi ìhè. Ha na-emeso Islam dịka njirimara ndọrọ ndọrọ ọchịchị dịka nke okpukpe. Ịbụ onye Alakụba nyere ọgbọ puku afọ a ikuku ọ bụghị nke okpukpe kama nke nnupụisi ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Maka ha, ọ bụ ngwá ọrụ iji gosipụta na obodo Britain ka bụ mba nke obere ìgwè ndị mmadụ na-achịkwa.[11]

Nsọpụrụ na onyinye

[dezie | dezie ebe o si]

N'oge afọ 2017, a họpụtara Malik dịka "Onye nta akụkọ / Onye edemede nke Afọ" site na Diversity in Media Awards . [12] N'otu afọ ahụ, a kwanyeere ya ugwu dịka "Society and Diversity Commentator of the Year" na Editorial Intelligence Comment Awards . [13]

N'oge afọ 2019, Orwell Foundation depụtara Malik maka Orwell Prize maka ọrụ ya na "ihe ọjọọ ọha na eze" nke Britain na "ikpughe gburugburu ebe obibi obi ọjọọ".[14] N’oge afo 2019 ya na 2020, e depụtara Malik dịka "Nkọwa nke Afọ" na British Journalism Awards . [15] N'oge afọ 2021, Orwell Foundation depụtara Malik ọzọ maka Orwell Prize maka ọrụ odeakụkọ.

N'oge afọ 2021, Malik natara Robert B. Silvers Prize maka Journalism. [16][17] A họpụtara ya ka ọ bụrụ Fellow nke Royal Society of Literature n’oge afo 2023.[18]

Edensibia

[dezie | dezie ebe o si]
  1. Hill (22 April 2018). Dateline London. BBC News.
  2. Heller. "'We Need New Stories' Asks: Why Are People Prone To Believing The Largest Of Lies?", NPR, June 9, 2021. Retrieved on 11 October 2021.
  3. 3.0 3.1 We need new stories. University of Sydney. Retrieved on 25 October 2021.
  4. Malik. "'I felt a nausea of fury' – how I faced the cruelty of Britain's immigration system", The Guardian, 5 March 2018. Retrieved on 25 October 2021.
  5. Nesrine Malik. Curtis Brown. Retrieved on 3 September 2019.
  6. Zavadski. "A Guide to Charlie Hebdo Opinions", New York Magazine, 8 January 2015. Retrieved on 17 May 2017.
  7. Schuessler (4 May 2015). Charlie Hebdo Award at PEN Gala Sparks More Debate. The New York Times. Retrieved on 3 September 2019.
  8. Nesrine Malik. Foreign Policy. Retrieved on 17 May 2017.
  9. Cornish (29 April 2016). 'The Guardian' Launches New Series Examining Online Abuse. NPR.org. Retrieved on 17 May 2017.
  10. Gardiner. "The dark side of Guardian comments", The Guardian, 12 April 2016. Retrieved on 3 September 2019.
  11. Oborne (March 2018). "We do not Report Fairly on Muslims". British Journalism Review 29 (1): 29–34. DOI:10.1177/0956474818764596. ISSN 0956-4748. 
  12. "Diversity in Media on Twitter", Twitter. Retrieved on 17 May 2017.
  13. GNM press office. "Guardian and Observer commentators win six Editorial Intelligence Comment Awards", The Guardian, 27 November 2017.
  14. Nesrine Malik. The Orwell Prize. The Orwell Foundation. Retrieved on 2 September 2019.
  15. British Journalism Awards 2019 shortlist announced. Press Gazette (5 November 2019).
  16. Caplan (5 January 2022). Here are the winners of the inaugural Silvers-Dudley Prizes for criticism and journalism. (en-US). Literary Hub. Retrieved on 7 January 2022.
  17. Winners of the Silvers-Dudley Prizes Revealed (en). Kirkus Reviews. Archived from the original on 7 January 2022. Retrieved on 7 January 2022.
  18. Creamer. "Royal Society of Literature aims to broaden representation as it announces 62 new fellows", The Guardian, 2023-07-12. Retrieved on 2023-07-13. (in en-GB)