Obafemi Awolowo Stadium

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Obafemi Awolowo Stadium
ama-egwuregwu
mba/obodoNaijiria Dezie
dị na ngalaba nhazi mpagharaIbadan Dezie
nhazi ọnọdụ7°21′58″N 3°52′27″E Dezie
occupantShooting Stars SC Dezie
Map

Obafemi Awolowo dị na okporo ụzọ Liberty, Ring Road na Ibadan, Nigeria, a kpọburu ama egwuregwu Liberty ruo n'afọ 2010. Ọ bụ ama egwuregwu bọọlụ ochie nke nwere ike ịbatacha puku mmadụ iri abụo na ise. [1]

Akụkọ[dezie | dezie ebe o si]

Mwube[dezie | dezie ebe o si]

E mepere ámá egwuregwu ahụ na 1960 [2] n'oge ọchịchị Chief Obafemi Awolowo bụ onye na -anọ dị ka onye isi ala mpaghara ọdịda anyanwụ n'oge ahụ. Akpọrọ ya aha ama egwuregwu Liberty iji kwanyere nnwere onwe Naịjirịa ugwu. Ọ bụ ndị ọrụ na -arụ ọrụ n'okpuru nlekọta nke ministri na -ahụ maka ọrụ na ụgbọ njem mpaghara, ámá egwuregwu ahụ bụ ebe egwuregwu dị na mpaghara ochie ọdịda anyanwụ nke Nigeria. Edebere ya na ngwụcha ngwụcha ndịda Ibadan na 1960 n'akụkụ ọnụ ugwu, ọ dịkwa nso n'akụkụ ụzọ na-eduga n'okporo ụzọ Ibadan-Abeokuta na Ibadan-Lagos.

Na mmalite,na ama egwurewgu a, agbanyeghị egwuregwu bọọlụ nke a chị ọkụ na nnukwu ama, enwekwara nnukwu ọ́dọ̀ ọgwụgwụ mmiri, ebe egwuregwu ime ụlọ, ọdọ mmiri, ogige maka tenis, voli, bọọlụ aka, bọọlụ basketi, họki, wdg [3]

Ịkụ ọkpọ[dezie | dezie ebe o si]

N'August 10, 1963, ámá egwuregwu ahụ hiwere mgba ịkụ ọkpọ nke mbụ nke ndị 'ụwa kpọrọ ọgụ na Afrịka . Emere egwuregwu a na mbido na July 13, 1963. Nke a bụ maka Midleweit Champiọnshi nke iweta ihe nrite ụwa nụ beltu ma ọgụ iweta ihe nrite dịrị n'etiti onye Naijiria bụ Dick Tiger na Gene Fullmer nke USA.

Iko mba Afrịka[dezie | dezie ebe o si]

Na 1980, ámá egwuregwu ahụ kwadoro ọtụtụ egwuregwu n'oge iko mba Afrịka, gụnyere ọkara nke ikpeazụ n'etiti Algeria na Egypt .

FIFA World Youth Championship[dezie | dezie ebe o si]

Na 1999, a họpụtara ama egwuregwu Liberty tinyere ámá egwuregwu asatọ ndị ọzọ na Naịjirịa ka ha wee kwado asọmpi 1999 FIFA World Youth Championship . [4] Ama egwuregwu ahụ kwadoro egwuregwu Group C niile, otu n'ime agba nke agba iri na isii, na otu egwuregwu nke bu nke ọkara onye emeriri ọ pụọ.

Mkpọhari Aha[dezie | dezie ebe o si]

Na Nọvemba 12, 2010, a kpọgharịrị ámá egwuregwu ahụ aha dị ka ámá egwuregwu Obafemi Awolowo. Onye isi ala Naịjirịa n'oge ahụ, Dọkịta Goodluck Jonathan okwupụtara aha ọhụrụ nke ámá egwuregwu ahụ, mgbe ọ gara ileta nwunye Chief Obafemi Awolowo, Chief (Oriakụ. ) Hannah Awolowo . [5]

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. https://www.flickr.com/photos/jujufilm/5885877459/in/photolist-9Y7EiR-9YatA9-9YaXFd-9Y81ic-9YaPjW-9YaXa3-9Y7Xxp-9YaLo5-9YaMJo-9YaYVG-9Y8276-9YaM6j-9Y82S6-9YaNy7-9YaQfU-9YaZxW-9YaR6E-9YavZE-9Y7PLH-9YaFnA-9YaDpd-9Y7DCk-9Y7ChT-9Yauey-9YaEgY-9YaAbu-9YaGkQ-9Y7GcM-9Y7AAg-9Y7CXB-9YaBzU
  2. Wolfgang F. Stolper, Clive S. Gray (2003). Inside Independent Nigeria: Diaries of Wolfgang Stolper, 1960-1962. Ashgate Publishing, Ltd.. ISBN 0-7546-0995-2. 
  3. http://www.tribuneonlineng.com/will-nigerias-first-obafemi-awolowo-stadium-come-back-life/
  4. Ajimotokan. "World Cup Venue: Crowd Attitude Counts against Ibadan", This Day Live, 22 April 2012. Retrieved on 18 June 2012.
  5. "Jonathan Renames Liberty Stadium in Ibadan after Awolowo", The African Examiner, 14 November 2010. Retrieved on 18 June 2012.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]