Oby Onyioha

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Oby Onyioha
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoOby Onyioha Dezie
Aha ọmụmụOby Onyioha Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye na-abụ abụ, odee egwu Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
ngwa egwuolu egwụ Dezie
ụdịpop music Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Oby Onyioha bụ onye Nigerian na-agụ egwu ma n'ede kwa egwu nke eji egwu mbụ ya ọ kpọrọ 'I Want To Feel Your Love' nke dalụ ụda na Naijiria na mgbe afọ 1980 nwe mara.

Ka-afọ ole na ole na ọtụtụ oge gachara O tiputara egwu mbụ ya ahụ, Ọnyioha kwuru na ya ga-aputa n'ọgbọ ọzọ site n'inwepụta alụbọm nke abụọ bụ 'Break-It'.

Ndụ mbido[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Oby na Lagos ma zụlite ya n'akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Naijiria. Nna ya bụ K. O.K Onyioha bụ onye isi ndi Godian Religion. Onyioha malitere agụmakwụkwọ prịmarị ya na St Stephens Primary School dị n'Umuahia, Abia Steeti ebe osi gaa Queen's School, Enugu maka agụmakwụkwọ sekọndịrị. Ọ gara n'ihu nweta nzere BA na B.sc na agụm akwụkwọ History na Business Management., ma nwetekwa nzere Masters na Doctorate na mmụta Social Anthropology. [1]

Ọrụ egwu[dezie | dezie ebe o si]

1981: 'I Want To Feel Your Love'[dezie | dezie ebe o si]

Onyioha bu ụzọ bata n'ọgbọ egwu na Naijiria site n'enwepụta alụbọm ya bụ ' I Want To Feel Your Love ' nke Ọ bara aha egwu ya ahụ dalụ-ụda. A na-ewere otu egwua ọ kpọrọ 'I Want To Feel Your Love' dịka otu n'ime egwu kachasị egwu n'oge ya na Niajiria. [2]

Alụbọm ahụ dalụ-ụda ma nwuo-enwu n'oge afọ 1980 na 90, ihea n'ile mere n'oge ana eche na egwu awantịlọ bụ egwu ndị Ọcha.

Ọnyioha gbara mbọ pụtara ihe n'ime ka ndi mmadu ghọta na iti egwu abụghi maka ụmụ nwanyi na-amachaghị akwụkwọ. [3]

Egwu Oby Onyioha-ahụ a kpọrọ ' I Want To Feel Your Love' dalụ-ụda ma ga nke ọma nke kpatara na erere 'vinyl' ya nari dọla asaa na mmemme okushon na mba Europe. [4]

Ntughari[dezie | dezie ebe o si]

  1. My Biography. Archived from the original on 4 March 2016. Retrieved on 27 August 2015.
  2. 360 Listening EAR Independence Day Special – Nigeria’s Top 50 Songs(1960-2010). Oye AKD. Archived from the original on 2 August 2015. Retrieved on 26 August 2015.
  3. On: The Quincy Jones of Nigeria, woman singers and the London Era of Nigerian music. Retrieved on 26 August 2015.
  4. Oby Onyioha Thrilled Our Fathers With 'I Want To Feel Your Love'. Retrieved on 26 August 2015.