Ofe onugbu
| Obere ụdị nke | ofe, ofe anụ |
|---|---|
| Akụkụ nke | Nri Igbo |
| Akara ala | Ofe onugbu |
| Mba/obodo | Naijiria |
| Mba osi | Naijiria |
| Okpomọkụ nri | oku, obere ọkụ |
| Ụdị nri | isi nri |
Ofe onugbu, nke á makwaara dị kà bitterleaf soup nà bekee, bụ nri ọdịnala nke Ndị Igbo nọ na mpaghara ndịda ọwụwa anyanwụ nkè Naịjirịa. A na-ejikọta ya na Ndị Anambra, a na-ewerekwa ya dị ka ofe ala.[1] A na-erikarị ofe ahụ ya na nri dị ka akpụ, garri, nri ji, na ihe ndị ọzọ a na-elo elo.[2]
Mmalite
[dezie | dezie ebe o si]A na-ewere ofe onugbu dị ka nri ọdịnala nke ndị Anambra na ndịda ọwụwa anyanwụ Naijiria. Ofe áhụ, nkè e ji onugbu sie, nwèrè ihe dị mkpá màkà ọdịbendị n'ọtụtụ obodo Igbo ma na-akwadebe ya maka nri ezinụlọ, mmemme, na oge pụrụ iche. Ọ bụ ezie na ọ bụ́ nri ndị Anambra, ọtụtụ ụdị ofe onugbu dị n'ofe mpaghara ahụ. [3] Ihe dị iche iche ndị a nwere ike ịgụnye:
- Iji achi ma ọ bụ ede ụrị dị ka ihe na-eme ka ọ rọ arọ
- Mmasị maka ogologo onugbu ma ọ bụ gbugbu gbarisiri agbarisi, na
- Nhọrọ iji ogiri sie ofe
Ihe ndị eji esi ya
[dezie | dezie ebe o si]Ihe ndị a na-eji esi ofe onugbu bụ [4]
- Onugbo
- Ede uri
- Mmanụ akwụ ma ọ bụ mmiri akwụ
- Ngwakọta nke anụ, azụ okpo, okporoko, afọ anụ, ma ọ bụ akpụkpọ ehi
- Azụ̀ crayfish e kwopụtara
- Ose
- Ogiri Igbo
- Nnu
Isi ofe onugbu
[dezie | dezie ebe o si]

Isi ofe onugbu na-amalite site na ihazi onugbu. A na-ahna ya anwụ igbochi ya igbarisi ma a na-afo ya. A na-asa ya ugboro ugboro iji belata ilu ya. Mgbe a sachara onugbu ahu a-na ata ya iji hụ na ọ dị go mma.
A na-asa ede ụrị na mkpụrụ akwụ ma sikota ya ruo mgbe ha ghere aghe. Ozugbo esichara ya, a na-azapụ mmiri ahụ. A na-asụ mkpụrụ akwụ ahụ wee mepụta mmírí akwụ á ga-eji sie nri. A na-ewepụ azụ ede ma jiri ikwe suọ ya asuọ ma debe ya n'akụkụ ka a jiri ya mee ka ofe roọ̀ aroọ̀
A na-asa anụ na ihe ndị ozo, nke nwere ike ịgụnye anụ ehi, anụ ewu, afọ anụ, akpụkpọ ehi, na azụ, tinye nnu na ihe na-ihe ndi ọzọ, ma sie ya ruo mgbe ọ dị nro iji mepụta mmiri anụ. [5]
A na-awụnye mmiri akwụ ahụ emepụtara n'ime ite, na-esote mmiri a chọrọ iji sie ofe, ma hapụ ya ka ọ suọ. A na-etinye ihe oriri ndị dị ka ose, crayfish, nnu, ogiri igbo, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ eji esi nri. A na-etinye anụ, azụ, okporoko na ihe ndị ọzọ e siri esi na ofe ahu, mgbe nke ahụ gasịrị, a na-etinye ede uri a sụrụ asụ obere obere iji rụọ ọrụ dị ka ihe ga-eme ka ofe ahụ roọ̀ aroọ̀.
A na-ahapụ ofe ahụ ka ọ suọ ruo mgbe ede gbariri ma mee ka ọ roọ̀ aroọ̀. N'ikpeazụ, a na-etinye onugbu ahụ a sachara ma hapụ ya ka ọ ghee. Ozugbo esichara ya nke ọma, ofe onugbu a dị n'mma oriri.
Nkeputa nri
[dezie | dezie ebe o si]A na-eri ofe onugbu na-ekpo ọkụ ma ọ bụ nke na-ekpo obere ọkụ na ụdị nri dị iche iche nke Naijiria. A na-ejikarị utara akpụ eri ya, nke bụ nhọrọ a ma ama n'ọtụtụ ezinụlọ Anambra. Otú ọ dị, ụfọdụ ndị na-ahọrọ ịji utara jị , garri, Semolina, utara ede, ma ọ bụ ọka wit eri ya, ma daberekwa na mmasị ha.
Edensibia
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Uguru (2017-08-28). Delicious Bitterleaf Soup (Ofe Onugbu) (en-US). My Diaspora Kitchen. Retrieved on 2025-12-03.
- ↑ Jemimah (2016-04-10). Bitter Leaf Soup - Ofe Onugbu (en-GB). Sisi Jemimah. Retrieved on 2025-12-03.
- ↑ Adasrecipes (2017-08-27). Bitter leaf Soup(Ofe Onugbu) Recipe | Ada's Recipes (en-US). Retrieved on 2025-12-03.
- ↑ Nigerian Bitterleaf Soup | How To Make Nigerian Soups (en-US). All Nigerian Foods. Retrieved on 2025-12-03.
- ↑ Bitterleaf Soup (Ofe Onugbu) (en-US). All Nigerian Recipes. Retrieved on 2025-12-03.
Hụkwa
[dezie | dezie ebe o si]- Ndepụta ofe
- Ofe nsala
- Ofe achara