Ogbonnaya Onu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ogbonnaya Onu
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoOgbonnaya Onu Dezie
Aha ọmụmụOgbonnaya Onu Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1 Disemba 1951 Dezie
Ebe ọmụmụOhaozara Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya11 Eprel 2024 Dezie
Ebe ọ nwụrụAbuja Dezie
Asụsụ obodoAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa Dezie
Asụsụ ọ na-edeBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, chemical engineer Dezie
Ọkwá o jiGovernor of Abia State, Secretary to the Government of the Federation, Minister of Science and Technology, Minister of Science and Technology Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Lagos, University of California, Berkeley Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịAll Progressives Congress Dezie
agbụrụNdị Igbo Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
Onye òtù nkeNigerian Academy of Science Dezie
na-esochiFrank O. Ajobena Dezie
nọchiriChinyere Ike Nwosu Dezie
Ihe nriteFellow of the Nigerian Academy of Science Dezie
nnọchiaha nkeonweL485 Dezie
Ogbonnaya Onu

Ogbonnaya Onu (amụrụ na Disemba 1, 1951) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị Nigeria, onye edemede na ọnye injinia. Ọ bụ onye ọchịchị gọvanọ mbụ nke Abia steeti na oge gara aga ọbụ Minista Sayensị na Teknụzụ, Federal Republic of Nigeria. [1]

Ndụ na Mmụta[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Ogbonnaya Onu na ụbọchị nke mbụ nke ọnwa Disemba na afọ 1951 na ezinụlọ nke onye kacha dị elu, onye lagoro mmụọ bụ Eze David Aba Onu (Eze Adu nke Uburu) na Ohaozara Local Gọọmenti Ala nke Ebonyi Steeti, Naijiria . [1] Ọ malitere agụmakwụkwọ ya na Izzi High School dị na Abakaliki, isi obodo Ebonyi State. N’ebea, o nwetara akara nke mbụ site na iche na Akwụkwọ Asambodo West Africa ya . [2] Ọ lere ule nke ụlọ akwụkwọ sekọndrị na College of Immaculate Conception (CIC) Enugu, Ọ gụsịrị akwụkwọ dị ka nwa akwụkwọ kacha mma n'ozuzu ya. [3] Ọ gara Mahadum nke Lagos wee nweta akara mmụta klas mbụ ya na Chemical Engineering na afọ 1976. Ọ gara maka akwukwo dọkịta ya na Mahadum California, Berkeley wee nweta PhD na injin na kemikalu na afọ 1980. [4]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Ọrụ Nkụzi[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ na Mahadum Lagos, Ogbonnaya Onu ghọrọ onye nkụzi na Seminari nke St. Augustine, Ezzamgbo, Ebonyi Steeti. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ doctoral ya na Mahadum California, Berkeley, Dr. Onu ghọrọ onye nkuzi na Ngalaba kemikalu ịnjinia na Mahadum Port Harcourt, ma mesịa ghọọ ọsụ ụzọ nke Ngalaba ahụ. Ọ rụkwara ọrụ dị ka onye na-emebu Dean nke ngalaba nke injinịa ma ahọpụtakwa a ya dika onye otu Kọmitii na-achị isi nke Mahadum ahụ. [5]

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

beOgbonnaya Onu bidoro ọrụ Nchịkwa ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya dịka onye chọrọ ntuliaka oche ochie Senatorial na Imo Steeti n'elu ikpo okwu nke National Party of Nigeria (NPN) . [5] Ọ zoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị maka ọkwa nke Gọvanọ nke Abia State na afọ 1991 n'okpuru nchedo nke National Republican Convention ma tụrụ ugo mmeri. E dọrọ ya iyi ọrụ dịka onye nchịkwa izizi nke Ọchịchị steeti ahụ na Jenụwarị n'afọ 1992. [6] Ọ bụ onye isi oche mbụ, ogbako nke ndị gọvanọ Naijiria a họpụtara n'afọ 1999, ọ bụ onye na-eburu Onye Ndú ọchịchị ọkọlọtọ maka ọchịchị mmadụ niile mana ọ kwụsịrị ọkwá ya n’aka Chief Olu Falae mgbe ndị otu ya na Alliance for Democracy meriri Olusegun Obasanjo nke PDP . Ọ ghọrọ Onye isi oche nke National Party nke Ndị Nigeria niile n'afọ 2010. [7] N’afọ 2013, ya na ndị otu ya ( ANPP ) jikọtara ọnụ na Action Congress of Nigeria (ACN), Congress for Progressive Change (CPC), Democratic People's Party (DPP) na ụfọdụ ndị otu All Progressives Grand Alliance (APGA) mepụtara nke ọma. All Progressives Congress (APC) . N’ọnwa Nọvemba afọ 2015, Onye isi ala bụ Muhammadu Buhari họpụtara ya ka ọ bụrụ Minister nke Sayensị na Nkà na ụzụ. [8] [9] na 21 Ọgọst 2019, Ejiri Mịnịsta nke Sayensị na Nkà na ụzụ nke Onye Isi Ala Muhammadu Buhari dọrọ ya n' iyi ọrụ ọzọ.

Ihe nrite na mmepụta[dezie | dezie ebe o si]

Dr. Onu bụ onye ama ama na Council of the Regulation of Engineering in Nigeria, onye otu ụlọ ọrụ Naịjirịa nke Injinia, [10] nke ndị otu Naijiria nke KemikaluII

Dr. Onu bụ onye ama ama na Council of the Regulation of Engineering in Nigeria, onye otu ụlọ ọrụ Naịjirịa nke Injinia, ☃☃ nke ndị otu Naijiria nke ndi Kemikalu ịnjinia . [11] Dị ka onye Mịnịsta nke Sayensị na Nkà na ụzụ, ọ malitere Izuka Nkà na Ụzụ n'ala anyi nke mere mmemme mbụ ya na mkpụrụ ụbọchị ịrị na atọ wee rụọ na mkpụrụ ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Eprel n'afọ 2017 na Abuja na mgbe ahụ na March n'afọ 2018 iji gosipụta ndị na-emepụta ihe na ihe nchọpụta. O binyere aka na ụlọ ọrụ mba atọ maka ibubata teknụzụ na nri. O tinyekwara aka na NASCO na nkwekọrịta iji na emepụta bisikiti n'snye ihe na ahụ na nnukwu na nnukwu. N'afọ 2016, o bidoro ihe mmemme nke akpọrọ “774 YOUNG NIGERIAN SCIENTISTS PRESIDENTIAL award PRESIDENTIAL (774-YONSPA)” nke ga agba ume ma zụlite mmasị ndị ntorobịa nke Naijiria na sayensị, teknụzụ, na ihe ọhụrụ (STI). [6]

Esemokwu[dezie | dezie ebe o si]

Dr Onu kwuru na Naijiria ga-ebido imepụta mkpụrụedemede ime obodo [12] erule n'afọ 2018 nke o kwuru na ọ ga-eweta ọrụ puku iri ano. [13] [14] Site n'afọ 2019, ekwuputabeghi ụlọ nrụpụta pensụ. [6] N'afọ 1999, tupu ntuli aka Onye isi ala na mmekorita nke ndi mmadu nile na ochichi nke ochichi onye kwuo uche ya, Dr. Onu tinyere aka na esemokwu nke juputara na APP / AD hoputara Chief Olu Falae dika onye nchikota onye isi ala. [15]

Hụ kwa[dezie | dezie ebe o si]

  1. Profile of Dr. Ogbonnaya Onu, Minister of Science and Technology (en-US) (2019-08-21).
  2. ‘The Ogbonnaya Onu that I know’ (en-US) (2015-05-16).
  3. "President Buhari Appoints New SGF (UPDATED)", 31 May 2015.
  4. "Ogbonnaya Onu and the reward of perseverance", 28 July 2015.
  5. 5.0 5.1 "‘The Ogbonnaya Onu that I know’", 3 September 2015.
  6. 6.0 6.1 6.2 "ANALYSIS: How science and technology ministry fared under Ogbonnaya Onu in three years", 4 January 2019. Retrieved on 29 January 2019.
  7. "Nigeria: How ANPP Chairman Emerged", 24 September 2010. Retrieved on 29 January 2019.
  8. "See full list of Buhari’s ministers and their portfolios", 11 November 2015. Retrieved on 29 January 2019.
  9. "Nigeria gets new cabinet after six-month delay", 12 November 2015. Retrieved on 29 January 2019.
  10. The Nigeria Academy of Engineering :: promoting excellence in technology and engineering training and practice to ensure the technological growth and economic development of Nigeria. Archived from the original on 6 September 2017. Retrieved on 13 March 2019.
  11. NSCHE - Keynote Speakers. Archived from the original on 7 October 2018. Retrieved on 13 March 2019.
  12. "FG will generate 3.4m jobs through pencil production, others — Minister", 7 January 2016. Retrieved on 29 January 2019.
  13. "Nigeria to start production of pencils, says Onu", 30 December 2015. Retrieved on 29 January 2019.
  14. "Nigeria to start local production of pencils in two years – Onu", 30 December 2015. Retrieved on 29 January 2019.
  15. "Nigeria: Onu Is A Liar, Says Waziri", 17 February 1999. Retrieved on 29 January 2019.