Ogbugbu ndị mmadụ na Baga n'afọ 2013
Mgbukpọ ndị mmadụ na Baga malitere na 16 Eprel 2013 n'obodo nta Baga, Naijiria, na steeti Borno, mgbe e gburu ihe ruru ndị nkịtị narị abụọ, merụọ ọtụtụ narị ndị mmadụ ahụ, na ihe karịrị ụlọ puku abụọ na azụmaahịa ruru ọtụtụ nde Naira ka emebiri.[1][2] Ndị gbara ọsọ ndụ, ndị ọrụ obodo, na òtù ndị na-ahụ maka ihe ndị ruuru mmadụ boro Ndị agha Naijiria ebubo na ha gburu ogbugbu ahụ; ụfọdụ ndị ọrụ agha boro ndị òtù nnupụisi Boko Haram ụta.[2]
Ihe ndị mere n'oge gara aga
[dezie | dezie ebe o si]Ọtụtụ puku mmadụ anwụọla n'ọgụ na Naịjirịa kemgbe mmalite nke ọgbaghara nke òtù nnupuisi Biko Haram kpatara n'afọ 2009, [3] nke malitere n'ebe ugwu Naịjiria. E gburu onye ndú nke nnupụisi ahụ, Mohammed Yusuf, na Maiduguri nke Borno Steeti na 2009.
Dị ka The New York Times si kwuo, ndị agha Naijiria ejirila "ụkpụrụ ala ọkụ" mee ihe n'ọgụ ha na-alụso Boko Haram, nke a na-adị egbu ndị nkịtị mgbe ha na-arụ ọrụ na mpaghara ndị dara ogbenye. A na-ejikarị ogbugbu ndị mmadụ tupu ogbugbu nke Baga dịka ntaramahụhụ megide ndị nkịtị, na-enweghị ihe ọ bụla iwu na Naijiria.[2]
Onye isi nke Multinational Joint Task Force Brigadier General Austin Edokpaye boro ndị bi na Baga ebubo na ha na-echebe ndị òtù Boko Haram tupu mwakpo ahụ.[4] Baga bụ obere obodo e ji ịkụ azụ mara n'akụkụ ọdọ mmiri Chad, [5] nso n'ókè Chad na Niger.
Ihe Ndị Mere
[dezie | dezie ebe o si]N'uhuruchi nke 16 Eprel, ndị òtù Boko Haram mesoro ndị agha gọọmentị n'otu ụlọ ọrụ ndị agha na mpụga Baga, gbuo otu n'ime ha.[2]Dị ka ndị bi ebe ahụ si kwuo, ndị agha kpokọọrọ ọtụtụ ndị agha ọzọ na ụgbọala eji aga ọgụ laghachi.[2] Ndị agha ka a na-ekwu na ha ji mmanụ ụgbọala wụọ n'ọtụtụ ụlọ ndị dị na Baga ma gbaa obodo ahụ ọkụ, na-agbagbu ndị obodo ahụ ndị nwara ịgbapụ.[2][6] Mmiri riri ụfọdụ ndị na-anwa ịgbaga n'ime Ọdọ Mmiri Chad n'ebe ahụ, ebe ndị ọzọ nwerenwuru ike ịgbalaga n'ime ọhịa ndị gbara ya gburugburu.[2] Dị ka ndị bi ebe ahụ si kwuo, ndị agha ahụ gara n'ihu na-ere ụlọ ọkụ na Baga na 17 Eprel. [6][7]
Brigadier General Austin Edokpaye kwuru na naanị ndị nkịtị mmadụ isii na otu onye ọlụagha ka e gburu ebe ndị ọlụagha gbùrù ndị Boko Haram mmadụ iri atọ.[7][4] Ọ gakwara n'ihu kwuo na naanị ụlọ ájá iri atọ ka a gbara ọkụ nke n'ọ bụkwa ngwá ọgụ ndị Boko Haram malitere ọkụ ndị ahụ.[7][4] Ndị bi n'obodo ahụ na ndị ọrụ obodo na-ebo ebubo na ihe ha ka mmadụ narị abụọ ka e gburu, na gbaakwa ụlọ karịrị puku abụọ ọkụ.[7][6][2] Ndị ihe mere ka a kọrọ na ha karịrị n'ụmụaka na ndị agadi.[2] Ebe 17 Eprel, ndị mmadụ merụrụ ahụ dị òtù narị na iri itoolu na atọ ka e bugara n'ụlọ ọgwụ obodo ahụ ịnata ọgwụgwọ.[7] Foto ndị e si na satalaịt see nke Human Rights Watch nyochara na-egosipụta na opekatampe ụlọ dị puku abụọ, narị abụọ na iri asaa na ise ka e mebiri, ebe ụlọ ndị ọzọ dị otu narị na iri abụọ na ise ka a labigara n'iyi oke..[6]
Mmeghachi omume
[dezie | dezie ebe o si]Mgbe ogbugbu ahụ gasịrị, gọọmentị Naijiria nọ n'okpuru nrụgide siri ike site n'aka gọọmentị mba ụwa na ụlọ ọrụ mgbasa ozi gasị, na-eduga nzukọ omeiwu Naijiria ịkpọ oku maka ime nnyocha.[2] Ndị nta akụkọ na-anwa ịbanye n'obodo ahụ n'onwe ha ka ndị agha Naijiria gbochiri.[2]
Ngọnahụ nke Ndị agha Naijiria
[dezie | dezie ebe o si]Brigadier General Chris Olukolade kwuru na onye ọ bụla na-ata ndị agha Naijiria ụta nwere ọmịiko na Boko Haram, nke o kwuru na ọ bụ ha kpatara ogbugbu ahụ n'ihu na ha si n'ime obodo ahụ gbaa ndị agha gọọmentị égbè.[2]
Nkatọ gọọmentị Mba US
[dezie | dezie ebe o si]Onye na-anọchite anya osote onye na-ekwuchitere Ngalaba Na-ahụ Maka Ọchịchị nke United States bụ Patrick Ventrell, na 22 Eprel 2013, katọrọ esemokwu dị n'etiti ndị ọrụ nchekwa Naijiria na ndị agha Boko Haram na Baga, na-agba ndị ọchịchị ume ịkwanyere ikike mmadụ ùgwù. [8]
Nnyocha nke Naịjirịa Tiri Iwu Ya
[dezie | dezie ebe o si]Onye isi ala Naịjirịa Goodluck Jonathan site na onye ndụmọdụ ya pụrụ iche na mgbasa ozi, Reuben Abati, nyere iwu ka e mee nnyocha zuru òkè banyere ndị nkịtị nwụrụ n'agha dị n'etiti Boko Haram na ndị agha Naịjiria na ngwụsị izu.[9]
Nnyocha nke National Human Rights Commission
[dezie | dezie ebe o si]National Human Rights Commission nke Naịjirịa mara ọkwa na 29 Eprel 2013 na ọ ga-eme nchọpụta banyere ihe merenụ. [10] Na Jun 2013, kọmitii ahụ wepụtara akụkọ nwa oge. Akụkọ ahụ kwuru na kọmitii ahụ enweghị ike ileta Baga n'ihi enweghị ike nke ndị ọrụ nchekwa iji hụ maka nchekwa nke ndị ọrụ kọmitii. Otú ọ dị, akụkọ ahụ rụtụrụ aka n'akụkọ ka ihe mere nke ndị uwe ojii nke chọpụtara na ndị agha nọ na Baga "malitere ịgba égbè aghara aghara n'ebe onye ọ bụla a hụrụ, nakwa na ndị agha "gbara ogige ise dị na Baga ọkụ kpamkpam".[11]
Hụkwa
[dezie | dezie ebe o si]- Mgbukpọ ndị mmadụ nke afọ 2015 na Baga
- Ndepụta nke ogbugbu ndị mmadụ na Naịjirịa
- Ndepụta nke ihe omume ndị na-eyi ọha egwu, Jenụwarị-Jun 2013
Edensibịa
[dezie | dezie ebe o si]- Human Rights Watch (1 Mee 2013), Nigeria: Nnukwu mbibi, Ọnwụ site na mwakpo ndị aghaNaịjirịa: Nnukwu mbibi, Ọnwụ site na mwakpo ndị agha
- The National Human Rights Commission (June 2013), Ihe mere na Baga na ọnọdụ dị na North-East Nigeria: Nnyocha na Akụkọ N'oge
- ↑ Baga Massacre: Crimes against humanity by JTF?. Nigeria Intel. Archived from the original on 12 May 2013. Retrieved on 6 October 2014.
- 1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 Nossiter. "Massacre in Nigeria Spurs Outcry Over Military Tactics", The New York Times, 29 April 2013. Retrieved on 29 April 2013.
- ↑ Dixon. "Dozens killed in gun battles in northern Nigeria", Los Angeles Times, 22 April 2013. Retrieved on 2 May 2013.
- 1 2 3 "37 Not 185 Died in Baga Clash, We Were Never Unprofessional – Army", 23 April 2013. Retrieved on 13 July 2015."37 Not 185 Died in Baga Clash, We Were Never Unprofessional – Army". Channels Television. 23 April 2013. Retrieved 13 July 2015.
- ↑ Akinlotan. "Baga massacre: Jonathan's words return to haunt him", The Nation (Nigeria), 28 April 2013. Retrieved on 29 April 2013.
- 1 2 3 4 "Nigeria: Massive Destruction, Deaths From Military Raid", Human Rights Watch, 1 May 2013. Retrieved on 13 July 2015."Nigeria: Massive Destruction, Deaths From Military Raid". Human Rights Watch. 1 May 2013. Retrieved 13 July 2015.
- 1 2 3 4 5 Ibrahim. "Baga massacre: Survivors tell their stories", 27 April 2013. Retrieved on 13 July 2015.
- ↑ "...UN, US, Others Condemn Killings", 24 April 2013. Retrieved on 13 July 2015.
- ↑ "Jonathan orders probe of Baga Massacre", 22 April 2013. Retrieved on 13 July 2015.
- ↑ Ekott. "Nigeria's Human Rights Body Launches Broad Inquiry into Baga Massacre", 30 April 2013. Retrieved on 13 July 2015.
- ↑ (June 2013) The Baga Incident and the Situation in North-East Nigeria: An Interim Assessment and Report. The National Human Rights Commission, 14, 18–19. Retrieved on 13 July 2015.