Ogoja

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Ogoja bụ ọchịchị ime obodo dị na kurọsụ Riva Steeti, Nigeria . [1] Isi ụlọ ọrụ ya bụ obodo Ogoja dị n'ebe ugwu ọwụwa anyanwụ nke dị nso na okporo ụzọ awara awara A4 na39 . [2]

Ọ nwere mpaghara 972 km² ya na ọnụ ọgụgụ mmadụ ruru otu puku narị iri asaa na otu, narị iteghete na otu na ngụkọ nke afọ 2006. [3]

Katidral St. Benedict ya bụ ụlọ nsọ nke Dayọsis Roman Katọlik nke Ogoja . [4]

Koodu nzipu ozi nke mpaghara ahụ bụ narị ise na iri ise. [5]

Obodo ahụ bụ otu n'ime ógbè ndị ahụ tupu oge ọchịchị. [6] Ọ nwere ọtụtụ mpaghara agbụrụ, gụnyere Ishibori (obodo a nwere agbụrụ dị iche iche dịka Uhmuria, Ikaptang, Ikajor, Ishinyema, Ikariku, Imerakorm) na Igoli dị ka obodo etiti. Mbube, ịbụ otu n'ime ebo ndị bụ isi, nwere obodo dị iche iche, gụnyere: Odajie, Adagum, Ekumtak, Idum, Ojerim, Egbe, Ogberia Ogang na Ogberia Ochoro, Oboso, Benkpe, Edide, Bansan, Aragban, Nkim na ndị ọzọ. Isi iyi ndụ ha bụ nri ugbo, ọkachasị ịkọ ugbo akpu, ji, mmanụ nkwụ, ite mmanya nkwú n' ihe ndị ọzọ [7] Ekajuk, bụ otu n'ime ndị isi agbụrụ dị n' okpuru ọchịchị Ogoja. E kewara ya ngalaba nke mbụ na ngalaba nke abụọ ma gụnye nnukwu obodo dịka Nwang, Ekpogrinya, Esham, Egbong, Nnang, Ewinimba na Bansara (ndị bụ mkpokọta obodo [8] )

Ọchịchị dị ugbu a[dezie | dezie ebe o si]

Ugbu a, Ogoja nwere mpaghara aka gọọmenti atọ ha bụ: njikwa, omebe iwu na omebe ikpe. Ogwe njikwa bụ onye a họpụtara ahọpụta, onyeisi oche, osote onye isi oche na ndị nlekọta. Ọ bụ onyeisi oche na-ahọpụta ha ma bụrụ ndị ụlọ omebe iwu kwadoro. Onye isi oche gara aga bụ Madam Rita Atom site na afọ 2013 ruo n'afọ 2016. Emebeghi chọpụta, ebe osote onye isi oche bụ Maazị John Orim ka nọkwa n'oche. Mpaghara aka nkendị omebe iwu nwere ndị kansụl iri na-anọchite anya ngalaba iri na Ogoja. Onye isi ụlọ omebe iwu bụ Mr Austin Ayungbe - Ekajuk wóọdụ II, ebe osote onye isi ala bụ Mr Thomas Ori - Mbube ọwụwa anyanwụ wọọdu II. Ndị ọzọ bụ; Nwada Sarah Amu – Mbube ọwụwa anyanwụ wọọdụ I, Mr Tom Egbang – Mbube ọdịda anyanwụ wọọdụ I, Mr Peter Odu – Mbube ọdịda anyanwụ wọọdụ II, Mr Vincent Uga – Nkum-Irede wọọdụ, Mr Iyang Nnang – Nkum-Iborr wọọdụ, Mr Paul Aganyi – Ekajuk wọọdụ 1, Mr Anthony Ntaji - Urban ward I, Mr Wogor Umari - Urban wọọdụ II. Ndị isi niile nọ n'ọchịchị na ndị omebe iwu bụ ndị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị People's Democratic Party (PDP). Oge ha ga-agwụ na Disemba nke afọ 2016. Ọ bụ onye isi ọkaikpe nke Ogoja bụ onye isi ya. Ogoja bu obodo nwere otutu ezi na ulo dika: Ndi MOKOSHE's ndị Egabe's , ndị Ogabi's, ndi Aggrey's, ndị Ntaji's, ndị Ogabo's, ndị Ukpo's, ndị Uga-ifu's na ndị Amu's.

Ogoja bụ ụlọ ọka mmụta sayensị nke fedụra kọleji

Ụgbọ njem[dezie | dezie ebe o si]

Ụgbọ elu Bebi, obere ọdụ ụgbọ elu, dị nso na Ogoja.  

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Fig. 4: Map of ogoja local government area (en). ResearchGate. Retrieved on 2021-09-11.
  2. GPS coordinates of Ogoja, Nigeria, DMS, UTM, GeoHash - CountryCoordinate.com. www.countrycoordinate.com. Retrieved on 2021-09-11.
  3. Ogoja, Nigeria Tourist Information (en-US). www.touristlink.com. Retrieved on 2021-09-11.
  4. St. Benedict's Cathedral. www.finelib.com. Retrieved on 2021-09-11.
  5. Post Offices- with map of LGA. NIPOST. Archived from the original on November 26, 2012. Retrieved on 2009-10-20.
  6. Manton (January 2008). ""The Lost Province": Neglect and Governance in Colonial Ogoja" (in en). History in Africa 35: 327–345. DOI:10.1353/hia.0.0010. ISSN 0361-5413. 
  7. Ogoja | Nigeria (en). Encyclopedia Britannica. Retrieved on 2021-09-11.
  8. Ogoja Town in Cross-River Nigeria Nkum is another major clan comprising Alladim, Ukpe, Ukpagada, Igodor (all regarded as Nkum Iborr) while Ndoo, aburumbede, ishiaya, ishindede and Nfamju (regardedbas Nkum Irede)Guide. www.nigeriagalleria.com. Retrieved on 2021-09-11.