Olaf Glaeseker
Olaf Glaeseker | |
|---|---|
| Press Secretary of the President of Germany | |
| In office 30 June 2010 – 22 December 2011 | |
| President | Christian Wulff |
| Personal details | |
| Born | 1961 (age 64–65) |
| Political party | Christian Democratic Union |
| Alma mater | German Sport University Cologne |
| Profession | Journalist |
Olaf Glaeseker (amụrụ n'afọ 1961 n' obodo Oldenburg) bụ onye ndụmọdụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke Germany, onye nta akụkọ, onye mgbasa ozi, na ezigbo onye isi ala Christian Wulff. Ọ rụrụ ọrụ dị ka odeakwụkwọ mgbasa ozi nke onye isi ala site na 30 onwa Jun afọ 2010 ruo 22 onwa December afọ 2011. A katọrọ ya maka ebubo nrụrụ aka, ma gbaa arụkwaghịm izu ole na ole tupu onye isi ala n'onwe ya agba arụkwaghịma.[1][2]
Mgbe o rụsịrị ọrụ agha, ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Egwuregwu nke German di na Cologne . [3] Dị ka nwa akwụkwọ, ọ rụrụ ọrụ ọtụtụ maka ọtụtụ akwụkwọ akụkọ mpaghara, wee bụrụ onye nnọchi anya ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Bonn maka Augsburger Allgemeine Zeitung . [4]
N'afọ 1999, a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye na-ekwuchitere ndi otu Christian Democratic na steeti nke Lower Saxony . Na-esochi ntuli aka Christian Wulff dị ka praịm minista nke Lower Saxony, a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye na-ekwuchitere gọọmentị n'afọ 2003, ma zụlitere ya ka ọ bụrụ odeakwụkwọ steeti n'afọ 2008. A nabatara Glaeseker na mgbasa ozi mmekọrịta ọha na eze na-aga nke ọma maka Wulff. [5] Na-esochi nhoputa ndi ochichi Wulff dika onye isi ala Germany n'afo 2010, Glaeseker bu onye ode akwukwo mgbasa ozi nke onye isi ala. [6]
N' onwa Disemba afọ 2011, a katọrọ Wulff, mekwara ya Glaeseker. David McAllister, onye nọchiri anya Wulff dị ka praịm minista nke Lower Saxony katọrọ ya.[7] N'ụbọchị 22 ọnwa Disemba, ọ gbara arụkwaghịm.
Ntụaka
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Wulff's ex-spokesman faces fresh allegations. thelocal.de. Archived from the original on 2013-04-21. Retrieved on 2025-07-14.
- ↑ ((SPIEGEL ONLINE, Hamburg, Germany)) (30 January 2012). Ex-Wulff-Sprecher Glaeseker: Der gefährliche Freund. SPIEGEL ONLINE.
- ↑ Engster Berater des Präsidenten. NWZ Online (11 August 2010). Retrieved on 18 February 2012.
- ↑ Olaf Glaeseker - der "Präsidentenflüsterer". tagesschau.de (19 January 2012). Retrieved on 8 February 2012.
- ↑ Der Wohlfühl-Wulff. Focus Online (14 January 2008). Archived from the original on 17 December 2013. Retrieved on 8 February 2012.
- ↑ Wulff holt zwei Vertraute nach Berlin. Der Tagesspiegel (5 July 2010). Retrieved on 8 February 2012.
- ↑ ((SPIEGEL ONLINE, Hamburg, Germany)) (31 January 2012). Bundespräsidenten-Affäre: Wulff-Nachfolger McAllister attackiert Glaeseker. SPIEGEL ONLINE.