Onikan Stadium

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Mobolaji Johnson Arena[1] bụ ámá egwuregwu ana egosi ọtụtụ ebumnuche na Lagos. Eji ya ugbu a agba egwuregwu bọọlụ ,ma ọ bụ ámá egwuregwu nke otu Lagos dị iche iche, ọkachasị otu egwuregwu Ikorodu United , otu egwuregwu Stationery Stores,First Bank na otu egwuregwu Julius Berger . Ámá egwuregwu ahụ nwere ike ibata mmadụ puku iri ma bụrụ nke kachasị ochie na Naịjirịa. N'ịbụ nke dị n'akụkụ ndịda ọwụwa anyanwụ nke ọgbọ mmiri Lagos dị nso na ọgbakọTafewa Balewa , e wuru ámá egwuregwu mbụ ahụ na afọ 1930 ma mgbe afọ isii gachara, a gụhariri ya aha Eze George V. N'etiti afọ 1963 na 1973, a maara ya dị ka ama egwuregwu Lagos City . A rụzigharịrị ámá egwuregwu Onikan ugbu a ma meghee ya maka egwuregwu bọọlụ na ihe gbasara omenala n'afọ ndị 1980. N'ọnwa Machị afọ 2008, Njikọ bọọlụ Naịjirịa machibidoro ámá egwuregwu ahụ iji ya mee ihe n'oge ndị ọzọ n'oge egwuregwu ahụ mgbe mwakpo nke ogige merụrụ ọtụtụ ndị òtù egwuregwu Warri Wolves ahụ mgbe ha na ndị òtù egwuregwu First Bank nwesịrị mmeri na-enweghị akara.

Ogige egwuregwu Onikan

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

26