Papias Malimba Musafiri
Papias Malimba Musafiri bụ onye agụmakwụkwọ Rwanda, onye nchọpụta na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọ bukwazi onye jere ozi dịka Minista nke Mmụta na kansụl nke Rwanda, kemgbe ụbọchi iri abụọ n’ise nke onwa Juun n’oge afọ 2015, na-anọchi anya Prọfesọ Silas Lwakabamba.[1]
Mmalite na agụmakwụkwọ
[dezie | dezie ebe o si]O jide nzere bachelọ nke azụmahịa, nke ọ nwetara na Mahadum aha ya bụ Dar es Salaam. O nwekwara Master of Business Administration na majors na Finance na Information Technology, nke ọ nwetakwaziri na Indian Institute of Technology Roorkee . [2] Vellore Institute of Technology nyezikwa ya Doctor of Philosophy dikwazi na India.[1][3]
Ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]N'ihe dị ka afọ 2001, Musafiri jere ozi n'ọrụ dị iche iche na agụmakwụkwọ, nyocha na dịka onye ndụmọdụ. Tupu e guzobe Mahadum nke Rwanda (UR) n’oge afọ 2013, ọ nwere ọkwa nchịkwa dị elu n'ọtụtụ ụlọ ọrụ ndị mejupụtara UR taa. Ọ rụrụ ọrụ dịka (a) Director of Administration and Human Resources (b) Dean, Faculty of Management (c) Vice Rector Academics na (d) Acting Rector, na ụlọ ọrụ agụmakwụkwọ nke kacha elu. Ozugbo tupu a họpụtara ya dịka minista agụmakwụkwọ, ọ bụ onye isi nke College of Business and Economics (CBE) nke Mahadum di na Rwanda . [1]
Na ntuli aka nke ụbọchi ise nke ọnwa Ọktoba n’oge afọ 2016, [4] na nke ụbọchi iri atọ na otu nke ọnwa Ọgọst n’oge afọ 2017, e debere ya na kọmitii ma ọ nọgidere na-agụ akwụkwọ. [5] N'ọrụ ya dị ka minista agụmakwụkwọ, ọ mara ọkwa nkwụsị na ịchụpụ ndị nkuzi Uganda na Rwanda, mgbe nkwekọrịta nkuzi ha gwụsịrị.[6]
Hụkwazie
[dezie | dezie ebe o si]- Agụmakwụkwọ na Rwanda
- Nzukọ omeiwu nke Rwanda
Edensibia
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ 1.0 1.1 1.2 Times Reporter (25 June 2015). Musafiri appointed as new Education minister. Retrieved on 17 September 2017.Times Reporter (25 June 2015). "Musafiri appointed as new Education minister". New Times (Rwanda). Kigali. Retrieved 17 September 2017.
- ↑ UR appoints ex- education minister Dr. Musafiri as acting vice chancellor (en). The New Times | Rwanda (20 October 2020). Retrieved on 25 November 2020.
- ↑ Musafiri appointed as new Education minister. The New Times (2015-06-25). Retrieved on 2019-09-28.
- ↑ GOR (5 October 2016). Communique: President Kagame reshuffles the Cabinet, appoints new governors. Government of Rwanda (GOR). Archived from the original on 1 September 2017. Retrieved on 17 September 2017.
- ↑ Kimenyi (31 August 2017). Rwanda gets new Cabinet, who is in?. Retrieved on 17 September 2017.
- ↑ Spear Team (29 March 2017). Rwanda responds to Ugandan Teachers dismissal says contracts expired 2015. Thespearnews.com. Archived from the original on 30 January 2018. Retrieved on 17 September 2017.
Njikọ mpụga
[dezie | dezie ebe o si]- Ebe nrụọrụ weebụ nke Ministry of Education nke Rwanda E debere ya na Wayback Machine (Mineduc)