Paul Hamilton
Paul Ebiye Hamilton (31 Julaị 1941 - 30 Machị 2017) bụ Onye Naijiria na-agba bọọlụ na onye njikwa. Ọ nwụrụ n'ụlọ ọgwụ ndị agha dị na Lagos, Naịjirịa.
Ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]Ọ nọrọ ọtụtụ oge n'ọrụ ịgba bọọlụ ya (1961-1975) na NEPA Lagos.
Ọrụ nkuzi
[dezie | dezie ebe o si]Mgbe ọ lara ezumike nká, a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye nchịkwa nke otu mba U-20. A họpụtara ya ka ọ bụrụ onye isi nchịkwa nke otu egwuregwu bọọlụ Naịjirịa n'afọ 1989 mana a chụrụ ya n'ọrụ na bọọdụ ka Naịjirịa erubeghị eru maka asọmpi Iko Mbaụwa nke afọ 1990. Ọ gara n'ihu chịa otu ụmụnwaanyị n'asọmpị iko mba ụwa nke mbụ ha. Ọ natara ikike nchịkwa UEFA n'oge okpomọkụ nke 2006.
Ndụ e mesịrị
[dezie | dezie ebe o si]A na-ekwu na a chọpụtara na ọ na-arịa ọrịa obi na akụrụ ọnwa ole na ole gara aga.[1]
E gbupụrụ ya ụkwụ aka ekpe n'ihi ọtụtụ mmerụ ahụ. Ọ nwụrụ mgbe ọ rịasịrị ọrịa ogologo oge na Machị 2017.[2]
Njikọ mpụga
[dezie | dezie ebe o si]Edensibia
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Simire (31 March 2017). Ex-Eagles coach, Paul Hamilton, dies - EnviroNews Nigeria - (en-US). www.environewsnigeria.com. Retrieved on 2018-05-14.
- ↑ "Ex-Nigeria coach Hamilton dies". Retrieved on 2018-05-14. (in en-ZA)