Peng Liyuan

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Peng Liyuan
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịChina Dezie
aha n'asụsụ obodo彭麗媛 Dezie
Aha enyereLiyuan Dezie
aha ezinụlọ yaPeng Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya20 Novemba 1962 Dezie
Ebe ọmụmụYuncheng County Dezie
Dị/nwunyeXi Jinping Dezie
nwaXi Mingze Dezie
Asụsụ obodoMandarin Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaChinese Dezie
Ọkwá o jispouse of the President of the People's Republic of China, WHO Goodwill Ambassador, member of the National Committee of the Chinese People's Political Consultative Conference Dezie
ebe agụmakwụkwọChina Conservatory of Music Dezie
Ebe obibiBeijing Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịChinese Communist Party Dezie
ọkwa aghamajor general Dezie
conflictSino-Vietnamese conflicts 1979–1991 Dezie
ngalaba aghaPeople’s Liberation Army Dezie
ụdị olusoprano Dezie
ngwa egwuolu egwụ Dezie
ụdịChinese folk art Dezie
ihe omume dị ịrịba amaagbamakwụkwọ, omụmụ nwa Dezie

Peng Liyuan ( nke amụrụ na ụbọchị iri abụọ n'ọnwa Nọvemba na afọ 1962) bụ onye na -agụ egwu ndị China nke oge a ma bụrụ kwa nwunye onye isi ala China na onye isi kachasịna obodo ahụ. Peng Liyuan n'alụ onye ode akwụkwọ ukwu nke otu Kọmunist n'China na Onye isi ala Xi Jinping ugbu a . [1] N'ime afọ 2012 ruo n'afọ 2017, Peng bụ onye isi oche nke Academy nke Art nke ndị mmadụ n'oge ahụ. Site kwa na afọ 2005 ruo n'afọ 2010,ọ jere ozi dị ka osote onye isi otu ndị ntorobịa na China . [2]

Ntọala[dezie | dezie ebe o si]

Peng wuru ewu dị ka onye na -agụ egwu ọnụ ya na ari elu (nke a na akpọ Soprano n'asụsụ bekee) site na ngosi ya mgbe niile na mmeme CCTV New Year's Gala, bụ nke mmemme nyonyo China nke a na -ahụkarị n'oge Afọ Ọhụrụ nke obodo ahụ. [3] Peng emeriela ọtụtụ asọmpi ma nweta nsọpụrụ na ihe nrita n'asọmpi ịbụ abụ na mba niile. [3] Egwu Peng ndị ama ama gụnyere "Ndị obodo anyị" ( 《父老乡亲》 ), "Zhumulangma" ( Ugwu Everest ; 《珠穆朗玛》 ) na "N'ọhịa Olileanya" ( 《在希望的田野上》 ). Peng gụkwara abụ isiokwu nke ọtụtụ ihe usoro ejije a n'eme na onyonyo ndị nke ama ama, dị ka The Water Margin (n'afọ 1998). Ọ sọkwara na -eme ihe nkiri maka ịgụegwu. Na afọ 1986, ọ nwetara nnukwu ihe nrita akpọrọ Plum Blossom Award, nke bụ onyinye nturu ugo kachasị elu nke China, maka ọrụ ejije nke ọ mere onye ka gosipụta ihe na Nwa Nwanyị Nwere Ntutu Ọcha (nke a na akpọ The White haired Girl n'asụsụ bekee). [4]

Peng bụ onye nkịtị nke ndị agha nnwere onwe nke ndị China, ma nwee ọkwa nkịtị nke dị ka Major General tupu ahọpụta ya dị ka onye isi nke Art Academy, nke mere enye ya ọkwa ọfụma. [3] A maara ya n'ime China maka echiche ejiji ya nke na adị iche, nke a na -ekenye onye ọrụ ya na akwara ya akwa a na akpọ Ma Ke. [5] [6] [7] [8]

Na afọ 2014, akwụkwọ akụkọ Forbes depụtara Peng dị ka nwanyị nke iri ise na asaa kachasị nwee ike n'ụwa. [9]

Mmalite[dezie | dezie ebe o si]

Peng na Juliana Awada, Nwanyị nwanyị mbụ nke Argentina, na Quinta de Olivos, Buenos Aires, Disemba 2018.

Peng Liyuan bụ onye obodo Yuncheng County,nke dị nampaghara Shandong . Peng sonyeere ndị agha ntọhapụ ndị mmadụ na afọ 1980, mgbe ọ dị afọ iri na asatọ, wee malite dị ka onye agha nkịtị. N'ihi ikike olu ya, Peng mechara mee njem nlegharị anya iji kwalite mmụọ ndị agha n'oge esemokwu oke ala nke Sino-Vietnam . [10] Peng buru ụzọ rụọ ọrụ na mba niile China wee bụrụ onye ama ama n'oge izizi site na mmeme CCTV New Year's Gala na afọ 1982, mgbe osoro na ejije On the Plains of Hope .

Peng na Xi Jinping alụọla dị na nwunye ihe karịrị afọ iri atọ. [3] Ha nwere otu nwa nwanyị aha ya bụ Xi Mingze (习明泽) onye nke amụrụ na afọ 1992, aha ya bụ Xiao Muzi (小木子). [11]

Enwere ike ikwu na akụkụ ka ukwuu nke mmekọrịta ha, Peng enwela ezigbo aha n'ime China, nke gafere nke dị ya bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị. [3] Kemgbe dị ya ghọrọ onye ode akwụkwọ ukwu nke ndị Kọmunist ( ya bụ onye isi otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị) na ọnwa Nọvemba n'afọ 2012, [3] na Onye isi ala China ( de jure head of state ) na ọnwa Machị n'afọ 2013, akwụkwọ akụkọ America n'akpọ ya nwanyị mbụ nke China .

Ndị enyi Xi na Peng bụ ndịmere ka ha mara onwe ha dị ka osi mee ọtụtụ di na nwunye ndị China na oge afọ 1980. Xi bụ onye a ma ama na agụmakwụkwọ n'oge mbido enyi ha, ọ jụkwara ajụjụ maka usoro ịbụ abụ. [3] Xi bụ nwa nwoke onye ama ama na China Xi Zhongxun onye na ekwu si okwu ike na na akwado mgbanwe. Ezinụlọ Peng doro nabatara mmekọrịta ahụ n'ụzọ dị mfe, n'ihi omume ya Xi na ndi be ha nke ama ama. Mgbe ha nwetara nkwenye nne na nna, ha lụrụ di na nwunye na ụbọchị mbụ na ọnwa Septemba n'afọ 1987 na Xiamen, Fujian . Ụbọchị anọ ka e mesịrị nke a, Peng Liyuan laghachiri n'Beijing ka ọ soro ma pụta na mmeme National Art Festival, ozugbo nke a gasiri, ọ gawara United States na Canada ebe ọ soro ma pụta na mmeme. Kemgbe ahụ, Xi na Peng n'ebi ndụ dị iche iche, ebe Peng na anọ nke ukwuu na Beijing, di ya na anọ nke ukwuu na Fujian. Emesịa, ọna anọ n'obodo Zhejiang.

Peng na -etinye aka na ndọrọndọrọ ọchịchị, ọ bụkwa onye otu Kọmitii Mba nke iri na otu nke Ọgbakọ Ndụmọdụ Ọchịchị nke Ndị China . Peng bụ onye nnọchite anya ihe ọma nke WHO maka ụkwara nta na HIV/AIDS kemgbe afọ 2011. [12]

Na ụbọchị nke iri abụọ nke ọnwa Nọvemba n'afọ 2014, Mahadum Massey nke dị na obodo New Zealand nyere Peng asambodo Doctorate na nkwanye ugwu maka onyinye mba ofesi ya na nka, ahụike na agụmakwụkwọ. [13] Peng bụrụ abụ ma gba egwu na afọ 2007 nke egosi na nyonyo na China, nke gosipụtara ndị Tibet ebe ha na-ekele ndị agha China maka ịtọhapụ ha. [14]

Esemokwu na nkatọ[dezie | dezie ebe o si]

Peng Liyuan, di ya - onye isi obodo China, Donald Trump na nwunye ya

Ozugbo ngagharị iwe Tiananmen Square nke 1989 mechara na ọwa June n'afọ 1989, Peng Liyuan bụrụ abụ maka ndị agha na edesa iwu. Foto na-egosi ebe ahụ Peng, yi uwe ndị agha na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ, na-abụ abụ na ndị agha nwere okpu agha ehe ha nọ na ahịrị na n'ahịrị na Tiananmen Square Beijing, ehichapụ foto nke ahụ ngwa ngwa na ntanetị China tupu ọ nwee ike mepụta mkparịta ụka n'ịntanetị. Agbanyeghị nke a, foto ahụ - nke ọtụtụ mmadụ hụrụ ma kerịta site n'aka ndị na -ekiri ihe nọ na mpụga China tụtere ncheta nke onye ndu zọdara ndị China. Ihe eserese ahụ sitere n'azụ akwụkwọ akụkọ ndị agha dị n'ihu ọha nke mbipụtara n'afọ1989 nke akpọrọ People's Liberation Army Pictorial. [15] [16] [17]

N'ọnwa June n'afọ 2013, akwụkwọ akụkọ mba ofesi nke America bipụtara akụkọ akpọrọ "Gịnị kpatara Michelle Obama ekwesịghị izute Peng Liyuan" nke kwadoro nhọrọ nke First Lady Michelle Obama na ọchoghị izute Peng Liyuan. Ka o sina dị, Michelle Obama mechara zute Peng n'ọtụtụ nlegharị anya nke ekwuru maka ya nke ukwuu na Beijing na Washington, DC [18] [19]

See also[dezie | dezie ebe o si]

  • Nwunye nke Onye isi ala nke ndị mmadụ Republic of China

Ntụrụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. Guhantai news 3/30/2013. Archived from the original on 4 March 2016. Retrieved on 30 March 2013.
  2. Peng Liyuan, a symbol of China's soft power (en). gulfnews.com. Retrieved on 28 April 2020.
  3. 3.0 3.1 3.2 3.3 3.4 3.5 3.6 Page (13 February 2012). Meet China's Folk Star First Lady-in-Waiting. The Wall Street Journal. Retrieved on 7 November 2012.
  4. 'The White Haired Girl': 70 years on (28 December 2015). Retrieved on 4 April 2020.
  5. "Fashion diplomacy: 8 most stylish stateswomen of our times", South China Morning Post.
  6. "China's First Lady Peng Liyuan gives Melania Trump a run for her fashion money", The Straits Times, 10 November 2017. (in en)
  7. "Meet the designer behind China's first lady", CNN Style, 17 November 2016. (in en)
  8. "Melania Trump takes fashion diplomacy to new lengths in China", South China Morning Post. (in en)
  9. The World's 100 Most Powerful Women. Forbes. Retrieved on 26 June 2014.
  10. Peng Liyuan describes her own time in the army (zh). CE.cn (1 July 2004). Retrieved on 28 May 2008.
  11. Staff Reporter (16 February 2012). Red Nobility: Xi Jinping's Harvard daughter. Want China Times. Archived from the original on 20 November 2012. Retrieved on 7 November 2012.
  12. UN health agency appoints Chinese singer as Goodwill Ambassador. un.org/ (3 June 2011).
  13. Honorary doctorate for China's First Lady. Massey University (18 November 2014). Retrieved on 3 May 2020.
  14. As China Readies for Transition, 7 Tibetan Self-Immolations in 7 Days, Time, 29 October 2012.
  15. 彭麗媛六四後舊照曝光 外媒:令中國尷尬的照片. Apple Daily (29 March 2013). Archived from the original on 16 December 2013. Retrieved on 11 November 2017.
  16. 第一夫人觸屠殺敏感話題 彭麗媛六四勞軍照 閃電刪除. Apple Daily (30 March 2017). Retrieved on 11 November 2017.
  17. 中國第一夫人∕彭麗媛 遭爆高歌慰勞六四屠殺部隊. Liberty Times (30 March 2013). Archived from the original on 16 December 2013. Retrieved on 11 November 2017.
  18. 彭丽媛同美国总统夫人米歇尔共同参观美国国家动物园大熊猫馆 (zh-hans). Scitech.people.com.cn (26 September 2015). Archived from the original on 31 August 2021. Retrieved on 3 May 2020.
  19. Why Michelle Obama shouldn't meet with Peng Liyuan, Foreign Policy, 5 June 2013.