Gaa na ọdịnaya

Princess Olufemi-Kayode

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Dr Princess Olukayode

Princess Olufemi-Kayode (nke a makwaara dị ka Modupe Olufemi -Kayode) bụ onye Naijiria na-ahụ maka ikpe ziri ezi na onye na-ahụkarị maka ikike ụmụaka. Olufemi-Kayode ghọrọ onye Ashoka fellow na afọ pụkụ abụọ na asaa. Ọ bụ onye isi nchịkwa nke Media Concern for Women and Children Initiative (MEDIACON), otu na-abụghị maka inweta uru (NGO) nke UNDP depụtara nke na-arụ ọrụ na ụmụaka ndị a na-emegbu ma na-erigbu.[1]

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ

[dezie | dezie ebe o si]

Princess bụ onye lagbụrụ mmetọ ụmụaka, [2] onye ndị enyi ya metọrọ ọtụtụ ugboro. N'afọ pụkụ, narị itoolu na iri asaa na itoolu, o dere uri abụọ banyere ahụmahụ mmetọ ụmụaka ya.

Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye na-ede akwụkwọ akụkọ na akwụkwọ akụkọ The Punch, ebe ọ na-elekọta otu kọlụm a na-akpọ "Princess Column". Ọ bụ ọkà okwu mba ụwa na onye hụrụ ụmụaka n'anya. N'afo pụkụ abụọ, o guzobere Media Concern Initiative for Women and Children, otu na-abụghị nke gọọmentị maka ụmụ nwanyị na ụmụaka nke na-elekwasị anya n'ọhịa mgbochi ime ihe ike mmekọahụ na nzaghachi nsogbu na Naịjirịa na Africa. Ọ pụtara na ihe ngosi okwu redio na mmemme telivishọn dị iche iche. [2]"Princess Olufemi Abused but not hopeless". I share hope. Retrieved 14 February 2017.</ref> Ọ ghọrọ onye Ashoka fellow na afọ pụkụ na asaa. [3]

Edensibịa

[dezie | dezie ebe o si]

Njikọ mpụga

[dezie | dezie ebe o si]
  1. ↑ "Mapping of Laws, Policies and Services on Gender Based Violence and Its Intersections with HIV in Nigeria" (PDF). Archived from the original (PDF) on 2015-09-11. Retrieved 2017-02-25. {{cite journal}}: Cite journal requires |journal= (help)
  2. 1 2 "Princess Olufemi Abused but not hopeless". I share hope. Retrieved 14 February 2017.
  3. ↑ "Princess Olufemi-Kayode". Ashoka Fellow. Retrieved 17 February 2017.