Gaa na ọdịnaya

R. A. B. Dikko

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Russel Aliyu Barau Dikko (1912-1977) bụ dọkịta Naijiria bụbu onye kọmishọna gọọmentị etiti maka ịgwupụta mmanụ na ike ma bụrụ dọkịta mbụ si mpaghara mgbago ugwu, Naijiria . [1]

A mụrụ Dikko na Wusasa, Zaria, ebe e kwere ka okpukpe Iso Ụzọ Kraịst mụbaa na Zaria emirate nke ndị Alakụba juru na ya.[2] Ndị ozi iso ụzọ Kraịst si ala ọzọ bụ nke Walter Miller bụ onye isi ha, bụ onye dọkịta ozi Kraịst na-eto eto si na Church Missionary Society; ndị ozi ahụ si ala ọzọ wuru ụlọ akwụkwọ, ụlọ ụka na ụlọ ọgwụ na Wusasa. Dikko gara ụlọ akwụkwọ elementrị CMS na Wusasa ma mesịa gaa King's College " Ọ gara n'ihu na ọmụmụ ya na Mahadum Birmingham. [3][4]

Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ ya, ọ laghachiri Naijiria wee sonye n'ọrụ ọchịchị ndị ọcha dị ka onye ọrụ ahụike dị ala n'afọ 1940. O ji nwayọọ nwayọọ rịgoro n'ọkwa nke ọrụ gọọmentị, wee bụrụ onye isi ọrụ ahụike n'afọ 1953 nakwa onye isi ọrụ ọgwụ na ngalaba ọrịa na-efe efe nke Northern Nigeria Ministry of Health n'afọ 1960. N'oge ọchịchị nke General Yakubu Gowon, a họpụtara ya dị ka kọmishọna gọọmentị etítì maka ịgwupụta mmanụ na ike n'afọ 1967 na kọmishọna gọọmentị etítì maka njem n'afọ 1971.

N'afọ 1963, Dikko na Minista Ahụike Ógbè Ahman Saba Patigi nọchitere anya Gọọmentị mgbago ugwu na Netherlands iji wee ndị dọkịta na ndị nọọsụ n'ọrụ

Dikko bụ onye guzobere Jamiyar Mutanen Arewa, otu omenala nke mgbago ugwu Naijiria nke mesịrị guzobe isi nke Northern People's Congress. "[5]

Edensibịa

[dezie | dezie ebe o si]
  1. About Barau Dikko Hospital. Barau Dikko Hospital. Archived from the original on 4 February 2015. Retrieved on 29 July 2015.
  2. Wusasa: Where Muslims, Christians unite for good. Weekly Trust. Archived from the original on 11 February 2017. Retrieved on 29 July 2015.
  3. Historical Dictionary of Nigeria. Scarecrow Press. Retrieved on 29 July 2015. “dikko kings college lagos.” 
  4. Nigerian Infopedia — Nigeria's Number One Online Information Hub (en-US). Nigerian Infopedia. Archived from the original on 2020-05-31. Retrieved on 2020-05-30.
  5. Political Parties and National Integration in Tropical Africa. University of California Press (1966). Retrieved on 29 July 2015.