Gaa na ọdịnaya

Rex Wakely Smith

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Sydney Rex Wakely-Smith (1930 – ụbọchị ịse n'ọnwa Disemba n'afọ 2013) bụ onye ọkwọ ụgbọala na onye na-ahụ maka ndị uwe ojii na mba Saụt Afrịka. Ọ bụ onye mmeri nke South Afrịka Rally na Ewold van Bergen n'afọ 1964 na afọ 1965. Ọ bụ onyeisi oche nke Philatelic Federation nke South Africa n'afọ 2004 ma merie ihe nrite maka nchịkọta ya nke philately nke Mozambique..

Ndụ mbụ na ezinụlọ

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Sydney Rex Wakely-Smith na Johannesburg n'afọ 1930. Ọ gụrụ akwụkwọ na ụlọ akwụkwọ St John. Ọ lụrụ Ethne Denise Lambert na ụbọchị ịrị atọ na otụ n'ọnwa Ọktoba n'afọ 1953, mgbe ọ dị afọ ịrị abụọ na atọ. Ha lụrụ di na nwunye afọ 60 tupu o jiri mwute gafee na Hillcrest, South Africa mgbe ọ dị afọ ịrị asatọ na atọ. Ha nwere ụmụ atọ na ọtụtụ ụmụ ụmụ na ụmụ ụmụ.

Egwuregwu ụgbọala

[dezie | dezie ebe o si]

Wakely Smith bụ Onye mmeri Rally nke South Africa na Ewold van Bergen n'afọ 1964 na afọ 1965.

E nyere ya Agba Springbok maka egwuregwu ụgbọala.

Philately

[dezie | dezie ebe o si]

Wakely Smith ketara mmasị na philately site n'aka nne ya. Ọ bụ onye otu Philatelic Society nke Natal na onye isi oche nke Philatecal Federation nke South Africa n'afọ 2004. Ọ bụ ọkachamara na philately nke Mozambique ma nweta nnukwu ọla edo na South Africa maka ihe ngosi ya nke mba ahụ yana nnukwu ọlaọcha na ihe ngosi stampụ mba ụwa na Dubai.

Ihe ntụrụndụ ndị ọzọ gụnyere ornithology na conchology.

Ọnwụ

[dezie | dezie ebe o si]

Wakely Smith nwụrụ na ụbọchị ịse n'ọnwa Disemba n'afọ 2013.

Edemsibịa

[dezie | dezie ebe o si]

Njikọ mpụga

[dezie | dezie ebe o si]