Gaa na ọdịnaya

Richard Arnold Dümmer

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Richard Arnold Dümmer
mmádu
Ụdịekerenwoke Dezie
Mba o sịSouth Africa Dezie
Aha enyereRichard, Arnold Dezie
Aha ezinụlọ yaDummer Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1887 Dezie
Ebe ọmụmụCape Town Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya2 Disemba 1922 Dezie
Ebe ọ nwụrụKampala Dezie
Ihe kpatara ọnwụmotorcycle accident Dezie
Asụsụ obodoEnglish Dezie
Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaEnglish Dezie
Ọrụ ọ na-arụbotanist, botanical collector Dezie
Onye were ọrụBritish Museum Dezie
Ebe obibiSouth Africa Dezie
Faịlụ:Richard Arnold Dümmer00.jpg
Richard Arnold Dümmer
Richard Arnold Dūmmer

Richard Arnold Dümmer (1887 na Cape Town - 2 Disemba 1922, na Uganda) bụ onye South Africa gụrụ maka ụmụ akụmakụ onye mere nchịkọta na South Africa, Kenya na Uganda.

Dümmer rụrụ ọrụ na mbụ n'ogige ntụrụndụ nke Cape Town. N'oge ahụ, o wepụtalarị usoro ihe atụ dị ka exsiccata bụ Plantae Peninsulae Capensis . [1] O sonyeere Kew dị ka onye na-elekọta ubi n'afọ 1910. N'afọ 1911, ọ ghọrọ onye na-enyere Prọfesọ Augustine Henry aka ma soro n'ịkwadebe "The Trees of Great Britain and Ireland" nke Elwes na Henry maka mbipụta. Dümmer rụrụ ọrụ n'ebe nchekwa akụmakụ yana ọbá akwụkwọ nke Kew, Ọbaṅkà Britain, Linnaean Society, nah Mahadum Cambridge, Oxford na Edinburgh. O bipụtara ihe odide n'ịkpọ aha gbasara Agathosma, Eugenia, Bruniaceae, Alepidea, Lotononis, Pleiospora, Combretaceae, Adenandra na Acmadenia.

E weere ya n'ọrụ na Kivuvu Rubber Company nke Kampala n'afọ 1914, na-eji ohere ahụ anakọta akụmakụ ndị na-amị okooko osisi yana fungi. Ọ hazikwara njem ọmụmụ akụmakụ gaa na Ugwu Elgon na Ugwu Longonot crater. Dümmer wee nọọ otu afọ ọzọ na Cape Town na-achọpụta ma na-edozi nchịkọta ya.

Ihe mberede ọgba tum tum mere n'okporo ụzọ Jinji dị na Kampala kwụsịrị ndụ na ọrụ ya n'ike. A na-echeta ya site na ihe nrite kwa afọ "The Dümmer Memorial Prize" nke Kew Guild nye nwa akwụkwọ na-eweta nchịkọta kachasị mma nke akụmakụ Britain. Ihe atụ ya karịrị puku iri abụọ, a ma debe ha na PRE, SAM, NH, BM, E, K, MO, P na US [2] Templeeti:Botanist Akara njirimara aha odee Dūmmer ka e ji egosipụta onye a dịka odee ma a na-arụ aka n'aha akụmakụ ihe.

Edensibịa

[dezie | dezie ebe o si]
  1. Plantae Peninsulae Capensis: IndExs ExsiccataID=173728768. IndExs – Index of Exsiccatae. Botanische Staatssammlung München. Retrieved on 9 June 2025.
  2. Gunn & Codd 1981, p. 140.