Richard Bonnie
Richard J. Bonnie bụ Prọfesọ Harrison Foundation nke Iwu na Ọgwụ, [1] Prọfesọ nke Public Policy, Prọfesọ nke Psychiatry na Neurobehavioral Science, na Director nke Institute of Law, Psychiatry and Public Policy na Mahadum Virginia ya na Mahadum Virginia School of Law. [2] Ọ na-akụzi ma na-ede banyere iwu mpụ, bioethics, na iwu ọha na eze metụtara ahụike uche, iji ọgwụ ọjọọ eme ihe, ịka nká na ahụike ọha.[2]
Agụmakwụkwọ
[dezie | dezie ebe o si]Bonnie nwetara nzere Bachelor nke nka na Mahadum Johns Hopkins n'afọ 1966. Ọ natara L.L.B. ya na Mahadum Virginia n'afọ 1969.[2]
Ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]Bonnie etinyela aka na ọrụ ọha na eze n'oge niile ọ na-arụ ọrụ. N'etiti ọtụtụ ọkwa ndị ọzọ, ọ bụri osote onye nduzi nke National Commission na eji wii wii na iji ọgwụ eme ihe (1971-73); odeakwụkwọ mbụ nke National Advisory Council na iji ọgwụ eme ihe (1975-80); onyeisi oche nke Virginia's State Human Rights Committee nke na-ahụ maka ichebe ikike nke ndị nwere nkwarụ (1979-85), onye isi ndụmọdụ maka ABA Criminal Justice Mental Health Standards Project (1981-88) na onyeisi oche nke Commission on Mental Health Law Reform nke Chief Justice of Virginia guzobere (2006-11).
Bonnie jere ozi dị ka onye ndụmọdụ na American Psychiatric Association Council on Psychiatry and Law kemgbe afọ 1979, nata American Psychiatric Association's Isaac Ray Award n'afọ 1998 maka onyinye na ngalaba nke forensic psychiatry, e nyekwara ya otuto pụrụ iche nke onye isi ala n'afọ 2003 maka onyinye ya na American psychiatry. Ọ rụkwara ọrụ na netwọk nyocha atọ nke MacArthur Foundation - na Mental Health and the Law (1988-96), Mandated Community Treatment (2000-2010) na Law and Neuroscience (kemgbe afọ 2008). [3]
N'afọ 1991, a họpụtara Bonnie na National Academy of Medicine. Ọ bụ onye isi oche nke ọtụtụ ọmụmụ National Academy na isiokwu sitere na mmeso ọjọọ ndị agadi na ịṅụ mmanya na-erubeghị afọ iri, gụnyere akụkọ dị ịrịba ama, Ikpochapụ Nsogbu Ụtaba: A Blueprint for the Nation (2007). N'oge na-adịghi anya, ọ bụ onye isi ọmụmụ ihe gbasara mgbanwe ikpe ziri ezi nke ụmụaka (2013) na ahụike na ọdịmma nke ndị okenye na ndị ntorobịa (2014).
Nnyocha
[dezie | dezie ebe o si]Bonnie edeela ọtụtụ akwụkwọ na akwụkwọ gbasara iwu mpụ, bioethics na iwu ọha na eze metụtara ahụike uche, iji ọgwụ ọjọọ eme ihe, ịka nká na ahụike ọha na eze.[4]
Onyinye na nsọpụrụ
[dezie | dezie ebe o si]N'afọ 2007, Bonnie natara nsọpụrụ kachasị elu na Mahadum Virginia, Thomas Jefferson Award . [5] Ọ natara ihe nrite Yarmolinsky n'afọ 2002 maka onyinye ya na National Academies . [6] A họpụtara Bonnie ka ọ bụrụ onye American Law Institute n'afọ 2014.[7]
Edemsibịa
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Record Harrison Bequest Creates New Professorships. University of Virginia School of Law. Retrieved on 2016-03-27.
- 1 2 3 Faculty - University of Virginia School of Law. University of Virginia School of Law. Archived from the original on 2015-09-06. Retrieved on 2016-03-27.
- ↑ Richard J. Bonnie. University of Virginia School of Law. Archived from the original on 2016-08-17.
- ↑ PUBLICATIONS AUTHORED BY RICHARD J BONNIE. PubFacts. Retrieved on 12 March 2016.
- ↑ News: University Recognizes Professor Bonnie with Highest Award: Virginia Law Weekly. www.lawweekly.org. Retrieved on 2016-03-27.
- ↑ National Academy of Medicine " Adam Yarmolinsky Medal. nam.edu. Retrieved on 2016-03-30.
- ↑ Institute. Members -- American Law Institute. American Law Institute. Archived from the original on 2016-06-10. Retrieved on 2016-03-27.