Rilwanu Lukman
Rilwanu Lukman | |
|---|---|
| Minister of Petroleum Resources | |
| In office 18 December 2008 – 17 March 2010 | |
| President | Umaru Musa Yar'Adua |
| Preceded by | Edmund Daukoru |
| Succeeded by | Diezani Allison-Madueke |
| In office February 1986 – February 1990 | |
| President | Ibrahim Babangida |
| 18th and 21st Secretary General of OPEC | |
| In office 1 January 1995 – 31 December 2000 | |
| Preceded by | Abdallah Salem el-Badri |
| Succeeded by | Alí Rodríguez Araque |
| Personal details | |
| Born | 26 August 1938 |
| Died | 21 Julaị 2014 (aged 75) Vienna, Austria |
| Children | 1984 |
Rilwanu Lukman (26 Ọgọst 1938 - 21 Julaị 2014) bụ onye injinia Naijiria nke rụrụ ọrụ n'ọtụtụ ọkwa dịka minista na gọọmentị etiti Naijiria tupu ọ bụrụ Odeakwụkwọ ukwu nke OPEC(Organization of the Petroleum Exporting Countries) site na 1 Jenụwarị 1995 ruo 31 Disemba 2000. Ọ nwụrụ na 21 Julaị 2014. [1] N'abalị iri na asatọ n'ọnwa Disemba n'afọ 2008, onye isi ala Naijiria bụ Umaru Musa Yar'Adua họpụtara Lukman ka ọ bụrụ Mịnịsta Na-ahụ Maka Ihe Ndị Dị n'Oké Mmanụ, ọ nọ n'ọkwa ruo n'ọnwar Machị n'afọ 2010. [2]
Ọmụmụ, agụmakwụkwọ na mmalite ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ Lukman na Zaria, Kaduna Steeti. I nwetara ọzụzụ dị ka injinia na-egwupụta ihe n'ala na College of Arts, Science, and Technology, Zaria (nke bụzi Mahadum Ahmadu Bello ugbua), wee gaakwa Imperial College, London.[3]
O nwetara nzere dị elu na injinia ịgwupụta ihe n'ala na Mahadum Mining na Metallurgy na Leoben, Austria (1967-1968).
O nwetara nzere na akụ na ụba mineral na Mahadum McGill, Montreal n'afọ 1978, na nzere ọkankuzi na injinia kemịkal na Mahadim Bologna na Ịtali.[3]
Ọrụ mbụ ya na ụlọ ọrụ ngwupụta akụ̀ ndị dị n'ime ala bụ dị ka onye na-enyere onye injinia na-egwu ihe aka na A B Statsgruvor nke Sweden (1962-1964). Mgbe ọ laghachiri Naịjirịa, a họpụtara Lukman ka ọ bụrụ onye nnyocha nke ebe a na-egwupụta ihe, mgbe e mesịrị, ọ ghọrọ onye nnyocha dị elu ma bụrụkwa osote onye isi nnyocha na Federal Ministry of Mines & Power na Jos, Plateau State (1964-1970). Ọ ghọrọ onye isi njikwa nke ụlọ ọrụ Cement Company of Northern Nigeria (1970-1974). [4]
Ka ọ na-erule afọ 1979, Lukman aghọwo onye isi njikwa na onye isi ọrụ nke ụlọ ọrụ Naịjirịa Mining Corporation, Jos.[5]
Ọkwá ndị isi na gọọmentị na OPEC
[dezie | dezie ebe o si]A họpụtara Lukman ka ọ bụrụ Mịnịsta na-ahụ maka ihe ndị a na-egwupụta n'ala, ike na ígwè site n'afọ 1984 ruo 1985 n'ọchịchị General Muhammadu Buhari . [3] N'afọ 1986, a họpụtara ya ka ọ bụrụ Minista Federal nke Petroleum Resources, na-anọ n'ọkwa ahụ ruo n'ọnwa Febụwarị afọ 1990. N'ọrụ ahụ, ọ bụkwa onyeisi oche bọọdụ nke ụlọ ọrụ Naịjirịa National Petroleum Corporation . Ọ bụ minista na-ahụ maka ihe gbasara mba ọzọ n'oge dị mkpirikpi n'etiti Jenụwarị na Septemba 1990.[6]
Ọ bụ onye isi oche nke ndị nduzi nke National Electric Power Authority (1993-1994). [7]
Site n'afọ 1986 ọ rụrụ ọrụ ugboro asatọ n'usoro dị ka onye isi oche OPEC. [3]
A họpụtara Lukman ka ọ bụrụ odeakwụkwọ ukwu nke OPEC na 22 Nọvemba 1994, na-anọchi Dr. Subroto nke Indonesia, onye afọ atọ ọchịchị ya gwụrụ na 30 Jun 1994. Lukman bụ nhọrọ nkwekọrịta n'etiti ndị na-asọmpi abụọ, Hossein Kazempour Ardebili nke Iran na Alirio Parra nke Venezuela. A họpụtara ya ọzọ n'afọ 1997, ọ nọ n'ọkwa ahụ ruo na ngwụcha afọ 2000.
Ọ bụ onye dị mkpa na nkwekọrịta dị n'etiti Iran na Saudi Arabia iji chịkwaa ọnụahịa mmanụ na mbido afọ 1999, nkwekọrịta iji belata ọkwa mmepụta sochiri, nke dugara na ịrị elu ọnụahịa mmanụ na ngwụcha nke afọ 1990.
Ọrụ ya na Republic Nke Anọ
[dezie | dezie ebe o si]Mgbe Olusegun Obasanjo batara n'ọchịchị na mbido nke Republic nke anọ nke Naịjirịa, onye isi ala nọgidere na-achịkwa Ministri Mmanụ. A họpụtara Lukman dị ka onye ndụmọdụ pụrụ iche n'okwu ndị gbasara mmanụ na ike nye onye isi ala na Jun 1999, na-anọchi Godwin Aret Adams, na onye isi oche nke Nigerian National Petroleum Corporation (NNPC).
N'ọnwa Julaị afọ 1999, ọfịs ya kwupụtara na akagbuola ikikere nchọpụta na mmepụta dị iri anọ na asaa nke gọọmentị nyere ụlọ ọrụ mpaghara, gụnyere oghere mmanụ mmiri miri emi dị iri na otu mara mma nke e nyere na Machị afọ 1999 nye ụlọ ọrụ ndị nwere njikọ na ndị agha.
O kwuru na blọk ndị ahụ ga-emeghe maka azụmahịa site na ụlọ ọrụ obodo na nke mba ọzọ.
Ọ kwadoro ịhazigharị NNPC iji mee ka ọ bụrụ ụlọ ọrụ azụmahịa zuru oke, mana ekwenyeghị na ọ ga-ewepụ òkè ya na-nchịkwa na ụlọ ọrụ na-emepụta mmanụ, na n'oge ahụ ọ kwadoghị ime ka agharazi ịchịkwa ahịa mmanụ ala ngwa ngwa.
Lukman gbara arụkwaghịm na Nọvemba 2003. A na-ekwu na ọ bụ n'ihi esemokwu banyere mgbanwe nke ngalaba mmanụ n'etiti ya na onye isi nchịkwa nke NNPC. Jackson Gaius Obaseki.[8]
O doro anya na esemokwu ahụ na-etolite kemgbe Lukman rụchara ọrụ ya dị ka onye isi oche OPEC na mbido afọ 2002, na mgbe Obasanjo wepụrụ nchịkwa na nhazi nke blọk mmanụ site na Ministrị Petroleum Resources gaa na NNPC na Jun 2002.[9]
Ọ ghọziri onye isi oche nke Afren Nigeria mgbe e guzobere ya na Mee 2005.
Ọ bụkwa onye òtù Society of Petroleum Engineers (SPE) ma jee ozi na bọọdụ SPE dị ka onye nduzi mpaghara maka Africa.[10]
N'afọ 2007, Lukman ghọrọ onye òtù bọọdụ nlekọta nke Dietsmann NV nke Netherlands, ụlọ ọrụ nọ n'isi gbasara International Operation & Maintenance na ngalaba ike.[11]
A họpụtara Lukman dị ka onye ndụmọdụ nsọpụrụ (na-akwụghị ụgwọ) n'ihr ndị gbasara ike na isiokwu ndị dị mkpa nye Onye isi ala Umaru Yar'Adua n'ọnwa Ọgọstụ afọ 2007. [12]
N'ọnwa Disemba afọ 2008, a họpụtara Lukman ka ọ bụrụ Mịnịsta na-ahụ maka mmanụ ala, ma gbaa arụkwaghịm n'ọkwa ya na Afren, na-etinye ihe onwunwe ya na ntụkwasị obi.[10]
N'ọnwa Febụwarị afọ 2010, e nwere asịrị na Lukman agbaala arụkwaghịm mgbe onye isi ala ọhụrụ, Goodluck Jonathan, gbanwere ọchịchị, mana anabataghị ya.[13]
N'ọnwa Machị afọ 2010, ọ dọrọ aka ná ntị na ụkọ mmanụ ala na Naịjirịa ga-akawanye njọ ma ọ bụrụhaala na gọọmentị na-egbochi iwepụ iwu ụlọ ọrụ ahụ.[14]
Ọ hapụrụ ọrụ na 17 Machị 2010 mgbe onye isi ala nwa oge bụ Goodluck Jonathan gbasara òtù ndị ọrụ ya. [15]
Nrụrụ aka
[dezie | dezie ebe o si]A na-ebo Lukman ebubo na ọ mere ka nkwekọrịta nrụrụ aka nke P&ID dị mfe, nke fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na o furu Naịjirịa ihe nrite $11bn, site n'inye onye enyemaka ya, Taofiq Tijani, iwu ka ọ "kpachara anya lefeere anya" n'erughi eru nke P&ID ma mee ka nkwekọ ahụ gaa.[16]
EFCC boro Lukman ebubo imebi iwu Naijiria site n'ịkwado nkwekọrịta nke ọ na-enweghị ikike ịkwado ma tinye aka na ya, na-adịghị arụsi ọrụ ike na ụlọ ọrụ ahụ, nke na-enweghị nkwenye iwu chọrọ site na ụlọ ọrụ gọọmentị Naijiria kwesịrịnụ.[16]
Ndị ọzọ e jikọtara na nrụrụ aka gbasara nkwekọrịta aghụghọ a bụ Taofiq Tijani, Grace Taiga na Olasupo Shasore . [17][18]
Nkwanye Ùgwù
[dezie | dezie ebe o si]E mere Lukman Knight Commander nke Order of the British Empire (KBE) n'afọ 1989 na Officer nke Légion d'honneur nke France n'afọ 1990, yana inye ya ọkwa klas mbụ nke Order of of the Liberator sitere na Venezuela. Ọ bụ onye Afrịka mbụ a na-asọpụrụ na Fellowship nke Imperial College, Mahadum London.[3]
Edensibịa
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Faucon. "OPEC Veteran Rilwanu Lukman Dies", The Wall Street Journal, 21 July 2014. Retrieved on 6 October 2024.
- ↑ Dr Rilwanu Lukman Appointed as Nigeria's Minister of Petroleum Resources. Oilvoice (18 December 2008). Archived from the original on 20 December 2008. Retrieved on 15 December 2009.
- 1 2 3 4 5 Speaker Biographies. Foreign Investment Network. Archived from the original on 11 July 2011. Retrieved on 16 April 2010. Kpọpụta njehie: Invalid
<ref>tag; name "finvnet" defined multiple times with different content - ↑ Lukman, Dr. Rilwanu. World Energy Magazine. Archived from the original on 11 March 2012. Retrieved on 17 April 2010.
- ↑ OPEC Bulletin 12/09. OPEC. Retrieved on 17 April 2010.
- ↑ Ufot Bassey Inamete (2001). Foreign policy decision-making in Nigeria. University Press. ISBN 1-57591-048-9.
- ↑ Falobi. "Lukman – an Ageless Crusade", Daily Independent, 29 March 2010. Retrieved on 6 October 2024.
- ↑ Ford (1 December 2003). Musical chairs follow Lukman resignation. African Business Article. Archived from the original on 18 February 2010. Retrieved on 16 April 2010.
- ↑ Rilwanu Lukman resigns as presidential adviser to Nigeria. Alexander's Gas & Oil Connection (8 October 2003). Archived from the original on 27 June 2013. Retrieved on 16 April 2010.
- 1 2 Dr Rilwanu Lukman Appointed as Nigeria's Minister of Petroleum Resources. Oilvoice (18 December 2008). Archived from the original on 20 December 2008. Retrieved on 16 April 2010. Kpọpụta njehie: Invalid
<ref>tag; name "oilv26al" defined multiple times with different content - ↑ Dietsman NV Annual Report 2006. Dietsmann NV. Archived from the original on 10 July 2011. Retrieved on 17 April 2010.
- ↑ Afren Announces Dr Rilwanu Lukman Appointed Honourary [sic] Advisor on Energy and Strategic Matters to the President of Nigeria. Oilvoice (3 August 2007). Archived from the original on 19 January 2008. Retrieved on 17 April 2010.
- ↑ Ezeobi. "Uncertainty over Lukman's role in government", The Punch, 16 February 2010. Retrieved on 17 April 2010.
- ↑ "Fuel Scarcity: Prepare for harder times, Lukman warns Nigerians", The Punch, 10 March 2010. Retrieved on 17 April 2010.
- ↑ Idonor. "Jonathan Sacks Ministers", Vanguard, 17 March 2010. Retrieved on 14 April 2010.
- 1 2 Akinpelu. "P&ID: Rilwanu Lukman's family demands apology over bribe allegation", Premium Times, 1 September 2020. Retrieved on 6 October 2024. Kpọpụta njehie: Invalid
<ref>tag; name "PT" defined multiple times with different content - ↑ Ogunyemi. "Ex-minister, Lukman, signed controversial agreement with P&ID, witness tells court", 3 March 2020. Retrieved on 6 October 2024.
- ↑ Sanni. "P&ID Saga: EFCC quizzes ex-Lagos attorney-general Supo Shasore", Premium Times, 19 January 2022. Retrieved on 6 October 2024.