Gaa na ọdịnaya

Rongying Jin

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Rongying Jin bụ nwa China-America, ọkachamara n’ihe gbasara physics na ihe onwunwe, ma bụrụkwa SmartState Endowed Chair n’ihe metụtara nyocha ọmụmụ nanoscale Ọ bụ Prọfesọ Physics na onye jidere John M. Palms Bicentennial Chair na ngalaba Physics na Astronomy, Mahadum South Carolina. Nnyocha ya na-akọwara physics nke ihe ndị dị nro, gụnyere superconductors na ihe ndị ọzọ.[1]  

Agụmakwụkwọ na ọrụ

[dezie | dezie ebe o si]

N’ime afọ 1988 ruo 1991, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye enyemaka nchọpụta na Institute of Physics nke Chinese Academy of Sciences, mgbe e mesịrị, ọ gara na Mahadum Sussex na Mahadum Cambridge na UK, Jin gụsịrị Ph.D. na ETH Zurich na 1997. [2]

Site n’afọ 1997 ruo 2000, ọ rụrụ ọrụ dịka onye nchọpụta postdoctoral na Mahadum Pennsylvania State, mgbe e mesịrị bụrụkwa onye nchọpụta sayensị na Oak Ridge National Laboratory site na 2000 ruo 2009. Ọ sonyeere Mahadum Steeti Louisiana dị ka osote prọfesọ nke physics na 2009, e buliri ya elu ka ọ bụrụ prọfesor zuru oke na 2012, [1] tupu ọ kwaga n'ọkwa ya ugbu a na Mahadum South Carolina .[2]

N’afọ 2010, e kpọrọ Jin ka ọ bụrụ Fellow nke American Physical Society (APS), maka onyinye pụrụ iche ya n’ụzọ physics ihe onwunwe si dị, gụnyere imepụta ihe ọhụrụ na ọmụmụ physics mbụ gbasara ha. [3] A kpọrọ ya aha dị ka Fellow nke American Association for the Advancement of Science na 2012, "maka onyinye ya dị ịrịba ama na physics ihe, gụnyere mmepe ihe ndị sayensị na-akpali na ọmụmụ ihe ndị mbụ nke physics ha".[4]

Ihe odide

[dezie | dezie ebe o si]

.mw-parser-output .reflist{margin-bottom:0.5em;list-style-type:decimal}@media screen{.mw-parser-output .reflist{font-size:90%}}.mw-parser-output .reflist .references{font-size:100%;margin-bottom:0;list-style-type:inherit}.mw-parser-output .reflist-columns-2{column-width:30em}.mw-parser-output .reflist-columns-3{column-width:25em}.mw-parser-output .reflist-columns{margin-top:0.3em}.mw-parser-output .reflist-columns ol{margin-top:0}.mw-parser-output .reflist-columns li{page-break-inside:avoid;break-inside:avoid-column}.mw-parser-output .reflist-upper-alpha{list-style-type:upper-alpha}.mw-parser-output .reflist-upper-roman{list-style-type:upper-roman}.mw-parser-output .reflist-lower-alpha{list-style-type:lower-alpha}.mw-parser-output .reflist-lower-greek{list-style-type:lower-greek}.mw-parser-output .reflist-lower-roman{list-style-type:lower-roman}

Njikọ mpụga

[dezie | dezie ebe o si]
  1. 1 2 Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; no text was provided for refs named sc
  2. 1 2 Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; no text was provided for refs named lsu
  3. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; no text was provided for refs named faps
  4. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; no text was provided for refs named honors