Rose G. Jacobs

Rose Gell Jacobs (1888-1975) o so otu onye so were guzobere na onye isi oche nke Hadassah Women's Zionist Organization of America.
Akụkọ ndụ
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ Rose Gell Jacobs na Septemba 10, n'afọ 1888, na New York City . [1] Ọ gara Mahadum Columbia ma rụọ ọrụ dị ka onye nkuzi na ụlọ akwụkwọ ọha na eze ruo n'afọ 1914. Dị ka onye guzobere Hadassah, o guzobere isi ma dezie Hadassah News Bulletin. N'afọ 1920, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye isi oche nke Hadassah mgbe Henrietta Szold nọ na Palestine.[2] Ọ rụrụ ọrụ ugboro abụọ dị ka onye isi ala nke Hadassah, site na 1930 ruo 1932 na site na 1934 ruo 1937. N'oge nke abụọ ya, o mere mgbalị Hadassah ịnakọta ego na Youth Aliyah.[3] Mgbe ọ gachara dịka onye isi ala, ọ sonyere na Kọmitii Mberede Hadassah na iwu Ụlọ Ọgwụ Mahadum Rothschild-Hadassah na ụlọ akwụkwọ ahụike na Ugwu Scopus . [4]
Itụkwasị na nke a, Jacobs oso nyere na Kọmitii maka Ọmụmụ Mmekọrịta Arab-Jewish, ESCO Foundation, Jewish Telegraphic Agency, na Jewish Agency for Palestine.[5]
Jacobs na di ya Edward nwere ụmụ abụọ.
Edemsibia
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Rose Gell Jacobs | Jewish Women's Archive (en). jwa.org. Archived from the original on 2015-09-19. Retrieved on 2017-03-31.
- ↑ Rose Gell Jacobs | Jewish Women's Archive (en). jwa.org. Retrieved on 2017-03-31.
- ↑ Rose G. Jacobs Dead at 87. Jewish Telegraphic Agency (1975-08-18). Retrieved on 2017-03-31.
- ↑ "ROSE CELL JACOBS, HADASSAH LEADER", The New York Times, 1975-08-16. Retrieved on 2017-03-31.
- ↑ Jacobs, Rose Gell (en). www.jewishvirtuallibrary.org. Retrieved on 2017-03-31.
Njikọ mpụga
[dezie | dezie ebe o si]- Ntuziaka maka Executive Functions Records na Hadassah Archives (RG 13) na American Jewish Historical Society na Center for Jewish History.