Gaa na ọdịnaya

Rose Osuji

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Rose Uzoma Osuji (amụrụ n'afọ 1947) bụ onye Naijiria na-ahụ maka physics. Ọ bụ prọfesọ nke physics na Mahadum nke Naijiria, ebe o guzobere otu nyocha nanotechnology. Ihe mmasị nyocha ya bu solar energy na materials science.[1]

Osuji jere ozi na mahadum di ka onye isi nke ngalaba physics na astronomy site na 2006 ruo 2008 na ọzọ site na 2012 ruo 2015.[2]

N'afọ 2018, Osuji kwupụtara na Mahadum nke Naịjirịa na ụlọ ọrụ na-ahụ maka mmanụ Oilserv ga-ejikọ aka iguzobe African Center for Nanosciences and Nanotechnology Research and Application.[3]

N'afọ 2022, a nabatara Osuji di ka onye otu nke African Academy of Sciences.[1][4]

Edemsibia

[dezie | dezie ebe o si]
  1. 1 2 Prof Rose Osuji. The African Academy of Sciences. Retrieved on 2015-10-19."Prof Rose Osuji". The African Academy of Sciences. Retrieved 2015-10-19.
  2. About Prof. Osuji. Go Rose Way. Retrieved on 2015-10-19.
  3. Mbadiwe Okwo (July 17, 2018). Scientists gather at UNN for nanotechnology. Vanguard. Retrieved on 2015-10-19.
  4. Assumpta Chinwe Nwanya (December 9, 2024). Celebrating the Legacy of Prof. Rose Uzoma Osuji: A Trailblazer in Science, Leadership, and Education. The Authority. Retrieved on 2015-10-19.