Gaa na ọdịnaya

Samuel Asabia

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Samuel Oyewole Asabia (1931-1993) bụ ọkachamara n'ihe gbasara akụnụba na mba Naịjirịa, onye nchịkwa na onye na-ahụ maka ụlọ akụ, onye bụkwa odeakwụkwọ na-adịgide adịgide, Ngalaba Ego nke Western Region site n'afọ 1966 ruo n'afọ 1970. O mechara bụrụ onye isi ala mbụ na onye isi njikwa nke First Bank of Nigeria n'afọ 1975.. [1] [2][3]

Asabia bụ onye isi nke òtù na kọmitii ole na ole mere ka ọ bụrụ onye a ma ama. N'agbata afọ 1970 na afọ 1975, ọ bụ osote gọvanọ nke Central Bank of Nigeria nakwa onye isi oche nke Securities Issues Commission nke mechara bụrụ Securities Exchange Commission. N'agbata afọ 1975 na afọ 1981, ọ bụ onye isi oche nke Nigerian Stock Exchange n'afọ 1983, ọ bụ osote onye isi oche of the Nigerian Economic Society . [4]

Asabia bụ onye isi nchịkwa nke ụlọ akụ First Interstate Merchant (nke bụzi akụkụ nke Unity Bank of Nigeria) ọ bụkwa onye isi oche nke Banque Internationale du Benin n'afọ 1989.

A mụrụ Asabia na Idoani, nna ya bụ dikọn n'ụlọ ụka ya ma nwee ọkwa onyeisi Olisa nke Idoani. Asabia gụrụ akwụkwọ na Christ School, Ado Ekiti ma nweta akara ugo mmụta na Mahadum Exeter, mechaa nweta akara ugo mmụta na akụnụba. Mgbe ọ lọtara Naịjirịa, ọ rụrụ ọrụ na ngalaba nchịkwa ndị ọchịchị site n'afọ 1954 wee malite ịghọ osote onye ọrụ mpaghara n'afọ 1958. N'agbata afọ 1958 na 1961, ọ rụrụ ọrụ na Western Regional Ministry of Finance ma mesịa rụọ ọrụ n'ọfịs praịm. A họpụtara ya ka ọ bụrụ odeakwụkwọ na-adịgide adịgide nke ngalaba na-ahụ maka ala, ụlọ na ihe ndị dị n'ime ụlọ n'afọ 1962. Mgbe nke ahụ gasịrị, Asabia gara n'ihu na-arị elu site na ọkwa dị n'ime ọrụ nchịkwa. Ọ wegara ọrụ ya na Ministri ego nke mpaghara n'afọ 1966 dị ka odeakwụkwọ na-adịgide adịgide.[5]

N'afọ 1970, a họpụtara ya ka ọ bụrụ osote gọvanọ nke Central Bank of Nigeria . Asabia mechara were ọkwa onyeisi oche na First Bank mgbe gọọmentị nwetara ọtụtụ uru site na Standard Chartered Bank. Ọrụ nchịkwa n'oge ọchịchị ya gụnyere ịkpọbata na ịzụ ndị gụsịrị akwụkwọ na kọleji iji dochie ndị ọrụ si mba ọzọ na iwu isi ụlọ ọrụ ọhụrụ na Marina, Lagos. Otu n'ime ihe kpatara gọọmentị ji were mmasị Standard Bank bụ ịgbasa ụlọ akụ na kredit nye ọtụtụ ndị Naịjirịa, a gwakwara First Bank ka ọ gbasaa alaka ụlọ ọrụ n'ime ime obodo.[5]

Edemsibịa

[dezie | dezie ebe o si]
  1. Bayo Onanuga (2000). People in the News, 1900-1999: A Survey of Nigerians of the 20th Century. Independent Communications Network Limited (Indiana University). ISBN 9789783228405. 
  2. Admin (2016-11-15). ASABIA, Chief Samuel Oyewole(Late) (en-US). Biographical Legacy and Research Foundation. Retrieved on 2018-11-26.
  3. Reed Information Services Ltd (1995). The Bankers' Almanac, Volume 2. the University of Michigan. 
  4. "Chief Samuel Asabia;Obituary", The Times; London (UK), June 18, 1993.
  5. 5.0 5.1 Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; no text was provided for refs named ne