Serge (post)
Serge (Buryat: сэргэ; lit. 'tethering post') bụ ókè na-ejikọta, ihe nkanye akara ihe onwunwe, na ogwe ànwànsì eji eme ihe n'etiti ndị Buryats na ndị Yakut.[1]
Ihe nkanye akàrà Ihe onwunwe
[dezie | dezie ebe o si]A na-etinye serge iji gosi na ebe ahụ a na-ekwu ókwú ya nwere onye nwe ya. Dịka ọmụmaatụ, serge na-eguzo dị ka ogwe osisi n'ọnụ ụzọ mbata Yurt ma ọ bụ n'ọnụ ụzọ ámá ụlọ iji gosi na ọ bụrụhaala na serge nọ ebe ahụ, ezinụlọ ahụ ga-ebi ebe ahụ. Dị ka omenala si dị, a pụghị ibibi serge, mana ọ bụ naanị na ọ ga-ereka.
Ojiji okpukperechi
[dezie | dezie ebe o si]A na-ejikọta serge na ụlọ ịnyịnya, ebe ọ bụ na ndị a bịara na nke ha na ndị ọbịa kegidere ịnyịnya ha na ya. Ọ bụkwa ihe nnọchianya nke osisi ụwa nke na-ejikọ ụwa atọ ahụ: a na-egbupe oghere atọ dị larịị n'osisi ahụ, nke dị n'elu bụ iji kee ịnyịnya nke ndị bi n'eluigwe nke ụwa dị n'ebe dị elu, nke dị etiti bụ maka ịnyịnya nke mmadụ, na nke dị n"okpuru bụ maka ndị bi n'okpuru ụwa.
A na-eji Osisi birch (nke e si na mgbọrọgwụ gwupụta) mee ihe na mmalite nke shaman. Otu nwere eriri ekegidere na ya, ụcha nke eriri ahụ na-egosi ma shaman ahụ ọ ga-abụ nke ojii ma ọ bụ nke na-acha òdò òdò, ma ọ bụ na-eje ozi dịka ihe ọma ma ihe ọjọọ. Ọzọ nwere mgbịrịgba ejikọtara ya, na ịnyịnya, dị ka àjà. Nke atọ ya bụ onye shaman ọhụrụ ga-arịgo na ya.[2] Maka ndị shaman ojii, a na-akpọ emume a shanar; maka ndị shaman na-acha odo odo, shandroo (ma ọ bụ altan serge, "golden hitch"). [3]
N'ogige olili ndị shaman ahụ, e dowere serge gà ndị dị elu ọfụma màkà ijikọta chi na mmụọ hà. E dowekwara serge ndị dị n'ụdị obelisks okwute n'ogige olili ndị a (deer stones). Nke a kacha mara ọfụma n'okwute ndị a bụ Altan Serge ("golden pole") nke dị na Tamchinsky datsan, n'ime obodo Buryat bụ Gusinoye Ozero.
Ihe ngosi foto
[dezie | dezie ebe o si]
Hụkwa
[dezie | dezie ebe o si]
Edensibịa
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Гончаров. Памятник Якутии. www.unmonument.ru.
- ↑ Mikhailovskii (1895). "Shamanism in Siberia and European Russia, Being the Second Part of 'Shamanstvo'". The Journal of the Anthropological Institute of Great Britain and Ireland 24: 62–100. DOI:10.2307/2842483.
- ↑ Relic (2020). The Esoteric Symbolism of Shamanic Trance and Altered States Phenomena. Cambridge Scholars Publishing. ISBN 9781527553910.