Siphiwe Hlophe
Siphiwe Hlophe bụ onye guzobere Swaziland for Positive Living, otu NGO nke na-enye ndụmọdụ na agụmakwụkwọ, ma na-achọ imeziwanye ọnọdụ ndụ nke ndị na-emetụta ma ọ bụ na-ebute Nje ọrịa obiri na aja ọcha n'ime ime obodo.[1] A kọwawo nzukọ ahụ dị ka "usoro ihe omume kachasị ọhụrụ na nke na-akpali akpali iji belata nje oria obiri na aja ọcha na mba Swaziland".[2] Ọ bụkwa onye isi oche nke Positive Women, ọrụ ebere dị na mba UK nke Kathryn Llewellyn na Stephen Brown guzobere[3]
N'afọ pụkụ na narị itoolu na ịrị itọọlu na itọọlu, Siphiwe Hlophe na-arụ ọrụ dị ka onye njikwa na ụlọ nkwari akụ mgbe ọ nwetara agụmakwụkwọ iji mụọ akụ na ụba ugbo na Mahadum Bradford. Otu ọnọdụ nke agụmakwụkwọ ahụ bụ na ọ gara Nnyocha ọrịa obiri na aja ọcha, [4] nke mere ka o nwee ọrịa obiri na aja ọcha, mgbe nke ahụ gasịrị di ya hapụrụ ya, [5] ma ọ tụfuru agụmakwụkwọ ya. Nke a gosipụtara ihere nke metụtara ọrịa obiri na aja ọcha na mba Swaziland, ma kpalie Siphiwe Hlophe ka ọ soro chọta SWAPOL iji nyere ndị ọzọ nọ n'ọnọdụ yiri ya aka. [6][7] Siphiwe bụ otu n'ime ụmụ nwanyị mbụ kwupụtara n'ihu ọha ọnọdụ ọrịa obiri na aja ọcha ya.[8] "Ọ [SWAPOL] sitere na nhụjuanya anyị bụ ndị guzobere ya. Nke ahụ nwere ike ịbụ ihe mere ndị mmadụ ji zaghachi ihe anyị na-eme, anyị na-enwetakwa ọtụtụ arịrịọ iji nyere obodo aka ebe nje ọrịa obiri na aja ọcha jupụtara. Anyị abụghị otu NGO nke na-arụ ọrụ n'ọfịs mara mma. Anyị bụ ndị maara ihe ọ pụtara ịlụso ịkpa ókè na ịjụ ihu, mana ndị nwere ọchịchọ ibi ndụ", ka Siphiwe Hlophe kwuru.[9]
Siphiwe Hlophe nwere ụmụ anọ, nke okenye dị afọ ịrị atọ na nke nta ịrị na itọọlu.
Ihe edeturu na ntụaka
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Izumi (2006). Reclaiming Our Lives: HIV and AIDS, Women's Land and Property Rights, and Livelihoods in Southern and East Africa : Narratives and Responses. HSRC Press. ISBN 9780796921369.
- ↑ IRIN In-Depth | SWAZILAND: All about hope | Swaziland | HIV/AIDS (PlusNews). Archived from the original on 2011-06-11.
- ↑ Expat Living in Singapore (en-US). Positive Women. Retrieved on 2019-11-05.
- ↑ Guardian Staff. "HIV-positive in Swaziland", The Guardian, 2007-11-30. Retrieved on 2019-11-05. (in en-GB)
- ↑ IRIN In-Depth | SWAZILAND: All about hope | Swaziland | HIV/AIDS (PlusNews). Archived from the original on 2011-06-11.
- ↑ Guardian Staff. "HIV-positive in Swaziland", The Guardian, 2007-11-30. Retrieved on 2019-11-05. (in en-GB)
- ↑ New Statesman - Swaziland's conquering heroines. www.newstatesman.com. Archived from the original on 2008-05-02.
- ↑ Siphiwe Hlope, "Today women are so courageous" (en). The New Humanitarian (2008-07-14). Retrieved on 2019-11-05.
- ↑ IRIN In-Depth | SWAZILAND: All about hope | Swaziland | HIV/AIDS (PlusNews). Archived from the original on 2011-06-11.